Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Jizọs “n’Obodo Ndị Juu”

Jizọs “n’Obodo Ndị Juu”

MGBE ọ na-agbara Kọnịliọs àmà, Pita onyeozi kwuru ihe Jizọs mere “n’obodo ndị Juu nakwa na Jeruselem.” (Ọrụ 10:39) Olee ebe ndị i chere so n’ebe Jizọs jere ozi ya nke mere ihe akụkọ?

‘Obodo ndị Juu’ gụnyere Judia, bụ́ ebe Jizọs rụrụ ọrụ ụfọdụ sitere n’aka Chineke. (Lu 4:44) Mgbe e mesịrị ya baptizim, Jizọs nọrọ ụbọchị 40 n’ọzara Juda (ma ọ bụ, Judia), bụ́ ala kpọrọ nkụ ma tọgbọrọ n’efu nke ndị nnupụisi na ndị ohi na-agakarị. (Lu 10:30) N’oge ọzọ, Jizọs si Judia na-aga n’ebe ugwu mgbe ọ gbaara nwanyị Sameria àmà n’ebe dị nso na Saịka.—Jn 4:3-7.

Ntụle ihe ndekọ Bible banyere ndụ na ozi Jizọs na-egosi na Jizọs jere ozi karịsịa na Galili. Ọ bụ ezie na o jere Jeruselem nke dị n’ebe ndịda maka ememe ndị a na-eme kwa afọ, o ji ihe ka ukwuu n’afọ abụọ ndị mbụ nke ozi ya jee ozi n’akụkụ ebe ugwu nke Ala Nkwa ahụ. (Jn 7:2-10; 10:22, 23) Dị ka ihe atụ, o ziri ọtụtụ ihe ndị dị ịrịba ama ma rụọ ọrụ ebube ndị na-akpali akpali mgbe ọ nọ n’ebe dị nso n’Oké Osimiri Galili ma ọ bụ kpọmkwem n’oké osimiri ahụ. Cheta na o mere ka mmiri ya ebili mmiri na-enugharị daa jụụ ọbụna gaa ije n’elu ya. O si n’ụgbọ epeepe zie ọtụtụ ìgwè mmadụ nọ n’ụsọ oké osimiri ahụ jupụtara n’ajịrịja ozi ọma. Ụmụazụ ya ndị mbụ, bụ́ ndị ha na ya nwere mkpakọrịta chiri anya, si n’ime obodo ndị dị nso e ji ịkụ azụ na ọrụ ugbo mara.—Mk 3:7-12; 4:35-41; Lu 5:1-11; Jn 6:16-21; 21:1-19.

Ebe bụ́ isi Jizọs nọ jee ozi na Galili bụ ụsọ osimiri Kapaniọm, nke bụ ‘obodo nke ya.’ (Mt 9:1) Ọ nọ n’akụkụ ugwu nke na-adịghị anya site n’ebe ahụ mgbe o ziri Ozizi Elu Ugwu ya a ma ama. N’oge ụfọdụ, o ji ụgbọ epeepe si na gburugburu ebe Kapaniọm gaa Magadan, Betseida, ma ọ bụ ebe ndị dị ha nso.

Rịba ama na ‘obodo nke Jizọs’ adịchaghị anya site na Nazaret, bụ́ ebe ọ nọ too; site na Kena, bụ́ ebe o mere mmiri ka ọ ghọọ mmanya; site na Nen, bụ́ ebe ọ kpọlitere nwa nwoke nke nwanyị di ya nwụrụ n’ọnwụ; nakwa site na Betseida, bụ́ ebe o nyejuru ndị ikom dị 5,000 afọ n’ụzọ ọrụ ebube ma mee ka nwoke kpuru ìsì malite ịhụ ụzọ.

Mgbe Ememe Ngabiga nke 32 O.A., gasịrị, Jizọs gara ebe ugwu nke gawara Taịa na Saịdọn, bụ́ ọdụ ụgbọ mmiri ndị dị na Finishia. Mgbe nke ahụ gasịrị, o ji ozi ya garuo ụfọdụ n’ime obodo iri ndị ahụ ndị Grik bịara bijupụta bụ́ ndị a kpọrọ Dikapọlis. Jizọs nọ nso na Sesaria Filipaị (F2) mgbe Pita kwupụtara na ọ bụ Mezaịa, nnwogha ya sochikwara n’oge na-adịghị anya, eleghị anya n’elu Ugwu Hemọn. Mgbe e mesịrị, Jizọs zisara ozi ọma n’ógbè Peria, n’ófè Jọdan.—Mk 7:24-37; 8:27–9:2; 10:1; Lu 13:22, 33.

