Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Jeruselem na Ụlọ Nsọ Ahụ Jizọs Maara

Jeruselem na Ụlọ Nsọ Ahụ Jizọs Maara

NWA oge mgbe a mụsịrị Jizọs, Josef na Meri kuuru ya gaa n’obodo ahụ Nna ya nke eluigwe kpọkwasịworo aha Ya—Jeruselem. (Lu 2:22-39) Mgbe ọ dị afọ 12, Jizọs gakwara ebe ahụ ọzọ maka Ememe Ngabiga. Nghọta o nwere tụrụ ndị nkụzi nọ n’ụlọ nsọ ahụ n’anya. (Lu 2:41-51) Ọrụ gara n’ihu n’ụlọ nsọ ahụ, nke so n’ọrụ ihe owuwu Herọd Onye Ukwu rụrụ, ruo ihe karịrị “afọ iri anọ na isii.”—Jn 2:20.

N’oge ozi ya, Jizọs bịara n’ememe ndị e mere na Jeruselem, bụ́ ebe ọ kụziiri ìgwè mmadụ ihe ugboro ugboro. Ọ chụpụrụ ndị na-agbanwe ego na ndị ahịa n’ogige ụlọ nsọ ahụ ugboro abụọ.—Mt 21:12; Jn 2:13-16.

N’ebe ugwu nke ụlọ nsọ ahụ, n’ọdọ mmiri Betzeta, Jizọs gwọrọ otu nwoke rịaworo ọrịa kemgbe afọ 38. Ọkpara Chineke mekwara ka otu nwoke kpuru ìsì hụ ụzọ site n’ịgwa ya ka ọ gaa saa anya ya n’ọdọ mmiri Silom nke dị n’ebe ndịda obodo ahụ.—Jn 5:1-15; 9:1, 7, 11.

Jizọs gara leta ndị enyi ya, bụ́ Lazarọs, Meri, na Mata ugboro ugboro na Betani, nke dị “ihe dị ka maịl abụọ” n’ebe ọwụwa anyanwụ Jeruselem. (Jn 11:1, 18, ihe odide ala ala peeji nke NW; 12:1-11; Lu 10:38-42; 19:29; lee “Gburugburu Jeruselem,” peeji nke 18.) Ụbọchị ole na ole tupu ọnwụ ya, Jizọs si ụzọ ebe Ugwu Oliv bịaruo Jeruselem. Jiri anya nke uche lee ka ọ na-akwụsịtụ iji lega anya n’akụkụ ebe ọdịda anyanwụ bụ́ ebe obodo ahụ dị ma beere ya ákwá. (Lu 19:37-44) Ihe ọ hụrụ aghaghị iyiwo ihe ị na-ahụ n’elu peeji na-esonụ. Mgbe nke ahụ gasịrị, ọ banyere Jeruselem n’elu nwa ịnyịnya ibu, eleghị anya o si n’otu n’ime ọnụ ụzọ ámá obodo ahụ ndị dị n’ebe ọwụwa anyanwụ banye. Ìgwè mmadụ ji ekele nabata ya dị ka onye ga-abụ Eze Izrel n’ọdịnihu.—Mt 21:9-12.

Ihe omume dị mkpa ndị bu ọnwụ Jizọs ụzọ weere ọnọdụ na Jeruselem ma ọ bụ n’ebe dị ya nso: ubi Getsemeni, ebe Jizọs kpere ekpere; ụlọ nzukọ Sanhedrin; ụlọ Keifas; obí eze Onye Ọchịchị bụ́ Paịlet, na n’ikpeazụ, Gọlgọta.—Mk 14:32, 53–15:1, 16, 22; Jn 18:1, 13, 24, 28.

Mgbe o bilitesịrị n’ọnwụ, Jizọs mere ka a hụ ya anya na Jeruselem na gburugburu ya. (Lu 24:1-49) Mgbe nke ahụ gasịrị, o si n’elu Ugwu Oliv rịgoo eluigwe.—Ọrụ 1:6-12.

[Ihe osise dị na peeji 31]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

Jerusalem/Herod’s Temple

Ebe Ndị Dị n’Ụlọ Nsọ

1. Ebe Kasị Nsọ

2. Ebe Nsọ

3. Ebe Ịchụàjà nke Àjà Nsure Ọkụ

4. Oké Osimiri A Wụrụ Awụ

5. Ogige Ndị Nchụàjà

6. Ogige Izrel

7. Ogige Ndị Inyom

8. Ogige Ndị Jentaịl

9. Mgbidi Mgbobichi (Soreg)

10. Veranda Ogidi nke Eze

11. Veranda Ogidi nke Solomọn

ỤLỌ NSỌ

Ọnụ Ụzọ Ámá

Ogige Ndị Nchụàjà

Ọnụ Ụzọ Ámá

Ebe Kasị Nsọ

Ebe Ịchụàjà nke Àjà Nsure Ọkụ

Ebe Nsọ

Ogige Izrel

Ogige Ndị Inyom

Oké Osimiri A Wụrụ Awụ

Ọnụ Ụzọ Ámá Veranda Ogidi nke Solomọn

Mgbidi Mgbobichi (Soreg)

Ogige Ndị Jentaịl

Ọnụ Ụzọ Ámá

Veranda Ogidi nke Eze

Ọnụ Ụzọ Ámá

Ụlọ Elu Antonia

Àkwà

Ụlọ Nzukọ Sanhedrin?

NDAGWURUGWU TAỊROPIỌN

Ọdọ Mmiri Silom

Ọwa Mmiri

Ụlọ Keifas?

Obí Onye Ọchịchị

Gọlgọta?

Gọlgọta?

Ọdọ Mmiri Betzeta

Ubi Getsemeni?

UGWU OLIV

NDAGWURUGWU KIDRỌN

Isi Iyi Gaịhọn

En-rogel

NDAGWURUGWU HINỌM (GEHENA)

[Foto ndị dị na peeji nke 30]

Ihe a na-ahụ ma e lee anya n’ebe ọwụwa anyanwụ n’ófè Jeruselem nke oge a: (A) gburugburu ebe ụlọ nsọ dị, (B) ubi Getsemeni, (CH) Ugwu Oliv, (D) ọzara Juda, (E) Oké Osimiri Nwụrụ Anwụ

[Foto dị na peeji nke 31]

Ihe a na-ahụ ma e lee anya n’ebe ọdịda anyanwụ site n’Ugwu Oliv n’oge Jizọs