Jeruselem na Ụlọ Nsọ Solomọn
A KPỌRỌ ya “ebe mazuru mma” na “obodo Eze ukwu.” (Ọma 48:2; 50:2; Ákw 2:15) Jeruselem bụ isi obodo nke mba Chineke. (Ọma 76:2) Mgbe Devid narasịịrị ndị Jibọs obodo ahụ ma mee ya isi obodo ya, a kpọrọ ya “obodo Devid,” ma ọ bụ nanị “Zayọn.”—2Sa 5:7.
Ọ bụ eziokwu na ọ dịghị n’ebe dị oké mkpa, Jeruselem dere ude n’ihi na Chineke kpọkwasịrị aha ya n’ebe ahụ. (De 26:2) Ọ bụ ebe bụ́ isi nke okpukpe na ịchịisi nke mba ahụ.
Jeruselem dị n’ebe ọ̀tụ̀tụ̀ ịdị elu ya dị mita 750 n’elu ugwu ndị dị n’etiti Judia. Bible na-ezo aka “n’ịdị elu” ya nakwa ná ndị na-efe ofufe dị ka ndị ‘na-arịgo’ iji ruo ebe ọ dị. (Ọma 48:2; 122:3, 4) Ndagwurugwu gbara obodo ochie ahụ okirikiri: Ndagwurugwu Hinọm dị n’ebe ọdịda anyanwụ na n’ebe ndịda, ndagwurugwu mmiri iyi Kidrọn dịkwa n’ebe ọwụwa anyanwụ. (2Ez 23:10; Jer 31:40) Mmiri iyi Gaịhọn a nke dị na Ndagwurugwu Kidrọn na En-rogel nke dị n’ebe ndịda mere ka e nwee ezi mmiri ọṅụṅụ, bụ́ nke dị oké mkpa karịsịa n’oge mwakpo ndị iro.—2Sa 17:17.
N’ihe osise dị na peeji nke 21, e sere Obodo Devid n’àgwà na-acha uhie uhie. N’oge ọchịchị Devid na Solomọn, obodo ahụ gbasapụrụ gaa n’ebe ugwu ịgụnye Ofel (n’àgwà na-acha ka akwụkwọ ndụ) na Ugwu Moraịa (n’àgwà na-acha anụnụ anụnụ). (2Sa 5:7-9; 24:16-25) Solomọn wuuru Jehova ụlọ nsọ dị ebube n’ebe ahụ ka dị elu. Jiri nnọọ anya nke uche lee ìgwè ndị na-efe ofufe ka ha na-agbago “ugwu nke Jehova” maka ememe ndị ahụ a na-eme kwa afọ! (Zek 8:3) Usoro ụzọ nke e gosipụtara na peeji nke 17 mere ka njem dị otú ahụ kwe omume.
Ụlọ nsọ Solomọn, nke e ji ọla edo na nkume ndị dị oké ọnụ ahịa chọọ mma, bụ otu n’ime ụlọ ndị kasị oké ọnụ e wutụworo. Ihe dị ịrịba ama bụ na ọ bụ Jehova nyere atụmatụ e ji wuo ya. Dị ka ị na-ahụ n’ihe osise ahụ, ogige ndị buru ibu na ụlọ ndị e si na ha enye ntụziaka dị n’akụkụ ụlọ nsọ ahụ. O kwesịrị ekwesị ka ị mụọ akụkụ ya nile nke ọma.—Ez 6:1–7:51; 1Ih 28:11-19; Hib 9:23, 24.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a Eze Hezekaịa gboro mmiri a, wurukwa ọwara mmiri gaa n’ọdọ mmiri dị n’akụkụ ebe ọdịda anyanwụ ya.—2Ih 32:4, 30.
[Ihe osise/Foto dị na peeji nke 21]
(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)
Jeruselem na Ụlọ Nsọ Solomọn
GBURUGBURU EBE ỤLỌ NSỌ DỊ N’OGE SOLOMỌN
Ihe Ndị Dị n’Ụlọ Nsọ
1. Ebe Kasị Nsọ
2. Ebe Nsọ
3. Ihe Owuwu Ụzọ Mbata
4. Boaz
5. Jekin
6. Ebe Ịchụàjà E Ji Ọla Kọpa Mee
7. Oké Osimiri A Wụrụ Awụ
8. Ihe Ndị E Ji Ebu Ihe
9. Ụlọ Ndị Dị n’Akụkụ
10. Ụlọ Iri Nri
11. Ogige Dị n’Ime
GBURUGBURU EBE ỤLỌ NSỌ DỊ
Ugwu Moraịa
Ụlọ Iri Nri
Ihe Ndị E Ji Ebu Ihe
Ụlọ Ndị Dị n’Akụkụ
Ebe Kasị Nsọ
Boaz
Ebe Nsọ
Ihe Owuwu Ụzọ Mbata
Ebe Ịchụàjà E Ji Ọla Kọpa Mee
Jekin
Ogige Dị n’Ime
Ihe Ndị E Ji Ebu Ihe
Oké Osimiri A Wụrụ Awụ
Ofel
Ámá?
Ọnụ Ụzọ Ámá Mmiri?
OBODO DEVID
Ugwu Zayọn
Obí Devid
Ọnụ Ụzọ Ámá Isi Iyi
Mgbidi Manase?
Ụlọ Elu Hananel
Ụlọ Elu Mia
Ọnụ Ụzọ Ámá Atụrụ
Ọnụ Ụzọ Ámá Ndị Nche
Ọnụ Ụzọ Ámá Nnyocha
Ọnụ Ụzọ Ámá Ịnyịnya
NDAGWURUGWU KIDRỌN
Mgbidi Ebe Mpụga?
Gaịhọn
Ọwara mmiri nke e mesịrị nwee
NDAGWURUGWU TAỊROPIỌN
Ọnụ Ụzọ Ámá Ikpo Ntụ (Iberibe Eju) (Nsị Anụ)
En-rogel
Ọnụ Ụzọ Ámá Ndagwurugwu
NDAGWURUGWU HINỌM
Ọnụ Ụzọ Ámá Nkuku
Ụlọ Elu nke Ekwu Ighe Ihe
Mgbidi Dị Obosara
Ọnụ Ụzọ Ámá Ifrem
Ámá
Ọnụ Ụzọ Ámá nke Obodo Ochie
Mgbidi Mbụ nke Ebe Ugwu
ÓGBÈ NKE ABỤỌ
Ọnụ Ụzọ Ámá Azụ
[Foto]
Ofel
Ụlọ nke Ada Fero
Obí Eze Solomọn
Ụlọ nke Ọhịa Lebanọn
Ihe Owuwu Ụzọ Mbata Ogidi
Ihe Owuwu Ụzo Mbata Ocheeze
Ugwu Moraịa
Ogige Ukwu
Ụlọ Nsọ
[Foto dị na peeji nke 20]
N’ihu ihu bụ ebe “Obodo Devid” dị. Ụlọ nsọ ahụ dị n’ebe ahụ dị larịị (n’azụ)
[Foto dị na peeji nke 20]
“Obodo Devid” nke oge ochie na ụlọ nsọ Solomọn nke e ji kọmputa sepụta