Jizọs ji izu ikpeazụ ya n’elu ụwa nọnyere ndị na-eso ụzọ ya n’ime Jeruselem nakwa na gburugburu ya, bụ́ “obodo nke Eze ukwu ahụ.” (Mt 5:35) Ị pụrụ ịhụ ebe ndị dị nso ị gụworo banyere ha n’ihe ndekọ Bible banyere ndụ na ozi Jizọs, dị ka Emeọs, Betani, Betfeji, na Betlehem.—Lu 2:4; 19:29; 24:13; lee “Gburugburu Jeruselem,” nke dị na peeji nke 18.

[Map dị na peeji 29]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

Ala Nkwa (oge Jizọs)

Ala ahụ n’Oge Jizọs

Obodo Ndị Dị na Dikapọlis

E5 Hipo(s)

E6 Pela

E6 Saịtopọlis

F5 Gadara

F7 Jerasa

G5 Diọn

G9 Filadelfia

GB1 Damaskọs

GB4 Rafana

GH5 Kanata

Okporo Ụzọ (Lee ebe e sere ya n’akwkw a)

Ụzọ Dị n’Agbata Galili na Jeruselem nke Ndị Mmadụ Na-esikarị (Lee ebe e sere ya n’akwkw a)

Ụzọ Ọzọ nke Si Galili Gaa Jeruselem, Bụ́ nke Si Peria Gafere (Lee ebe e sere ya n’akwkw a)

A11 Geza

B6 Sesaria

B8 Jọpa

B9 Lida

B12 Bia-shiba

CH4 Tọlemeas

CH8 SAMERIA

CH8 Antipatris

CH8 Arịmatịa

CH9 Emeọs

CH10 JUDIA

CH11 Hibrọn

CH12 IDUMIA

D1 Saịdọn

D2 Taịa

D4 FINISHIA

D4 GALILI

D4 Kena

D5 Sepforis

D5 Nazaret

D5 Nen

D7 Sameria

D7 Saịka

D9 Ifrem

D9 Betfeji

D9 Jeruselem

D9 Betani

D10 Betlehem

D10 Herọdiọm

D10 ỌZARA JUDA

D12 Masada

E4 Korezin

E4 Betseida

E4 Kapaniọm

E4 Magadan

E5 Taịbirias

E5 Hipo(s)

E6 Betani? (n’ófè Jọdan)

E6 Saịtopọlis

E6 Pela

E6 Selim

E6 Inọn

E9 Jeriko

F1 ABILINI

F2 Sesaria Filipaị

F4 Gamala

F5 Abila?

F5 Gadara

F7 PERIA

F7 Jerasa

G3 ITURIA

G5 Diọn

G6 DIKAPỌLIS

G9 Filadelfia

GB1 Damaskọs

GB3 TRAKỌNAỊTIS

GB4 Rafana

GB12 AREBIA

GH5 Kanata

[Ugwu]

D7 Ugwu Ibal

D7 Ugwu Gerizim

F2 Ugwu Hemọn

[Mmiri]

B6 Oké Osimiri Mediterenian (Osimiri Ukwu)

E4 Oké Osimiri Galili

E10 Oké Osimiri Nnu (Oké Osimiri Nwụrụ Anwụ)

[Osimiri]

E7 Osimiri Jọdan

[Mmiri Si na Nkume Agbapụta na olulu mmiri]

D7 Olulu Mmiri Jekọb

[Foto dị na peeji nke 28]

Oké Osimiri Galili. Kapaniọm dị n’ihu ihu n’aka ekpe. Ebe a na-ahụ bụ ebe ndịda ọdịda anyanwụ nke dị n’ófè Ala Dị Larịị nke Jenesaret

[Foto dị na peeji nke 28]

Ndị Sameria fere ofufe n’Ugwu Gerizim. Ugwu Ibal dị n’azụ