Ndị Chineke Alọghachi n’Ala Ha
USORO ugwu abụọ a ma ama gbara ala dị larịị nke Iran oge a gburugburu—Elbọz (ebe ndịda nke Oké Osimiri Kaspian) na Zagros (ebe ndịda ọwụwa anyanwụ nke ebe chere ihu n’Ọwara Oké Osimiri Peshia.) Ihe kebiri ha bụ ogologo ndagwurugwu ndị ala ha na-eme nri bụ́ ndi jupụtara n’osisi. Ndagwurugwu ndị ahụ nwere ọnọdụ ihu igwe dị mma, ma mbara ala ndị dị elu karị, ndị kpọrọ nkụ, bụ́ ndị oké ifufe na-efekarị na ha na-ajụbiga oyi ókè n’oge oyi. Na nso ebe ahụ, e nwere ọzara mmadụ na-ebikebeghị na ya n’ala ahụ dị larịị. Ọ bụ na gburugburu ógbè a nke dị n’ebe ọwụwa anyanwụ Mesopotemia ka Alaeze Ukwu Midia na Peshia si malite.
Ndị Midia biri n’ebe ugwu nke ala ahụ dị larịị, ọ bụ ezie na ha mesịrị gbasaruo Armenia, na Silaịshia. Otú ọ dị, ndị Peshia biri n’ebe ndịda ọdịda anyanwụ nke ala ahụ dị larịị, nke dị n’ebe ọwụwa anyanwụ nke Ndagwurugwu Taịgris. N’okpuru ọchịchị Saịrọs n’etiti narị afọ nke isii T.O.A., alaeze abụọ ndị a jikọrọ aka, na-aghọ Ike Ọchịchị Ụwa nke Midia na Peshia.
Saịrọs weghaara Babilọn na 539 T.O.A. Alaeze ukwu ya gbasapụrụ n’ebe ọwụwa anyanwụ ruo India. N’ebe ọdịda anyanwụ, ọ bịara gụnye Ijipt na ebe bụ́ Turkey n’oge a. N’ụzọ ziri ezi, Daniel kọwara Alaeze Ukwu Midia na Peshia dị ka anụ ọhịa “bea” nke ‘riri ọtụtụ anụ.’ (Da 7:5) Saịrọs guzobere ọchịchị obiọma, nke hapụrụ onye ọ bụla iso ụzọ sọrọ ya. O kewasịrị alaeze ukwu ahụ gaa n’ógbè n’ógbè. Nke ọ bụla nwere onye ọchịchị, nke na-abụkarị onye Peshia, kama n’okpuru ya, a na-enwe nwa amaala nke nwere ọkwá ịchịisi ruo n’ókè ụfọdụ. A gbara ndị dị iche iche bi n’alaeze ukwu ahụ ume ịnọgide n’omenala nakwa n’okpukpe ha.
N’ikwekọ n’ụkpụrụ a, Saịrọs hapụrụ ndị Juu ịlọghachi iji weghachi ezi ofufe na iji wughachi Jeruselem, dị ka Ezra na Nehemaịa si kọwaa. Ì chere na ìgwè mmadụ a buru ibu si n’ụzọ ahụ Ebreham si gbagoo Yufretis nke gawara Kakemish lọghachi, ka hà si ma eleghị anya ụzọ ka nso nke si Tadmọ na Damaskọs gafere? Bible ekwughị. (Lee peeji nke 6-7.) Ka oge na-aga, ndị Juu malitekwara ibi n’akụkụ ndị ọzọ nke alaeze ukwu ahụ, dị ka n’ógbè ndị dị n’ebe Osimiri Naịl gwụsịrị nakwa n’ebe ndị ọzọ dị ma a gbadakwuo ndịda. Ìgwè hitụrụ nne nke ndị Juu nọgidere na Babilọn, nke pụrụ ịbụ ya kpatara Pita ji gaa ebe ahụ ọtụtụ narị afọ mgbe e mesịrị. (1Pi 5:13) N’ezie, Alaeze Ukwu Midia na Peshia so mee ka ndị Juu birigasịa n’ọtụtụ ebe n’oge ọchịchị nke alaeze ukwu ndị Gris na Rom sochiri ya.
