Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Alaeze Ukwu Dị Iche Iche Awakpoo Ala Nkwa Ahụ

Alaeze Ukwu Dị Iche Iche Awakpoo Ala Nkwa Ahụ

N’AFỌ 740 T.O.A., ndị Asiria meriri Sameria, bụ́ isi obodo alaeze ebe ugwu nke Izrel. Ndị Izrel si otú a daba n’aka alaeze ukwu nke nwere obi ọjọọ. Asiria dị n’ebe ugwu nke ala ndị dị larịị dị na Mesopotemia, na nso Taịgris, bụ́ otu n’ime osimiri ukwu ndị dị n’Ógbè Na-eme Nri. Ọ bụ Nimrọd guzobere obodo ndị bụ́ isi nke Asiria, bụ́ Ninive na Kala. (Je 10:8-12) N’oge Shalmanesa nke Atọ, Asiria gbasawanyere gaa n’ebe ọdịda anyanwụ, banye n’ógbè Siria nakwa n’ebe ugwu Izrel, bụ́ ebe ndị nwere mmiri n’ụba ma na-emepụta nri.

N’okpuru Eze Tiglat-Pilesa nke Atọ (Pul), bụ́ onye a kpọrọ aha na Bible, Asiria malitere ịkpagbu Izrel. Obubu agha ya metụtakwara Juda nke dị n’ebe ndịda. (2Ez 15:19; 16:5-18) Ka oge na-aga, Asiria nke yiri “mmiri” na-ekwo ekwo kwobatara n’ime Juda, ma mesịa rute isi obodo ya, bụ́ Jeruselem.—Ai 8:5-8.

Eze Senakerib nke Asiria wakporo Juda na 732 T.O.A. (2Ez 18:13, 14) O bibiri ma kwakọrọ ihe n’obodo 46 nke Juda, gụnyere Lekish, nke dị n’ebe dị oké mkpa na Shefila. Dị ka map na-egosi, nke a pụtara na ndị agha ya anọrọla Jeruselem ọnọdụ ọjọọ, si otú ahụ na-agba isi obodo Juda okirikiri. N’ihe ndekọ ya, Senakerib turu ọnụ na ya kechiri Hezekaịa “dị ka nnụnụ e tinyere na nkata,” ma ihe ndekọ ndị Asiria zeere ikwu banyere mbibi nke mmụọ ozi Chineke bibiri ndị agha Senakerib.—2Ez 18:17-36; 19:35-37.

A gụwo ụbọchị nke Alaeze Ukwu Asiria ọnụ. Ndị Midia, bụ́ ndị biri n’ala na-adịchaghị larịị nke ebe bụ Iran n’oge a, malitere ịlụso ihe fọdụrụ ná ndị agha Asiria ọgụ. Nke a dọọrọ uche ndị Asiria pụọ n’ebe ógbè ha ndị dị n’ebe ọdịda anyanwụ dị, bụ́ ndị malitekwuru inupụ isi. Ka ọ dị ugbu a, ndị Babilọn nọ na-esiwanye ike, ọbụna na ha meriri obodo bụ́ Ashọ. Na 632 T.O.A., ndị Babilọn, Midia, na Sitia, bụ́ ndị e ji agha mara si n’ebe ugwu nke Oké Osimiri Ojii, jikọrọ aka bibie Ninive—bụ́ “obodo ọbara.” Nke a mezuru amụma Nehọm na Zefanaịa.—Ne 3:1; Zef 2:13.

Asiria bịara n’ọgwụgwụ ya na Heran. Mgbe usuu ndị agha Babilọn obi siri ike wakwasịrị ha, ndị Asiria gbalịrị iguzogide ha ruo mgbe enyemaka si Ijipt ga-erute. Ma ka Fero Niko na-agbagote ebe ugwu, Eze Josaịa nke Juda nọchiere ya ụzọ na Megido. (2Ez 23:29, NW) Mgbe Niko mesịrị rute Heran, ihe emebichaalarị—Alaeze Ukwu Asiria adaala.

Alaeze Ukwu nke Babilọn

Olee obodo na-agbata n’uche ma e kwuo “ubi ndị koro n’elu”? Ọ bụ Babilọn, bụ́ isi obodo nke ike ọchịchị ụwa nwe aha ahụ, nke e bukwara amụma banyere ya dị ka ọdụm nwere nku. (Da 7:4) A maara obodo ahụ nke ọma maka akụ̀ na ụba ya, azụmahịa, na nkwalite ọ na-akwalite okpukpe na ịgụ kpakpando. Isi obodo nke alaeze ukwu ahụ dị n’ala dị larịị nke na-adọ mmiri n’ebe ndịda Mesopotemia, n’etiti osimiri Taịgris na Yufretis. Yufretis si n’etiti obodo ahụ gafere, mgbidi ya mekwara ka o yie ebe a na-apụghị imeri emeri.

