Ndị Mmụọ Ọjọọ Na-ekwu Okwu Ụgha na Ndị Nwụrụ Anwụ Dị Ndụ
Ndị Mmụọ Ọjọọ Na-ekwu Okwu Ụgha na Ndị Nwụrụ Anwụ Dị Ndụ
Bible na-ekwu na Setan “na-eduhie ụwa nile mmadụ bi.” (Mkpughe 12:9) Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya achọghị ka anyị kwere n’Okwu Chineke, bụ́ Bible. Ha na-agbalị ime ka ụmụ mmadụ kwere na ndị nwụrụ anwụ dị ndụ n’ebe ọzọ n’ógbè nke ndị bụ mmụọ. Ka anyị hụ ụzọ ha na-esi eme nke ahụ.
Okpukpe Ụgha
Ọtụtụ okpukpe na-akụzi na mmadụ ọ bụla nwere mkpụrụ obi nke na-agabiga banye n’ógbè nke ndị bụ mmụọ mgbe anụ ahụ nkịtị nwụsịrị. Ha na-ekwu na anụ ahụ na-anwụ anwụ, ma mkpụrụ obi adịghị anwụ anwụ. Ọzọkwa, ha na-ekwu na mkpụrụ obi apụghị ịnwụ anwụ ma ọlị, na ọ bụ ihe na-adịghị anwụ anwụ.
Ma Okwu Chineke adịghị akụzi nke ahụ. Bible na-egosi na mkpụrụ obi bụ mmadụ ahụ n’onwe ya, ọ bụghị ihe ọzọ dị adị n’ime mmadụ. Dị ka ihe atụ, n’ịkọwa okike nke Adam, Bible na-asị: “Jehova, bụ́ Chineke, wee were ájá sitere n’ala kpụọ mmadụ, o wee kuo ume ndụ nye n’oghere imi ya abụọ; mmadụ ahụ wee ghọọ mkpụrụ obi dị ndụ.” (Jenesis 2:7) Ya mere, e nyeghị Adam mkpụrụ obi; ọ bụ mkpụrụ obi.
A kpọkwara anụmanụ dị iche iche mkpụrụ obi.—Jenesis 1:20, 21, 24, 30.
Ebe okwu Bible ahụ bụ “mkpụrụ obi” pụtara mmadụ ahụ n’onwe ya, o kwesịghị ibụrụ anyị ihe ijuanya ịnụ na mkpụrụ obi pụrụ ịnwụ anwụ, na ha na-anwụkwa anwụ n’ezie. Akwụkwọ nsọ na-asị:
“Mkpụrụ obi ahụ nke na-emehie, ya onwe ya ga-anwụ.”—Ezikiel 18:4.
“Samsọn wee sị, Ka mụ onwe m [“mkpụrụ obi m,” NW] soro ndị Filistia nwụọ.”—Ndị Ikpe 16:30.
“Ò ziri ezi n’iwu ime ezi ihe, ma ọ bụ ime ihe ọjọọ, n’ụbọchị izu ike? ịzọpụta ndụ [“mkpụrụ obi,” NW] ma ọ bụ igbu egbu?”—Mak 3:4.
Akụkụ akwụkwọ nsọ ndị ọzọ na-egosi na a pụrụ ibibi mkpụrụ obi ebibi (Jenesis 17:14), a pụrụ iji mma agha gbuo ya (Joshua 10:37), a pụrụ ịtọgbu ya atọgbu (Job 7:15), mmiri pụkwara ịgbagbu ya (Jona 2:5). Otú a, mkpụrụ obi na-anwụ anwụ.
Ọ bụrụ na ị gụọ Bible site ná mmalite ruo n’ọgwụgwụ ya, ọ dịghị ebe ọ bụla ị ga-ahụ okwu ahụ bụ “mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ.” Mkpụrụ obi mmadụ abụghị mmụọ. Ozizi nke mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ abụghị ozizi nke Bible. Ọ bụ ozizi nke Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya. Jehova kpọrọ okwu ụgha nile nke okpukpe asị.—Ilu 6:16-19; 1 Timoti 4:1, 2.