Mgbe ha merisịrị Babilọn, ndị Midia na Peshia ji obodo ukwu ahụ, nke okpomọkụ ya na-adị egwu n’oge ọkọchị, mere isi obodo. Shushan, nke bụbu isi obodo Ilam, bụ otu n’ime obodo ndị eze biri na ya. Ka oge na-aga, ọ bụ n’ebe ahụ ka Eze Ahazirọs nke Peshia (nke ihe àmà gosiri na ọ bụ ya bụ Zaksiz nke Mbụ) mere Esta eze nwanyị ya ma mebie nkata a kpara igbuchapụ ndị Chineke nọ n’ebe nile n’alaeze ukwu ahụ sara mbara. Isi obodo abụọ ọzọ nke Midia na Peshia bụ Ekbatana (nke dị n’ebe ji ihe karịrị mita 1,900 dị elu, nke oge ọkọchị ya na-adịkwa mma n’ahụ́) na Pasagadi (nke dịkwa elu otú ahụ, ma dị ihe dị ka kilomita 650 n’ebe ndịda ọwụwa anyanwụ).
Olee otú ike ọchịchị ụwa a si bịa ná njedebe? Mgbe ọ nọ n’ọ̀tụ̀tụ̀ kasị elu nke ike ya, Midia na Peshia mere ihe banyere nnupụisi nke ndị Grik n’ókèala ya dị n’ebe ugwu ọdịda anyanwụ. N’oge ahụ, Gris kewasịrị ekewasị gaa n’obere mba ndị na-eburịta agha, ma ndị a jikọrọ aka ọnụ merie usuu ndị agha Peshia n’agha kpụ ọkụ n’ọnụ ndị a lụrụ na Maratọn na Salamis. Ọ bụ nke a dujere ná nkarị ndị Gris e jikọrọ ọnụ bịara karịa ndị Midia na Peshia.
[Map dị na peeji 24]
(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)
Alaeze Ukwu Midia na Peshia
A2 MASEDONIA
A2 TRES
A4 Saịrini
A4 LIBIA
B2 Bizanshem
B2 LIDIA
B3 Sadis
B4 Memfis (Nọf)
B4 IJIPT
B5 No-emọn (Tibs)
B5 Sayini
CH3 SILAỊSHIA
CH3 Tasọs
CH3 Isọs
CH3 Kakemish
CH3 Tadmọ
CH3 SIRIA
CH3 Saịdọn
CH3 Damaskọs
CH3 Taịa
CH4 Jeruselem
D2 Fasis
D2 ARMENIA
D3 ASIRIA
D3 Ninive
D4 Babilọn
E3 MIDIA
E3 Ekbatana (Akmeta)
E3 HAYAKENIA
E4 Shushan (Susa)
E4 ILAM
E4 Pasagadi
E4 Pesepọlis
E4 PESHIA
F3 PATIA
F4 DRANJIANA
G2 Marakanda (Samakand)
G3 SOGDIANA
G3 BAKTRỊA
G3 ARAỊA
G4 ARAKOSIA
G4 JEDROZIA
GB5 INDIA
[Ebe ndị ọzọ]
A2 GRIS
A3 Maratọn
A3 Atens
A3 Salamis
CH1 SITIA
CH4 Ilat (Ilọt)
CH4 Tima
D4 AREBIA
[Ugwu]
E3 UGWU ELBỌZ
E4 UGWU ZAGROS
[Mmiri]
B3 Oké Osimiri Mediterenian (Osimiri Ukwu)
CH2 Oké Osimiri Ojii
CH5 Oké Osimiri Uhie
E2 Oké Osimiri Kaspian
E4 Ọwara Oké Osimiri Peshia
[Osimiri]
B4 Naịl
CH3 Yufretis
D3 Taịgris
GB4 Indus
[Foto dị na peeji nke 24]
Usuu ndị agha Saịrọs gabigara Ugwu Zagros iji ruo Babilọn
[Foto dị na peeji nke 25]
N’elu: Ọnụ Ụzọ nke Mba Nile, nke dị na Pesepọlis
[Foto dị na peeji nke 25]
N’etiti: Ili Saịrọs, nke dị na Pasagadi