Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

‘Mgbe Jehova Mere Ka Ndị Ikpe Bilie’

‘Mgbe Jehova Mere Ka Ndị Ikpe Bilie’

Ọ GAGHỊ esiri gị ike ịhụ ebe Ugwu Tebọ dị (F4) na map a—n’ebe ndịda ọdịda anyanwụ nke Oké Osimiri Galili, nke dị na Ndagwurugwu Jezril. Gbalịa iji anya nke uche hụ usuu ndị agha dị 10,000 ka ha zukọtara n’elu ugwu ahụ. Jehova ji Onyeikpe bụ́ Berak na onye amụma nwanyị bụ́ Debọra kpalie Izrel imegide Eze Jebin nke Kenan, onye kpagbuworo ndị Izrel ruo afọ 20. N’okpuru ọchịagha bụ́ Sisera, ụgbọ ịnyịnya 900 Jebin, bụ́ ndị nwere mma ígwè na-eyi egwu, si Haroshet bịa ná mmiri Kaịshọn nke takọrọ atakọ, n’agbata Megido na Ugwu Tebọ.

Onyeikpe bụ́ Berak duuru ndị ikom Izrel gbadaa na ndagwurugwu ahụ iji busoo usuu ndị agha Sisera agha. Jehova hụrụ na ha meriri site n’izite oké idei mmiri nke mere ka ụgbọ ịnyịnya Sisera tọ n’apịtị, bụ́ nke mere ka egwu tụọ ndị Kenan. (Ikp 4:1–5:31) Nke ahụ bụ nanị otu n’ime ọtụtụ mmeri Chineke nyere Izrel n’oge Ndị Ikpe.

Mgbe ha merisịrị Kenan, e kerisiri ala ahụ n’etiti agbụrụ dị iche iche nke Izrel. Rịba ama ebe agbụrụ dịgasị iche iche na-abụghị ndị Livaị gara biri. Obere agbụrụ Simiọn ketara obodo ndị dị n’ókèala Juda. Mgbe Jọshụa nwụsịrị, mba ahụ tinyere aka n’okpukpe na omume rụrụ arụ. N’ihi mmegide sitere n’aka ndị iro ha, Izrel ‘nwetara mkpagbu nke ukwuu.’ N’iji ọmịiko mee ihe n’ọnọdụ a, ‘Jehova mere ka ndị ikpe bilie’—ndị ikom 12 nwere okwukwe na obi ike—ndị napụtara Izrel n’ime narị afọ atọ.—Ikp 2:15, 16, 19.

Onyeikpe bụ́ Gidiọn ji nanị ndị agha dị 300, ndị na-ejighị oké ngwa agha ma ha dị gara gara, merie ndị agha Midia dị 135,000. Ebe a nọ lụọ agha ahụ dị n’agbata Ugwu Gilboa na More. Mgbe ha nwesịrị mmeri ná mmalite, Gidiọn chụụrụ ndị iro ahụ gaa n’ebe ọwụwa anyanwụ, banye n’ọzara.—Ikp 6:1–8:32.

Jefta, bụ́ onye Gilied nke si n’agbụrụ Manase, napụtara obodo Izrel ndị dị n’ebe ọwụwa anyanwụ nke Jọdan n’aka ndị Amọn na-akpagbu ha. Iji nweta mmeri ya, ọ pụrụ ịbụ na Jefta si n’Okporo Ụzọ Eze, bụ́ nke jikọrọ Remọt-gilied na ógbè Aroa.—Ikp 11:1–12:7.

Ike ndị Samsịn kpara megide ndị Filistia weere ọnọdụ n’ebe ikperé mmiri dị na gburugburu Geza na Ashkelọn. Geza dị n’ógbè ebe mmiri na-ede ala nke ọma bụ́ nke e ji ọrụ ugbo mara. Samsịn ji nkịta ọhịa dị 300 sunye ọkụ n’ubi ọka, vaịn, na oliv nke ndị Filistia.—Ikp 15:4, 5.

Dị ka ọ pụtara ìhè n’ihe ndekọ Bible ma ọ bụ dị ka agbụrụ ha mere ka a ghọta, ndị ikpe ahụ nọ na-akpa ike n’ebe nile gburugburu Ala Nkwa ahụ. N’ebe ọ bụla ihe ọ bụla nọ mee, Jehova lekọtara ndị ya nwere nchegharị n’oge nsogbu.