Ndị Na-ajụ Mmụọ Ase
Ụzọ ọzọ Setan si na-eduhie ndị mmadụ bụ site ná ndị na-ajụ ndị mmụọ ase. Onye na-ajụ mmụọ ase bụ mmadụ nke nwere ike ịnata ozi kpọmkwem site n’ụwa nke ndị bụ mmụọ. Ọtụtụ ndị, gụnyere ndị na-ajụ mmụọ ase n’onwe ha kwenyere na ozi ndị a na-esite ná mmụọ nke ndị nwụrụ anwụ. Ma dị ka anyị hụworo na Bible, nke a apụghị ime eme.—Eklisiastis 9:5, 6, 10.
Ya mere, ọ̀ bụ n’aka òle ndị ka ozi ndị a si na-abịa? Ọ bụ ndị mmụọ ọjọọ ahụ n’onwe ha! Ndị mmụọ ọjọọ nwere ike ịhụta mmadụ mgbe ọ dị ndụ; ha maara otú onye ahụ si ekwu okwu, otú onye ahụ dị n’ile anya, ihe onye ahụ mere, na ihe ọ maara. Ya mere ọ dịịrị ha mfe iṅomi mmadụ ndị nwụworo anwụ.—1 Samuel 28:3-19.
Akụkọ Ụgha Dị Iche Iche
Otu ụzọ ọzọ Setan na-esi akwalite okwu ụgha ahụ banyere ndị nwụrụ anwụ bụ site n’akụkọ ụgha dị iche iche. Akụkọ ndị dị otú ahụ na-echigharịkarị ụmụ mmadụ pụọ n’eziokwu Bible.—2 Timoti 4:4.
N’Africa, e nwere ọtụtụ akụkọ banyere mmadụ ndị a hụworo ná ndụ mgbe ha nwụsịworo. Dị ka a pụrụ ịtụ anya ya, a na-ahụta onye ahụ n’ebe dị anya site n’ebe o biburu. Ma jụọ onwe gị, sị: ‘Ò yiri ihe ezi uche dị n’ime ya na ọ bụrụ na mmadụ nwere ike ịbịaghachi ná ndụ site n’ọnwụ, na ọ ga-abịaghachi n’ebe dị anya site n’ebe ezinụlọ na ndị enyi ya nọ?’
Ọzọkwa, ọ́ pụghị ịbụ na mmadụ ndị ahụ a hụrụ bụ nanị oyiyi ka ha yiri ndị ahụ nwụworonụ? Dị ka ihe atụ, ndị Kraịst abụọ na-eje ozi, bụ́ ndị nọ na-ekwusa ozi ọma n’otu ime obodo hụrụ otu agadi nwoke nke na-esogharị ha ruo hour ole na ole. Mgbe ha jụrụ ya ajụjụ, ha chọpụtara na nwoke ahụ chere na otu n’ime ndị ahụ na-eje ozi bụ nwanne ya nwoke nke nwụrụ afọ ole na ole tupu mgbe ahụ. N’eziokwu, ihe o chere ezighị ezi, ma ọ jụrụ ikwere na ihe ọ na-ekwu abụghị eziokwu. Cheedị nnọọ echiche ụdị akụkọ agadi nwoke ahụ mesịrị kọọrọ ndị enyi na ndị agbata obi ya!
Ọhụụ, Nrọ, na Olu Dị Iche Iche
Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ị maara banyere ihe ịtụnanya mmadụ dị iche iche hụworo, nụ, ma ọ bụ rọọ ná nrọ. Ahụmahụ dị otú ahụ ndị karịrị ihe na-eme eme ná ndụ na-eyikarị ndị ahụ na-enwe ha egwu. Marein, bụ́ onye bi n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Africa, na-anụ olu nke nne ya ochie nwụworonụ ọtụtụ ugbo ka ọ na-akpọ ya n’anyasị. N’ịbụ onye nke a tụrụ egwu, Marein na-eti mkpu, na-emetesị ezinụlọ ya dum. Mgbe e mesịrị, isi gbakara ya.
Ngwa, ọ bụrụ na ndị nwụrụ anwụ dị ndụ n’ezie, ọ̀ bụ ihe ezi uche dị n’ime ya na ha ga na-eyi ndị ha hụrụ n’anya egwu? Ọ dịghị ma ọlị. Ọ bụ n’aka ndị mmụọ ọjọọ ka ozi ndị dị otú a na-emerụ ahụ si abịa.
