Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ala Ndị A Kpọrọ Aha na Bible

Ala Ndị A Kpọrọ Aha na Bible

KA IZREL na-akwado ịbanye Ala Nkwa ahụ, Mozis gwara Chineke ihe bụ́ nnọọ ọchịchọ obi ya, sị: “Biko, ka m gabiga, hụ ezi ala ahụ nke dị n’ófè Jọdan, ezi ugwu ahụ.”—De 3:25.

E kweghị ka Mozis mee otú ahụ, ma ọ rịgoro n’elu ugwu chere Jeriko ihu ma hụ ala ahụ—‘Gilied, ruo Dan na ala Juda ruokwa oké osimiri nke dị n’azụ; na Negeb na ndagwurugwu Jọdan.’ (De 3:27; 34:1-4) Ị̀ nụtụwo aha ndị ahụ? Ị̀ maara ebe ha dịgasị?

Ọ bụ mmadụ ole na ole n’etiti ndị Jehova taa pụrụ ịga leta ọtụtụ ebe ndị ahụ ha na-agụ banyere ha na Bible. Ha enweghị ike ime ihe Chineke kwuru na ya ga-agwa Ebreham ka o mee, bụ́ ịgazu Ala Nkwa ahụ. (Je 13:14-17) N’agbanyeghị nke ahụ, ezi Ndị Kraịst na-achọsi ike ịmara banyere ebe ndị a kpọgasịrị aha na Bible ma hụ otú ha na ibe ha si nwee njikọ.

Ị pụrụ iji akwụkwọ a bụ́ ‘Ka Anyị Hụ Ezi Ala Ahụ’ mee ka nghọta gị banyere Akwụkwọ Nsọ hiwanye nne. O nwere foto nke ebe ndị dị adị n’ezie, dị ka Gilied, nke e sere n’ihu broshuọ a. Nke na-enye ihe ọmụma ọbụna karị bụ map ndị dị na ya, bụ́ ndị pụrụ ime ka ị matakwuo banyere ebe ndị a kpọrọ aha na Bible.

Map dị na peeji nke 2 na nke 3 na-egosi ala ma ọ bụ ógbè ndị bụ́ isi. Dị ka ihe atụ, mgbe ị rịbara ama ebe Asiria na Ijipt dị site n’Ala Nkwa ahụ, ị pụrụ ịghọtakwu amụma ndị a kpọrọ ala ndị ahụ aha na ha. (Aị 7:18; 27:13; Ho 11:11; Maị 7:12) Ọwara ala ahụ a kpọrọ Ala Nkwa bụ ebe ọtụtụ ụzọ ndị e ji mee ihe n’oge ochie zuterịtara, mba ndị ọzọ gbakwara mbọ ịzọrọ ubi ọka, ubi vaịn, na ubi oliv ya ndị na-eme nke ọma.—De 8:8; Ikp 15:5.

Mgbe ụfọdụ ị ga-achọ iji map ụfọdụ tụnyere ibe ha. Dị ka ihe atụ, e ziri Jona ịga isi obodo Asiria, ma ọ banyere ụgbọ mmiri gawa Tashish. (Jo 1:1-3) Ị̀ na-ahụ ebe ndị ahụ na map nke mbụ ahụ? Ma aghọtala Tashish dị ka Tasọs, bụ́ ebe a mụrụ Pọl onyeozi. Ị ga-ahụ Tasọs na obodo ndị ọzọ a ma ama na map nke e sere n’ebe a.

Chee banyere ịdị ogologo nke njem Ebreham na ụzọ o si gaa, ka ị na-achọta Ọọ, Heran, na Jeruselem. Mgbe Jehova kpọpụtasịrị ya na Ọọ, o biri na Heran ma mesịa kwaga n’Ala Nkwa ahụ. (Je 11:28–12:1; Ọrụ 7:2-5) Ka ị na-amụ isiokwu bụ́ “Ụwa nke Ndị Nna Ochie Ahụ,” na peeji nke 6-7, ọ ga-adị gị nnọọ ka i ji anya gị abụọ na-ahụ mgbe Ebreham na-eme njem ya.