[Map dị na peeji 15]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

Ebo D Iche Iche nke Izrel na Nd Ikpe

Ndị Ikpe

1. Ọtniel (Ebo Manase)

2. Ihọd (Ebo Juda)

3. Shamga (Ebo Juda)

4. Berak (Ebo Naftalaị)

5. Gidiọn (Ebo Ịsaka)

6. Tola (Ebo Manase)

7. Jeya (Ebo Manase)

8. Jefta (Ebo Gad)

9. Ibzan (Ebo Asha)

10. Ilọn (Ebo Zebulọn)

11. Abdọn (Ebo Ifrem)

12. Samsịn (Ebo Juda)

Ala Ndị E Ketara n’Ebo n’Ebo (Lee ebe e sere ya n’akwụkwọ a)

Obodo Ebo Manase Nwegasịrị n’Etiti Ihe Nketa nke Ebo Ndị Ọzọ

E4 Dọọ

E5 Megido

E5 Teanak

F4 En-dọ

F5 Bet-shian (Bet-shan)

F5 Ibliam (Gat-rimọn)

Obodo Ebo Simiọn Nwegasịrị n’Etiti Ihe Nketa nke Ebo Ndị Ọzọ

CH9 Sharuhen (Shearem) (Shilhim)

CH10 Bet-lebyọt (Bet-biraị)

D8 Ita (Tokin)

D9 Ziklag

D9 Eyin

D9 Heza-susa?

D9 Eshan

D9 Bia-shiba

D10 Heza-shual

E9 Itam

E9 Bet-makabọt

E9 Betuel? (Kizụl?)

E9 Shiba? (Jeshua)

E10 Belat-bia (Bel)

E10 Izem

Obodo Mgbaba nke Ndị Livaị

E8 Hibrọn

F3 Kedesh

F6 Shikem

GB4 Golan

GB5 Remọt-gilied

GB8 Biza

Okporo Ụzọ

B10 Via Maris

G10 Okporo Ụzọ Eze

Ebo Dị Iche Iche nke Izrel

DAN (D7)

D7 Jọpa

E8 Zora

JUDA (D9)

CH8 Ashkelọn

CH9 Geza

CH9 Sharuhen (Shearem) (Shilhim)

CH10 Bet-lebyọt (Bet-biraị)

CH12 Azmọn

CH12 Kedesh

D7 Jabniel

D8 Ita (Tokin)

D9 Ziklag

D9 Eyin

D9 Heza-susa?

D9 Eshan

D9 Bia-shiba

D10 Heza-shual

E8 Lihaị

E8 Betlehem

E8 Hibrọn

E9 Itam

E9 Bet-makabọt

E9 Betuel? (Kizụl?)

E9 Shiba? (Jeshua)

E10 Belat-bia (Bel)

E10 Izem

ASHA (E3)

E2 Taịa

E4 Haroshet

E4 Dọọ

F1 Saịdọn

MANASE (E5)

E6 Shemia (Sameria)

E6 Piratọn

F6 Shikem

G5 Ebel-mehola

IFREM (E7)

E7 Timnat-sira

F6 Tapua

F6 Shaịlo

F7 Betel (Lọz)

NAFTALAỊ (F3)

F2 Bet-enat

F3 Kidesh

G3 Hezọ

ZEBULỌN (F4)

E4 Betlehem

ỊSAKA (F5)

E5 Megido

E5 Kidesh (Kishion)

E5 Teanak

F4 En-dọ

F5 Bet-shita

F5 Bet-shian (Bet-shan)

F5 Ibliam (Gat-rimọn)

BENJAMIN (F7)

F7 Gilgal

F8 Jeruselem

DAN (G2)

G2 Dan (Leish)

MANASE (GB3)

GB4 Golan

GAD (GH6)

G6 Sọkọt

G6 Penuel

G6 Mizpa (Mizpe)

G7 Jọg-beha

GB5 Remọt-gilied

GB7 Raba

GB7 Ebel-keramịm

RUBEN (GB)

G7 Heshbọn

G9 Aroa

GB7 Minit

GB8 Biza

[[Ebe ndị ọz]

GH1 Damaskọs

[Ugwu]

F4 Ugwu Tebọ

F4 More

F6 Ugwu Ibal

F5 Ugwu Gilboa

F6 Ugwu Gerizim

[Mmiri]

CH5 Oké Osimiri Mediterenian (Osimiri Ukwu)

F9 Oké Osimiri Nnu

G4 Oké Osimiri Galili

[Osimiri na Iyi]

B11 N.M.I. Ijipt

F6 Osimiri Jọdan

G6 N.M.I. Jabọk

G9 N.M.I. Anọn

G11 N.M.I. Zired

[Foto dị na peeji nke 14]

Ugwu Tebọ, n’ókèala Ịsaka, dị elu karịa Ndagwurugwu Jezril

[Foto dị na peeji nke 14]

Idei mmiri e nwere na Kaịshọn mere ka ụgbọ ịnyịnya Sisera tọ n’apịtị