Gịnị banyere ozi ndị yiri ka hà na-enye aka, na-akasikwa obi? Dị ka ihe atụ, Gbassay, onye si Sierra Leone, na-arịa ọrịa n’otu mgbe. Ọ rọrọ nrọ ebe nna ya nke nwụworonụ mere ka ọ hụ ya anya. Ọ gwara ya ka ọ gaa n’otu ukwu osisi, kụrụ ahịhịa ya, gwakọta ya na mmiri, ma ṅụọ ya. Ọ gaghị agwa onye ọ bụla banyere nke a tupu o mee ya. O mere otú ahụ ahụ wee dị ya mma.
Otu nwanyị ọzọ kwuru na di ya mere ka ọ hụ ya anya n’otu anyasị mgbe ọ nwụsịworo. O kwuru na ahụ dị di ya mma nke ọma, na o yikwa uwe ndị mara mma.
Abụ Ọma 31:5) Ọ dịghị mgbe ọ bụla ọ ga-ekwere ịghọgbu ma ọ bụ iduhie anyị. Ọ bụ nanị ndị mmụọ ọjọọ na-eme nke ahụ.
Ozi na ọhụụ ndị dị otú ahụ na-eyi ka hà dị mma, na-enyekwa aka. Hà sitere n’aka Chineke? Ee e, ha esiteghị. Jehova bụ “Chineke nke eziokwu.” (Ma è nwere ndị mmụọ ọjọọ dị mma? Ee e. Ọ bụ ezie na ha pụrụ iyi ka hà na-enye aka mgbe ụfọdụ, ha nile bụ ndị ọjọọ. Mgbe Ekwensu gwara Iv okwu, o yiri onye bụ enyi. (Jenesis 3:1) Ma gịnị si na nke ahụ pụtara nwanyị ahụ mgbe o gesịrị ya ntị ma mee ihe ọ gwara ya ka o mee? Ọ nwụrụ.
Ị maara na ọ bụ ihe a na-ahụkarị, bụ́ ajọ mmadụ imeso ndị ọ chọrọ iduhie ma ghọgbuo omume dị ka onye bụ enyi. Otu ilu ndị Africa na-ekwu, sị, “Onye ọcha obi ojii.” Okwu Chineke na-asịkwa: “Setan onwe ya na-eme onwe ya ka o yie mmụọ ozi nke ìhè.”—2 Ndị Kọrint 11:14.
Chineke akwụsịwo iji nrọ, ọhụụ, ma ọ bụ olu dị iche iche site n’ụwa nke ndị bụ mmụọ na-ezitere ụmụ mmadụ ndị bi n’ụwa ozi. Ọ na-eduzi ha, na-enyekwa ha ntụziaka site na Bible, nke pụrụ ime ka mmadụ bụrụ “onye e meworo ka o zuo okè ịrụ ezi ọrụ nile ọ bụla.”—2 Timoti 3:17.
Otú a, mgbe Jehova na-adọ anyị aka ná ntị megide aghụghọ nile nke Ekwensu, ọ na-eme nke ahụ n’ihi na ọ hụrụ anyị n’anya. Ọ maara na ndị mmụọ ọjọọ bụ ndị iro dị ize ndụ.
[Foto dị na peeji nke 13]
Ụmụ mmadụ, anụmanụ, azụ, na nnụnụ—ha nile bụcha mkpụrụ obi
[Ebe E Si Nweta Foto]
Nke a dabeere n’otu akụkụ na foto ndị IRIS-EXPORT MEXICHROME mepụtara
[Foto dị na peeji nke 14]
Bible na-egosi na mkpụrụ obi abụghị ihe na-adịghị anwụ anwụ
[Foto dị na peeji nke 15]
Ndị mmụọ ọjọọ na-eme ka à ga-asị na ha bụ mmụọ nke ndị nwụrụ anwụ n’ezie
[Foto dị na peeji nke 16]
Ụfọdụ ndị na-eche na ha ahụwo ndị si n’ọnwụ lọghachite
[Foto dị na peeji nke 17]
Ndị mmụọ ọjọọ na-eduhie eduhie site ná nrọ, ọhụụ, na olu dị iche iche
[Foto dị na peeji nke 18]
Setan kwuru na Iv agaghị anwụ. Iv kweere ihe o kwuru, ma o mesịrị nwụọ