Map nke mbụ na nke dị n’ebe a adịghị akpọtụ uche n’oge ọ bụla kpọmkwem. A gafesịa ha abụọ, a haziri nnọọ map ndị ọzọ ikwekọ n’usoro ihe ndị ha na-akọwa si mee. Obodo ma ọ bụ ihe ọmụma ndị dị na map nke ọ bụla kwekọrọ n’ihe ndị mere kpọmkwem n’otu oge a kapịrị ọnụ. Ọ bụ ezie na Ndepụta Ntụaka (peeji nke 34-35) ebughị ebe nile a kpọtụrụ aha na map ndị ahụ, ọ ka pụkwara inyere gị aka ịchọta map ndị metụtara isi ihe ị na-eme nnyocha banyere ya.

Map ahụ dị na peeji abụọ nke etiti broshuọ a (peeji nke 18-19) nwere ọnụ ọgụgụ kasị ukwuu nke obodo dị iche iche dị n’Ala Nkwa ahụ. Nkọwa nke Akara Ndị Dị na Map ga-enyere gị aka ịchọta obodo dị iche iche nke ndị Livaị na obodo mgbaba isii ahụ, nakwa ịmara ma à kpọtụrụ otu ebe aha n’Akwụkwọ Nsọ Hibru, n’Akwụkwọ Nsọ Grik, ma ọ bụ na ha abụọ.

Ọ dịghị onye maara ebe ụfọdụ ebe ndị a kpọrọ aha na Bible dị n’oge a, ya mere, ọtụtụ n’ime aha ndị ahụ adịghị na map ahụ dị n’etiti broshuọ a. Ọzọkwa, o kweghị mee itinye obodo nile, dị ka ndị ahụ nile e dekọrọ dị ka ndị dị n’ókè nke ebo dị iche iche, na ya. (Jos, isi 15-19) N’agbanyeghị nke a, map ahụ na-egosikebe obodo ndị dị ibe ha nso, si otú a na-eme ka o kwe gị mee ịgbakọ ebe ha pụrụ ịdị. E nwere akara ndị na-egosi otú ala ebe ahụ dị (ugwu, osimiri, na ndagwurugwu ndị iyi dị na ha), e jikwa àgwà dị iche iche gosi ebe ndị ka ibe ha elu na otú elu ala ebe ụfọdụ dị. Ihe ndị dị otú ahụ a kọwara n’ụzọ zuru ezu pụrụ inyere gị aka iji anya nke uche gị hụ akụkụ dị iche iche nke ihe ndị mere eme e dere na Bible.

E nwere ihe ọmụma ka ukwuu banyere ebe ndị a kpọrọ aha na Bible n’akwụkwọ nkà ihe ọmụma bụ́ Insight on the Scriptures, nke e nwere n’ọtụtụ asụsụ. a Ka ị na-eji ya na akwụkwọ ndị ọzọ na-enye aka ịmụ Bible na-eme ihe, debe ‘Ka Anyị Hụ Ezi Ala Ahụ’ nso. Na-atụle ya mgbe ị na-amụ Akwụkwọ Nsọ dum, bụ́ nke bara uru dị ukwuu ná ndụ gị.—2Ti 3:16, 17.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya.

[Map dị na peeji 4, 5]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

Ala Ndị E Nwere n’Oge ochie na Obodo Ndị A Ma Ama

A1 ỊTALI

A2 ROM

A3 SISILI

A3 MỌLTA

C2 MASEDONIA

C2 Filipaị

C3 GRIS

C3 ATENS

C3 Kọrịnt

C3 KRIT

C4 LIBIA

D3 Antịọk (nke Pisidia)

D3 Efesọs

D3 PATMỌS

D3 RODS

D4 MEMFIS

D5 IJIPT

E2 ESHIA MAỊNỌ

E3 Tasọs

E3 Antịọk (nke Siria)

E3 SAỊPRỌS

E4 Saịdọn

E4 Damaskọs

E4 Taịa

E4 Sesaria

E4 ALA NKWA

E4 JERUSELEM

E4 MOAB

E4 Kedesh

E4 IDỌM

F3 Ogige Iden?

F3 ASIRIA

F3 Heran

F3 SIRIA

F5 AREBIA

G3 NINIVE

G4 BABILỌN

G4 KALDIA

G4 Shushan

G4 Ọọ

H3 MIDIA

[Ugwu]

E5 Ugwu Saịnaị

G2 UGWU NDỊ DỊ N’ARARAT

[Mmiri]

C3 Oké Osimiri Mediterenian (Osimiri Ukwu)

E1 Oké Osimiri Ojii

E5 Oké Osimiri Uhie

H2 Oké Osimiri Kaspian

H5 Ọwara Oké Osimiri Peshia

[Osimiri]

D5 Osimiri Naịl

F3 Osimiri Yufretis

G3 Osimiri Taịgris