Ọtụtụ Nde Ndị Mmụọ E Kere Eke
Ọtụtụ Nde Ndị Mmụọ E Kere Eke
Bible na-agwa anyị na e nwere ọtụtụ ndị bụ mmụọ. Jehova n’onwe ya bụ mmụọ.—Jọn 4:24; 2 Ndị Kọrint 3:17, 18.
N’otu oge, Jehova nọ nanị ya n’eluigwe na ala dum. Mgbe ahụ ọ malitere ike ndị bụ mmụọ, ndị a na-akpọ mmụọ ozi. Ha dị ike, nweekwa ọgụgụ isi karịa mmadụ. Jehova kere ọtụtụ ndị mmụọ ozi; ohu Chineke, bụ́ Daniel, n’otu ọhụụ, hụrụ otu narị nde ndị mmụọ ozi.—Daniel 7:10; Ndị Hibru 1:7.
Chineke kere ndị mmụọ ozi ndị a ọbụna tupu o kee ụwa. (Job 38:4-7) Ọ dịghị nke ọ bụla n’ime ha dịworo ndụ n’ụwa ma nwụọ.
[Foto dị na peeji nke 7]
Mmụọ ukwu ahụ, bụ́ Jehova, kere ọtụtụ nde ndị bụ mmụọ