Ndị Babilọn wara ụzọ azụmahịa ndị si n’ọzara ahụ jupụtara na nkume nke dị n’ebe ugwu Arebia gafee. N’otu oge, Eze Nabonaịdọs biri na Tima, ma hapụ Belshaza ka ọ chịwa na Babilọn.

Babilọn wakporo Kenan ugboro atọ. Mgbe Nebukadneza merisịrị ndị Ijipt na Kakemish na 625 T.O.A., ndị Babilọn gakwuru n’ihu ruo Hemat, bụ́ ebe ha nọ merie ndị Ijipt ọzọ, bụ́ ndị maliteworo ịgba ọsọ. Ndị Babilọn gbadawaziri n’ụsọ ndagwurugwu mmiri iyi Ijipt, na-ebibi Ashkelọn nke dị n’ụzọ. (2Ez 24:7; Jer 47:5-7) N’oge agha a na-aga n’ihu, Juda nọrọ n’okpuru Babilọn.—2Ez 24:1.

Eze Jehoakịm nke Juda nupụrụ isi na 618 T.O.A. Babilọn wee ziga usuu ndị agha nke mba ndị bi nso imegide Juda, usuu ndị agha nke Babilọn gbakwara Jeruselem gburugburu ma merie ya. N’oge na-adịghị anya, site n’ime ka alaeze ya na Ijipt jikọọ aka, Eze Zedekaịa kpaliri ndị Babilọn iwesa Juda iwe dị ọkụ. Ha buuru agha bịa ọzọ ma malite ibibi obodo dị iche iche nke Juda. (Jer 34:7) N’ikpeazụ, Nebukadneza chere ndị agha ya ihu na Jeruselem ma merie ya na 607 T.O.A.—2Ih 36:17-21; Jer 39:10.

[Map dị na peeji 23]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

Alaeze Ukwu Babilọn na Alaeze Ukwu Asiria

Alaeze Ukwu Asiria

B4 Memfis (Nọf)

B4 Zoan

B5 IJIPT

CH2 SAỊPRỌS (KITIM)

CH3 Saịdọn

CH3 Taịa

CH3 Megido

CH3 Sameria

CH4 Jeruselem

CH4 Ashkelọn

CH4 Lekish

D2 Heran

D2 Kakemish

D2 Apad

D2 Hemat

D3 Ribla

D3 SIRIA

D3 Damaskọs

E2 Gozan

E2 MESOPOTEMIA

F2 MINAỊ

F2 ASIRIA

F2 Kọsabad

F2 Ninive

F2 Kela

F2 Ashọ

F3 BABILỌN

F3 Babilọn

F4 KALDIA

F4 Irek

F4 Ọọ

G3 Shushan

G4 ILAM

Alaeze Ukwu Babilọn

CH3 Saịdọn

CH3 Taịa

CH3 Megido

CH3 Sameria

CH4 Jeruselem

CH4 Ashkelọn

CH4 Lekish

D2 Heran

D2 Kakemish

D2 Apad

D2 Hemat

D3 Ribla

D3 SIRIA

D3 Damaskọs

D5 Tema

E2 Gozan

E2 MESOPOTEMIA

E4 AREBIA

F2 MINAỊ

F2 ASIRIA

F2 Kọsabad

F2 Ninive

F2 Kela

F2 Ashọ

F3 BABILỌN

F3 Babilọn

F4 KALDIA

F4 Irek

F4 Ọọ

G3 Shushan

G4 ILAM

[Ebe ndị ọzọ]

G2 MIDIA

Okporo Ụzọ (Lee ebe e sere ya n’akwkw a)

[Mmiri]

B3 Oké Osimiri Mediterenian (Osimiri Ukwu)

CH5 Oké Osimiri Uhie

GB1 Oké Osimiri Kaspian

GB5 Ọwara Oké Osimiri Peshia

[Osimiri]

B5 Naịl

E2 Yufretis

F3 Taịgris

[Foto dị na peeji nke 22]

Mkputamkpu Ebe nke Lekish

[Foto dị na peeji nke 22]

Ihe atụ nke Megido oge ochie

[Foto dị na peeji nke 23]

Ihe osise nke ubi ndị koro n’elu nke Babilọn