Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Ala Dị Mma nke Sakwara Mbara”

“Ala Dị Mma nke Sakwara Mbara”

N’OSISI ahụ na-agba ọkụ, Chineke gwara Mozis na ya na-aga “ịnapụta [ndị Ya] n’aka ndị Ijipt, na ime ka ha . . . rigoruo ala dị mma nke sakwara mbara, ruo ala nke mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya.”—Ọp 3:8.

Ihe osise abụọ ndị a e ji kọmputa hazie pụrụ inyere gị aka ịghọta otú ógbè dịgasị iche iche nke Ala Nkwa ahụ dị. (E mere ka ebe ndị gbagoro agbago dị elu karịa otú ha hà n’ezie iji mee ka ebe ndị ka ibe ha elu pụta ìhè.) Lee graf nke tụrụ àgwà iji hụ ọ̀tụ̀tụ̀ ịdị elu nke ebe ndị ahụ ma e jiri ya tụnyere ịdị elu nke elu oké osimiri.

Chaatị e gosiri ebe a na-egosi otu ụzọ a pụrụ isi hazie n’usoro ógbè dịgasị iche iche ndị dị n’ala ahụ n’onwe ya. Ị pụrụ ịhụ nkọwa nwere ntụaka dị iche iche sitere na Bible banyere ógbè ndị ahụ na All Scripture Is Inspired of God and Beneficial” (Ihe Ọmụmụ nke 1, peeji nke 270-278) na Insight on the Scriptures (Mpịakọta nke 2, peeji nke 568-571). a

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ha.

[Chaatị/Map di na peeji 12, 13]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

Otú Ala ahụ Dị

Chaatị nke Na-egosi Ebe Ndị Dị n’Ala Ahụ

A. Ụsọ Osimiri Ukwu

B. Ala Dị Larịị nke Dị n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Jọdan

1. Ala Dị Larịị nke Asha

2. Ala Ụsọ Osimiri Dọọ nke Dị Warara

3. Ala Ahịhịa Ndụ nke Sharọn

4. Ala Dị Larịị nke Filistia

5. Ndagwurugwu Dị n’Etiti nke Si Ebe Ọwụwa Anyanwụ Gaa Ọdịda Anyanwụ

a. Ala Dị Larịị nke Megido

b. Ndagwurugwu Jezril

CH. Ugwu Ndị Dị n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Jọdan

1. Ugwu Nta Ndị Dị na Galili

2. Ugwu Nta Ndị Dị na Kamel

3. Ugwu Nta Ndị Dị na Sameria

4. Shefila (ugwu ndị dị ala)

5. Ala Ugwu nke Dị na Juda

6. Ọzara Juda

7. Negeb

8. Ọzara Peran

D. Araba (Ndagwurugwu Ebe Ala Tiwara Etiwa)

1. Ọdọ Mmiri Hula

2. Ebe Dị Gburugburu Oké Osimiri Galili

3. Ndagwurugwu Jọdan

4. Oké Osimiri Nnu (Osimiri Na-enwekebeghị Ihe Ndị Dị Ndụ)

5. Araba (n’ebe Ndịda Oké Osimiri Nnu)

E. Ugwu/Mbara Ala Ndị Dị n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Jọdan

1. Beshan

2. Gilied

3. Amọn na Moab

4. Ala Ugwu Dị Larịị nke Idọm

F. Ugwu Ndị Dị na Lebanọn

[Map]

Ugwu Hemọn

Dan

Jeruselem

Biashiba

Ala Nkwa ahụ Site n’Otu Akụkụ Ruo na nke Ọzọ

mita amaụkwụ

2,500 7,500

2,000 6,000

1,500 4,500

1,000 3,000

500 1,500

0 0 (Ọ̀tụ̀tụ̀ Ịdị Elu Ala Tiwara Etiwa nke Oké Osimiri)

-500 -1,500

Ọzara nke Filistia

Shefila

Ala Ugwu nke Juda

Ala Dị Larịị Juda

Ndagwurugwu Ebe

Oké Osimiri Nnu

Ala Moab

[Foto dị na peeji nke 13]

Ugwu Hemọn (mita 2,814; amaụkwụ 9,232)

[Foto dị na peeji nke 13]

Ụsọ Oké Osimiri Nnu; ebe kasị dị ala n’ụwa (ihe dị ka mita 400, o ji amaụkwụ 1,300 dị ala karịa elu oké osimiri)