Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gris na Rom Enwee Mmetụta n’Ebe Ndị Juu Nọ

Gris na Rom Enwee Mmetụta n’Ebe Ndị Juu Nọ

MGBASAWANYE nke ihe ghọrọ Alaeze Ukwu Gris malitere n’ugwu ndị dị na Masedonia. N’ebe ahụ, mgbe o jisịrị obere ihe gafee afọ 20, Alekzanda malitere ilega anya n’ebe ọwụwa anyanwụ. N’afọ 334 T.O.A., o duuru usuu ndị agha ya gafere Helispọnt (Dadnelz), nke kewara Europe na Eshia. Dị ka “agụ” nke na-akpa ike, ndị Gris n’okpuru ọchịchị Alekzanda, malitere inwe ọtụtụ mmeri n’ike n’ike. (Da 7:6) Alekzanda meriri ndị Peshia na nso Trọị, n’ala dị larịị nke Osimiri Granikọs, o merikwara ha n’ụzọ doro anya n’Isọs.

Ndị Gris wakwasịrị Siria na Finishia, wee bibie Taịa mgbe ọnwa asaa nke nnọchibido ha nọchibidoro ya gasịrị. (Ezi 26:4, 12) Alekzanda awakpoghị Jeruselem kama o meriri Geza. (Zek 9:5) Ozugbo o rutere Ijipt, o guzobere Alekzandria, nke ghọrọ ebe bụ́ isi maka azụmahịa na mmụta. Ka ọ na-agabiga Ala Nkwa ahụ ọzọ, o meriri ndị Peshia ọzọ na Gọgamila, nke dị nso ná mkpọmkpọ ebe nke Ninive.

Alekzanda chigharịrị chee ihu na ndịda ibibi Babilọn, Shushan (Susa), na Pesepọlis—bụ́ ebe ndị bụ́ isi nke ọchịchị Peshia. O jizikwa ọsọ gazuo ebe nile Peshia na-achị, wee rute Osimiri Indus n’ebe bụzi Pakistan ugbu a. N’ime nanị afọ asatọ, Alekzanda meriri ihe ka ukwuu n’ụwa a maara n’oge ahụ. Ma n’afọ 323 T.O.A., mgbe ọ dị afọ 32, ọrịa ịba gburu ya na Babilọn.—Da 8:8.

Ndị Gris nwere mmetụta dị ukwuu n’Ala Nkwa ahụ. Ụfọdụ ná ndị sobu ná ndị agha Alekzanda bịara biri n’ebe ahụ. Ka ọ na-erule narị afọ nke mbụ, e nwere njikọ nke obodo ndị na-asụ Grik (Dikapọlis). (Mt 4:25; Mk 7:31) Akwụkwọ Nsọ Hibru adịlarị n’asụsụ Grik. E ji Koine (asụsụ Grik nke ọha mmadụ na-asụ) mee ihe maka ịgbasa ozizi Ndị Kraịst.

Alaeze Ukwu Rom

Gịnị nọ na-eme n’ebe ọdịda anyanwụ? Rom—nke bụbu ìgwè ime obodo ndị dị n’akụkụ Osimiri Tiber—ghọwanyere ebe dị mkpa. N’ikpeazụ, usoro ibu agha bụ́ ịgba na usoro ịchịisi a na-ekewaghị ekewa nke Rom mere ka o merie ebe ndị dịbu n’okpuru ndị ọchịagha anọ nke Alekzanda n’egbughị oge. Ka ọ na-erule 30 T.O.A., o doro anya na ike Alaeze Ukwu Rom kachasị, nke bụ́ ihe mbụ e ji mata ‘anụ ọhịa ahụ dị egwu’ Daniel hụrụ n’ọhụụ.—Da 7:7.

Alaeze Ukwu Rom gbasapụrụ site na Britain gbadaa ruo Ebe Ugwu Africa, site n’Oké Osimiri Atlantic ruo n’Ọwara Oké Osimiri Peshia. Ebe ọ bụ na alaeze ukwu ahụ gbara oké osimiri Mediterenian okirikiri, ndị Rom kpọrọ ya Mare Nostrum (Oké Osimiri Anyị).

Rom nwekwara mmetụta n’ebe ndị Juu nọ, bụ́ ndị ala ha bụ akụkụ Alaeze Ukwu Rom. (Mt 8:5-13; Ọrụ 10:1, 2) Baptizim na ọnwụ Jizọs weere ọnọdụ n’oge ọchịchị Eze Ukwu bụ́ Taịbiriọs. Obi tara ụfọdụ ndị ọchịchị Rom mmiri ná mkpagbu ha kpagburu Ndị Kraịst, kama ha emerilighị ezi ofufe. Mgbe narị afọ 13 gasịrị, alaeze ukwu ahụ dara mgbe agbụrụ dị iche iche nke Germany bi n’ebe ugwu na ndị mwagharị na-alụ ọgụ ebe ọ bụla ha ruru, bụ́ ndị bi n’ebe ọwụwa anyanwụ wakporo ya.

