Izrel n’Oge Devid na Solomọn
CHINEKE kwere nkwa inye mkpụrụ Ebram ala ahụ “site n’osimiri Ijipt ruo . . . osimiri Yufretis.” (Je 15:18; Ọp 23:31; De 1:7, 8; 11:24) Mgbe Jọshụa banyesịrị Kenan, o were ihe dị ka narị afọ anọ tupu Ala Nkwa ahụ eruo ókèala ndị ahụ.
Eze Devid meriri alaeze Zoba nke dị n’Eram, bụ́ nke ruru ebe Yufretis dị n’ebe ugwu Siria. a N’ebe ndịda, mmeri Devid meriri ndị Filistia mere ka ókèala ya nwee ike irute ókè Ijipt.—2Sa 8:3; 1Ih 18:1-3; 20:4-8; 2Ih 9:26.
Solomọn gara n’ihu ịchị “site n’Osimiri [Yufretis] ruo ala ndị Filistia, ruokwa ókèala Ijipt,” nke na-ese onyinyo ọchịchị udo nke Mezaịa ahụ. (1Ez 4:21-25; 8:65; 1Ih 13:5; Ọma 72:8; Zek 9:10) N’agbanyeghị nke ahụ, a na-ekwukarị na gburugburu ebe ndị Izrel biri gbasapụrụ “site na Dan wee ruo na Bia-shiba.”—2Sa 3:10; 2Ih 30:5.
N’inupụrụ Chineke isi, Eze Solomọn chịkọbara ịnyịnya na ụgbọ ịnyịnya. (De 17:16; 2Ih 9:25) Ọ pụrụ ịgba ha n’ọtụtụ okporo ámá na okporo ụzọ. (Jos 2:22; 1Ez 11:29; Aịs 7:3; Mt 8:28) Anyị nwere ihe ọmụma zuru ezu nke ebe nanị ole na ole n’ime ụzọ ndị a si gaa, dị ka “ụzọ a tụliri atụli nke na-arịgo site na Betel ruo Shikem, n’akụkụ Ndịda nke Lebona.”—Ikp 5:6; 21:19.
Akwụkwọ bụ́ The Roads and Highways of Ancient Israel na-ekwu, sị: “Ihe isi ike kasị pụta ìhè e nwere n’ịchọpụta ebe nile ụzọ si gaa n’Izrel oge ochie bụ na e nweghị ihe àmà ọ bụla a pụrụ ịhụ anya nke ụzọ ndị dịrị ná mba ahụ site n’oge Agba Ochie, bụ́ ndị dịgidere ruo ugbu a, n’ihi na a dịghị awụ ụzọ korota [n’oge ahụ].” Ma, otú ala ahụ n’onwe ya dị na ihe ochie ndị e gwupụtara n’ala nke obodo ukwu dị iche iche na-egosi ebe ọtụtụ ụzọ si gaa.
Ọtụtụ ugboro, ebe ndị ụzọ dịgasị kpebiri ebe ndị agha si gafere. (1Sa 13:17, 18; 2Ez 3:5-8) Iji buo agha megide Izrel, ndị Filistia zọọrọ njem si Ekrọn na Gat ruo ebe dị “n’etiti Soko na Azika.” Usuu ndị agha Sọl zutere ha n’ebe ahụ “na ndagwurugwu Ila.” Mgbe Devid gbusịrị Golaịat, ndị Filistia ji ọsọ gbalaa Gat na Ekrọn, Devid gbagokwara Jeruselem.—1Sa 17:1-54.
Lekish (D10), Azika (D9), na Bet-shimesh (D9) dị n’akụkụ abụọ nke ụzọ ndị si Shefila gafere ma gaa n’ugwu ndị dị na Juda. N’ihi ya, obodo ndị a dị n’ebe dị mkpa maka igbochi ndị iro nọ n’okporo ụzọ Via Maris ịbata n’ime Izrel.—1Sa 6:9, 12; 2Ez 18:13-17.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a Ókèala ebo Ruben banyere n’Ọzara Siria, nke Yufretis dị n’isi isi ebe ọwụwa anyanwụ ya.—1Ih 5:9, 10.
[Map ndị dị na peeji 17]
(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)
Ókèala Na Okporo Ụzọ Ndị Dịnụ Mgbe Otu Eze Chịrị Ala Ahụ
Ókèala Ndị E Nwere (n’Oge Solomọn)
Tifsa
Hemat
Tadmọ
Berotaị (Kọn?)
Saịdọn
Damaskọs
Taịa
Dan
Jeruselem
Geza
Aroa
Bia-shiba
Tema
Iziọn-giba
Ilat (Ilọt)
[Osimiri na Iyi]
Yufretis
N.M.I. Ijipt
(Ụzọ) Devid na Solomọn
B10 Geza
CH8 Jọpa
CH9 Ashdọd
CH10 Ashkelọn
CH11 Ziklag
CH12 ỌZARA PERAN
D5 Dọọ
D6 Hifa
D8 Efek
D8 Rema
D9 She-albim
D9 Giza
D9 Mekaz
D9 Ekrọn
D9 Bet-shimesh
D9 Gat
D9 Azika
D10 Soko
D10 Adọlam
D10 Kaịla
D10 Lekish
D11 Jatia
D12 Bia-shiba
E2 Taịa
E4 Kebul
E5 Jọkniam (Jọkmiam?)
E5 Megido
E6 Teanak
E6 Arọbọt
E7 Piratọn
E8 Lebona
E8 Zereda
E8 Betel
E9 Bet-horọn nke Dị ná Mgbada
E9 Bet-horọn nke Dị ná Mgbago
E9 Giba
E9 Gibiọn
E9 Gibia
E9 Kiriat-jierim
E9 Nọb
E9 Bel-perezim
E9 Jeruselem
E9 Betlehem
E10 Tekoa
E10 Hibrọn
E11 Zif
E11 Horesh?
E11 Kamel
E11 Meyọn
E11 Eshtemoa
F5 En-dọ
F5 Shunem
F5 Jezril
F6 Bet-shian
F7 Teza
F7 Shikem
F8 Zaretan
F8 Shaịlo
F8 Ọfra?
F9 Jeriko
F11 En-gidaị
G2 Ebel-bet-meaka
G2 Dan
G3 Hezọ
G3 MEAKA
G5 Lo-diba (Diba)
G5 Rogilim
G6 Ebel-mehola
G7 Sọkọt
G7 Mahaneim
GB1 SIRIA
GB4 GESHỌ
GB6 Remọt-gilied
GB8 Raba
GB9 Medeba
GB11 Aroa
GB12 MOAB
GH4 Hilam?
GH9 AMỌN
[Okporo Ụzọ]
CH10 Via Maris
GB6 Okporo Ụzọ Eze
[Ugwu]
F5 Ugwu Gilboa
[Mmiri]
CH8 Oké Osimiri Mediterenian (Osimiri Ukwu)
F10 Oké Osimiri Nnu (Oké Osimiri Nwụrụ Anwụ)
G4 Oké Osimiri Galili
[Mmiri Si na Nkume Agbapụta na olulu mmiri]
E9 En-rogel
[Foto ndị dị na peeji nke 16]
Aka Nri: Ndagwurugwu Ila, nke chere ihu n’ebe ọwụwa anyanwụ gaa n’ugwu ndị dị na Juda
N’okpuru: Ọtụtụ ụzọ mere ka o kwe omume ịgagharị n’Ala Nkwa ahụ