Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Site n’Ijipt Ruo n’Ala Nkwa Ahụ

Site n’Ijipt Ruo n’Ala Nkwa Ahụ

NDỊ mmadụ n’ebe nile maara banyere Ọpụpụ ahụ e si n’Ijipt pụọ. Ma gịnị na-echere Mozis na ndị Chineke mgbe ha gafesịrị Oké Osimiri Uhie? Ebee ka ha tinyere isi, oleekwa otú ha si rute Osimiri Jọdan iji banye Ala Nkwa ahụ?

Ebe ha na-aga bụ ala Kenan, ma Mozis esighị ụzọ nke kasị nso—ihe dị ka kilomita 400 n’ogologo ikperé mmiri nke jupụtara n’ájá uzuzu—nke gaara edubanye kpọmkwem n’ime Filistia, bụ́ ókèala ndị iro. O sighịkwa n’etiti ebe sara mbara nke ebe Ala Saịnaị Dịịrị Banye ná Mmiri gafere, bụ́ ebe okpomọkụ kpụ ọkụ n’ọnụ na-eme ka ajịrịja nkume na nkume nzu nke ala ahụ dị larịị kpoo ajọ ọkụ. Ee e, Mozis duuru ndị ahụ gawa ndịda, gbadaa ala ikperé mmiri nke dị larịị ma dị warara. Ebe mbụ ha kwụsịtụrụ bụ na Mera, ebe Jehova mere ka mmiri dị ilu tọwa ụtọ. a Mgbe ha hapụsịrị Ilim, ndị ahụ tamuru ntamu maka nri; Chineke zigaara ha nnụnụ kwel, mesịakwa zigara ha mana. Na Refidim, mmiri kpatakwara esemokwu ọzọ, e meriri ndị Amalek bu agha bịa, nna nwunye Mozis gbakwara ya ume inweta enyemaka site n’aka ndị ikom ruru eru.—Ọp, isi 15-18.

Mgbe nke a gasịrị Mozis duuru ndị Izrel gawa n’ugwu ndị dị n’ime ime ebe ndịda ma kwụsịtụ n’Ugwu Saịnaị. N’ebe ahụ ka ndị Chineke natara Iwu ahụ, wuo ụlọikwuu, chụọkwa àjà. N’afọ nke abụọ, ha gawara ebe ugwu wee si ‘n’ọzara ukwu nke dị egwu’ gafere, njem ha ịgaru ebe Kedesh (Kedesh-bania) dị yiri ka o were ụbọchị 11. (De 1:1, 2, 19; 8:15) N’ihi ịbụ ndị egwu jidere maka akụkọ ọjọọ ndị nledo iri wetara, ndị ahụ wagharịrị ruo afọ 38. (Ọg 13:1–14:34) Abrona na Iziọn-giba so n’ebe ndị ha kwụsịtụgasịrị, ha laghachikwara azụ na Kedesh.—Ọg 33:33-36.

Mgbe oge mesịrị ruo ka Izrel bịaruo Ala Nkwa ahụ, ndị Izrel agawaghị n’ebe ugwu. Ụzọ ha si duuru ha si n’akụkụ isi ala Idọm gafere ma gbagoo “n’okporo ụzọ eze,” nke bụ́ Okporo Ámá Eze. (Ọg 21:22; De 2:1-8) Ọ dịghịrị mba ahụ dum—bụ́ ndị chị ụmụaka, ụmụ anụmanụ, ma buru ụlọ ntú—mfe isi ụzọ a gafere. Ha sooro ụzọ gbara ngọrịngọ gbadaa n’ime ajọ ndagwurugwu ndị tara akpụ—Zired na Anọn (ndị dị ihe fọrọ nke nta ka ha ruo mita 520 n’omimi)—ma sikwa na ha rịgopụta.—De 2:13, 14, 24.

N’ikpeazụ, ndị Izrel rutere Ugwu Nibo. Miriam anwụworị na Kedesh, Erọn nwụkwara n’Ugwu Họọ. Ugbu a kwa Mozis nwụrụ na nso ala ahụ ọ chọsiworo ike ịbanye. (De 32:48-52; 34:1-5) Ibu ọrụ nke iduru ụmụ Izrel banye n’ala ahụ dịkwasịziri n’ubu Jọshụa, wee weta njem a malitere kemgbe afọ 40 ná njedebe.—Jos 1:1-4.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a A maghị kpọmkwem ihe ka ọtụtụ n’ebe ndị ha magasịrị ụlọikwuu.

[Map dị na peeji 9]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

Ụzọ Ụmụ Izrel Si Pụọ n’Ijipt

Ụzọ Ndị Izrel Si

A7 IJIPT

A5 Ramesis-?

B5 Sọkọt-?

CH5 Ịtam?

CH5 Paịhahaịrọt

D6 Mera

D6 Ilim

E6 ỌZARA SIN

E7 Dọfka

F8 Refidim

F8 Ugwu Saịnaị (Horeb)

F8 ỌZARA SAỊNAỊ

F7 Kibrọt-hateva

G7 Hazirọt

G6 Rimọn-pirez

G5 Risa

G3 Kedesh

G3 Bene-jeakan

G5 Họọ-hagidgad

GB5 Jọtbata

GB5 Abrona

GB6 Iziọn-giba

G3 Kedesh

G3 ỌZARA ZIN

GB3 Ugwu Họọ

GB3 Zalmona

GH3 Punọn

GH3 Aịye-abarim

GH2 MOAB

GH1 Daịbọn

GH1 Almọn- diblatem

GB1 Jeriko

[Ebe ndị ọzọ]

A3 GOSHEN

A4 Ọn

A5 Memfis (Nọf)

B3 Zoan

B3 Tapanhis

CH5 Migdọl

D3 SHỌỌ

D5 ỌZARA ỊTAM

F5 ỌZARA PERAN

G1 FILISTIA

G1 Ashdọd

G2 Geza

G2 Bia-shiba

G3 Azmọn

G3 NEGEB

GB1 Jeruselem

GB1 Hibrọn (Kiriat-aba)

GB2 Erad (nke Kenan)

GB4 SIA

GB4 IDỌM

GH7 MIDIAN

Okporo Ụzọ

Ụzọ gawara Ala Ndị Filistia

Ụzọ gawara Shọọ

GH4 Okporo Ụzọ Eze

Ụzọ Ndị Njem

Ụzọ El Haj

[Ugwu]

F8 Ugwu Saịnaị (Horeb)

GB3 Ugwu Họọ

GH1 Ugwu Nibo

[Mmiri]

E2 Oké Osimiri Mediterenian (Osimiri Ukwu)

D7/G7 Oké Osimiri Uhie

GH1 Oké Osimiri Nnu

[Osimiri]

A6 Osimiri Naịl

F3 N.M.I. Ijipt

GH2 Anọn

GH3 Zired

[Foto dị na peeji nke 8]

Ìgwè ndị njem gabigara ebe Ala Dịịrị Banye ná Mmiri na Saịnaị

[Foto dị na peeji nke 8]

Ndị Izrel kwụsịtụrụ tupu ha eruo Ugwu Saịnaị

[Foto dị na peeji nke 9]

E nwetara mmiri site n’iyi dị na Kedesh ma ọ bụ n’ebe dị ya nso

[Foto dị na peeji nke 9]

Izrel nile gabigara ndagwurugwu mmiri iyi Anọn