[Map dị na peeji 26]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

Alaeze Ukwu Gris

Mgbe Alekzanda nwụsịrị, mmadụ anọ n’ime ndị ọchịagha ya weghaara ọchịchị alaeze ukwu ahụ buru nnukwu ibu

Kasanda

Laịsimakọs

Tọlemi nke Mbụ

Silukọs nke Mbụ

A2 ▪ GRIS

A2 ▪ Atens

A2 ▪ AKEA

A3 ○ Saịrini

A3 ○ LIBIA

B2 ▫ Bizanshem

B3 ○ SAỊPRỌS

B4 ○ No-emọn (Tibs)

CH3 ○ Palmaịra (Tadmọ)

CH3 ○ Jerasa

CH3 ○ Filadelfia

CH3 ○ Jeruselem

CH5 ○ Sayini

G2 Alekzandria Majiana

Ụzọ Alekzanda Si

A2 ▪ MASEDONIA

A2 ▪ Pela

A2 ▫ TRES

B2 ▫ Trọị

B2 ▫ Sadis

B2 ▫ Efesọs

B2 ▫ Gọdịọm

CH2 ▫ Ankara

CH3 Tasọs

CH3 Isọs

CH3 Antịọk (nke Siria)

CH3 ○ Taịa

CH4 ○ Geza

B4 ○ IJIPT

B4 ○ Memfis

B4 ○ Alekzandria

A4 ○ Ala Ahịhịa Ndụ nke Siwa

B4 ○ Memfis

CH4 ○ Geza

CH3 ○ Taịa

CH3 ○ Damaskọs

CH3 Alepo

D3 Nisibis

D3 Gọgamila

D3 Babilọn

E3 Shushan

E4 PESHIA

E4 Pesepọlis

E4 Pasagadi

E3 MIDIA

E3 Ekbatana

E3 Reji

E3 Hekatọmpilọs

F3 PATIA

G3 ARAỊA

G3 Alekzandria Ereyọn

G3 Alekzandria Frọftasịa

F4 DRANJIANA

G4 ARAKOSIA

G4 Alekzandria Arakosiorọm

GB3 Kabul

G3 Drapsaka

GB3 Alekzandria Ogziana

G3 Drapsaka

G3 BAKTRỊA

G3 Baktra

G2 Dabent

G2 SOGDIANA

G2 Marakanda

G2 Bukara

G2 Marakanda

GB2 Alekzandria Eskati

G2 Marakanda

G2 Dabent

G3 Baktra

G3 BAKTRỊA

G3 Drapsaka

GB3 Kabul

GB3 Tagzila

GB5 INDIA

GB4 Alekzandria

G4 JEDROZIA

F4 Pura

E4 PESHIA

F4 Alekzandria

F4 KAMENIA

E4 Pasagadi

E4 Pesepọlis

E3 Shushan

D3 Babilọn

[Ebe ndị ọzọ]

A3 KRIT

D4 AREBIA

[Mmiri]

B3 Oké Osimiri Mediterenian

CH5 Oké Osimiri Uhie

E4 Ọwara Oké Osimiri Peshia

G5 Oké Osimiri Arebia

[Osimiri]

B4 Naịl

D3 Yufretis

D3 Taịgris

G4 Indus

[Map dị na peeji 27]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

Alaeze Ukwu Rom

A1 BRITAIN

A3 SPEN

B1 GERMANY

B2 GỌL

B2 ỊTALI

B2 Rom

B3 Katej

CH2 ILIRIKỌM

CH3 GRIS

CH3 Akshiọm

CH3 Saịrini

D2 Bizanshem (Kọnstantinopụl)

D3 ESHIA MAỊNỌ

D3 Efesọs

D3 Alepo

D3 Antịọk (nke Siria)

D3 Damaskọs

D3 Jeraesa (Jarash)

D3 Jeruselem

D3 Alekzandria

D4 IJIPT

[Mmiri]

A2 Oké Osimiri Atlantic

CH3 Oké Osimiri Mediterenian

D2 Oké Osimiri Ojii

D4 Oké Osimiri Uhie

[Foto dị na peeji nke 26]

Mgbe o wughachisịrị Raba, Tọlemi nke Abụọ kpọrọ ya Filadelfia. Mkpọmkpọ ebe nke nnukwu ụlọ ihe nkiri dị na Rom

[Foto dị na peeji nke 27]

Obodo Dikapọlis nke dị na Jerasa (Jerash)

[Foto dị na peeji nke 27]

Ụzọ ndị Rom, dị ka nke a dị nso n’Alepo, si Europe, Ebe Ugwu Africa, na Etiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa gafere. Ndị Kraịst si ụzọ ndị a mee njem iji kpọsaa eziokwu Bible