Òkè nke Ndị Nne na Nna
Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ịzụlite ụmụaka ịghọ ndị toro eto a haziri nke ọma n’ọha mmadụ nke taa abụghị ọrụ dị mfe.
ỤLỌ Ọrụ Mba Maka Ahụ Ike Ụbụrụ na United States bipụtara ihe sitere n’otu nnyocha e mere ndị nne na nna e lere anya na ha nwere ihe ịga nke ọma—ndị ụmụ ha, bụ́ ndị gafeworo 21 afọ, “bụcha ndị toro eto na-arụpụta ihe a na-ahụ anya bụ́ ndị ihe àmà na-egosi na ha na-adaba nke ọma n’ọha mmadụ anyị.” A jụrụ ndị nne na nna ndị a sị: ‘Na-adabere n’ahụmahụ nke gị, gịnị bụ okwu ndụmọdụ kasị mma ị pụrụ
inye ndị nne na nna ndị ọzọ?’ Nzaghachi a kasị nweta bụ ndị a: ‘Hụ n’anya nke ukwuu,’ ‘nye ọzụzụ n’ụzọ dị irè,’ ‘na-anọkọ ọnụ,’ ‘kụziere ụmụ gị ọdịiche dị n’etiti ihe ziri ezi na ihe na-ezighị ezi,’ ‘wulite nkwanyerịta ùgwù,’ ‘na-aṅa ha ntị n’ezie,’ ‘nye nduzi kama ikwu ogologo okwu,’ na ‘nwee ezi uche.’Otú ọ dị, ndị nne na nna adịghị arụ ọrụ nanị ha iji zụlite ndị ntorobịa a haziri nke ọma. Ndị nkụzi na-ekerekwa òkè dị mkpa na nke a. Otu onye ndụmọdụ ụlọ akwụkwọ nweworo ahụmahụ kwuru, sị: “Ihe mgbaru ọsọ bụ isi nke agụmakwụkwọ ụlọ akwụkwọ bụ iji kwado ndị nne na nna n’ịzụlite ndị ntorobịa ga-abara onwe ha uru bụ́ ndị tolitere nke ọma n’ọgụgụ isi, n’anụ ahụ, na ná mmetụta uche.”
Ya mere ndị nne na nna na ndị nkụzi na-ekerịta otu ihe mgbaru ọsọ—ịzụlite ndị ntorobịa ndị ga-emesịa ghọọ ndị toro eto tozuru okè na ndị a haziri ahazi bụ́ ndị na-anụ ụtọ ndụ ma nwee ike ịchọta ọnọdụ ha n’ọha mmadụ ha bi na ya.
Ndị Na-arụkọ Ọrụ Ọnụ, Ọ Bụghị Ndị Na-ama Aka
Otú ọ dị, nsogbu na-ebilite mgbe ndị nne na nna na-ekwenyereghị ndị nkụzi. Ụfọdụ ndị nne na nna, dị ka ihe atụ, achọdịghị ịma ma ọlị maka agụmakwụkwọ ụmụ ha; ndị ọzọ na-anwa ịma ndị nkụzi aka. N’ịtụle ọnọdụ a, otu akwụkwọ akụkọ France sịrị: “Ọ bụkwaghị nanị onye nkụzi bụ onye isi ọkwọ ụgbọ mmiri. Ndị nne na nna, ndị ihe ịga nke ọma ụmụ ha na-agba ara, na-atụchagharị akwụkwọ ndị e ji eje akwụkwọ, na-akatọsị ụzọ ndị e si akụzi ihe, na-ejikwa iwe emeghachi omume ngwa ngwa maka ihe mbụ nwa ha dara.” Omume ndị dị otú ahụ pụrụ ịkpaghasị usoro ihe ndị ka mkpa nye ndị nkụzi.
Ndịàmà Jehova na-eche na a na-emere ụmụ ha ihe ọma karị mgbe ndị nne na nna so ndị nkụzi na-emekọ ihe ọnụ, na-enwe ezi mmasị nke na-enye aka n’agụmakwụkwọ ụmụ ha. Mmekọ ihe ọnụ dị otú ahụ, ka ha kwenyere, dịkarịsịrị mkpa n’ihi na ọrụ nke onye nkụzi anọwo na-esiwanye ike.
Nsogbu Ndị Dị n’Ụlọ Akwụkwọ Taa
N’igosipụta ọha mmadụ nke ha bụ akụkụ ya, e kpuchighị ụlọ akwụkwọ pụọ ná nsogbu ndị ọha mmadụ n’ozuzu ya na-enwe. Nsogbu ọha na eze esiwanyewo ike n’ụzọ dị ngwa n’afọ ndị na-agafenụ. Ịkọwa ọnọdụ ndị dị n’otu ụlọ akwụkwọ na United States, akwụkwọ akụkọ The New York Times kọrọ, sị: “Ụmụ akwụkwọ na-ehi ụra n’ime klas, ha na-eji okwu ndị e dekwasịrị n’elu paseji ụlọ akwụkwọ eyi ibe ha egwu, ha na-elelị ụmụ akwụkwọ na-eme nke ọma. . . . Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ụmụ akwụkwọ nile na-anagide nsogbu ndị dị ka ilekọta ụmụ ọhụrụ, imeso ndị nne na nna e ji eji ihe na ịlanarị ime ihe ike ndị òtù ọjọọ. N’ụbọchị ọ bụla, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ otu ụzọ n’ime ụzọ ise na-agha akwụkwọ.”
Nke kasị na-akpata ụjọ bụ nsogbu
ime ihe ike n’ụlọ akwụkwọ nke na-arị elu ná mba dị iche iche. Ọgụ a na-alụ site n’oge ruo n’oge ndị na-agụnye ịkwa aka na inu aka abụrụwo nke e ji ịgbarịta égbè na ịma mma dochie. Ngwá agha juru ebe nile, mwakpo na-adịwanye njọ, ka ụmụaka na-echigharịkwuru ime ihe ike ngwa ngwa karị na n’afọ ndụ dị ala karị.Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ọ bụghị mba ọ bụla na-eche ọnọdụ ndị jọgburu onwe ya otú ahụ ihu. Otú ọ dị, ọtụtụ ndị nkụzi gburugburu ụwa na-ezute ọnọdụ e hotara n’akwụkwọ akụkọ France a na-ebipụta kwa izu bụ́ Le Point: “A dịkwaghị akwanyere onye nkụzi ùgwù; o nweghị ikike ọ bụla.”
Ụdị enweghị nkwanye ùgwù dị otú ahụ maka ịbụisi na-eche ụmụaka nile ajọ ihe ize ndụ n’ihu. Ya mere Ndịàmà Jehova na-agbalị ịkụbanye n’ime ụmụ ha nrubeisi na nkwanye ùgwù maka ịbụisi, àgwà ndị na-adịkarị ụkọ n’ụlọ akwụkwọ taa.