Ụkpụrụ Omume Ndị Kwesịrị Nkwanye Ùgwù
N’akụkọ ihe mere eme nile, ndị ikom na ndị inyom obi siri ike ewerewo nguzo na-emegide echiche ọha mmadụ nke oge ha. Ha ediwo mmekpọ ọnụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị, okpukpe, na agbụrụ, ọtụtụ mgbe na-enye ndụ ha maka ihe ha na-akwado.
NDỊ Kraịst oge mbụ nwere obi ike karịsịa. N’oge ajọ mkpagbu nke narị afọ atọ mbụ, ndị Rom na-ekpere arụsị gburu ọtụtụ n’ime ha n’ihi ịjụ ife onye ọchịchị alaeze ukwu. Mgbe ụfọdụ, a na-eguzobe ebe ịchụàjà n’ámá egwuregwu. Iji nwere onwe ha, nanị ihe ndị Kraịst gaara emewo bụ isure ntakịrị ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ iji nakwere ọdịdị ịbụ chi nke onye ọchịchị
alaeze ukwu. Otú ọ dị, ole na ole kwenyere. Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ họọrọ ịnwụ kama ịjụ okwukwe ha.N’oge a, ndị Kraịst bụ́ Ndịàmà Jehova na-ewere nguzo yiri nke ahụ n’ihe banyere nnọpụiche ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Dị ka ihe atụ, nguzo ha siri ike n’ihu ọchịchị Nazi bụ ihe akụkọ e mere ndekọ ya. Tupu na mgbe Agha Ụwa nke Abụọ gasịrị, ihe dị ka otu ụzọ n’ụzọ anọ nke Ndịàmà bụ́ ndị Germany nwụrụ, karịsịa n’ogige ịta ahụhụ dị iche iche, n’ihi na ha nọgidere na-anọpụ iche ma jụ ikwu “Heil Hitler.” E ji aka ike kewapụ ụmụaka n’ebe ndị nne na nna ha bụ́ Ndịàmà nọ. N’agbanyeghị nrụgide ahụ, ndị na-eto eto guzosiri ike ma jụ ịbụ ndị e metọrọ site ná nkụzi ndị na-esiteghị n’Akwụkwọ Nsọ bụ́ ndị ndị ọzọ nwara ịmanye ha.
Igbuchapụrụ Ọkọlọtọ
Ndịàmà Jehova abụghị ndị a na-echekarị mkpagbu dị ilu dị otú ahụ ihu taa. Ka o sina dị, nghọtahie na-ebilite mgbe ụfọdụ n’ihi mkpebi sitere n’ọchịchọ obi nke Ndịàmà na-eto eto mere ịhapụ ikere òkè n’ememe dị iche iche nke ịhụ mba n’anya, dị ka igbuchapụrụ ọkọlọtọ.
A na-akụziri ụmụ Ndịàmà Jehova ka ha ghara ịkụda ndị ọzọ aka igbuchapụrụ ọkọlọtọ; ọ dịịrị onye ọ bụla n’otu n’otu ikpebi. Otú ọ dị, nguzo nke Ndịàmà n’onwe ha siri ike: Ha adịghị egbuchapụrụ ọkọlọtọ nke mba ọ bụla. E bughị n’uche ma ọlị ka nke a gosipụta enweghị nkwanye ùgwù. Ha na-akwanyere ọkọlọtọ nke mba ọ bụla ha bi na ya ùgwù, ha na-egosikwa nke a site ná nrubeisi nye iwu dị iche iche nke mba ahụ. Ha adịghị etinye aka mgbe ọ bụla n’ụdị ihe omume Ndị Rom 13:1-7) Nke a kwekọrọ n’okwu a ma ama nke Kraịst: “Nyeghachinụ Siza ihe dịịrị Siza—nyeghachikwanụ Chineke ihe dịịrị Chineke.”—Matiu 22:21, Jerusalem Bible nke Katọlik.
ọ bụla na-emegide gọọmenti. N’ezie, Ndịàmà kwenyere na gọọmenti mmadụ ndị dị ugbu a mejupụtara “ndokwa Chineke” (NW) nke o kweworo ka ọ dịrị. Ya mere ha na-ele onwe ha anya dị ka ndị nọ n’okpuru iwu Chineke ịtụ ụtụ isi na ịkwanyere “ndị na-achị isi” dị otú ahụ ùgwù. (‘Ma mgbe ahụ, n’ihi gịnị,’ ka ụfọdụ pụrụ ịjụ, ‘ka Ndịàmà Jehova ji ghara ịdị na-asọpụrụ ọkọlọtọ site n’igbuchapụrụ ya?’ Ọ bụ n’ihi na ha na-ele igbuchapụrụ ọkọlọtọ anya dị ka ihe omume nke ofufe, ofufe dịkwaara Chineke; ha apụghị iji ọchịchọ obi ha nye onye ma ọ bụ ihe ọ bụla ọzọ e wezụga Chineke ofufe. (Matiu 4:10; Ọrụ 5:29) Ya mere, ha na-enwe ekele mgbe ndị nkụzi kwanyeere nkweta nke a ùgwù ma nye ụmụ Ndịàmà ohere ịrapagide n’ihe ndị ha kwenyere.
Ọ bụghị ihe ijuanya na ọ bụghị nanị Ndịàmà Jehova kwenyere na igbuchapụrụ ọkọlọtọ metụtara ofufe, dị ka okwu ndị na-esonụ na-egosi:
“Ọkọlọtọ ndị oge mbụ fọrọ nke nta ka ha bụrụ nnọọ akara okpukpe. . . . O yiri ka a na-achọ enyemaka okpukpe mgbe nile iji doo ọkọlọtọ mba nsọ.” (Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.)—Encyclopædia Britannica.
“Ọkọlọtọ, dị ka obe, dị nsọ. . . . Ụkpụrụ nduzi na nchịkwa ya ndị metụtara àgwà mmadụ n’ebe ụkpụrụ dị iche iche nke mba dị na-eji okwu ndị dị ike, na-akọwapụta ihe eme ihe, dị ka, ‘Ijere Ọkọlọtọ ozi,’ . . . ‘Ife Ọkọlọtọ,’ ‘Ịsọpụrụ Ọkọlọtọ.’” (Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.)—The Encyclopedia Americana.
“Ndị Kraịst jụrụ . . . ịchụrụ mmụọ onye ọchịchị alaeze ukwu [Rom] àjà—nke yitụrụ taa ka ịjụ igbuchapụrụ ọkọlọtọ ma ọ bụ ikwughachi okwu ịṅụ iyi ikwesị ntụkwasị obi.”—Those About to Die (1958), nke Daniel P. Mannix dere, peji nke 135.
Ọzọ, Ndịàmà Jehova ebughị n’uche mkparị maka gọọmenti ọ bụla ma ọ bụ ndị ọchịchị ya site n’ịjụ igbuchapụrụ ọkọlọtọ. Ọ bụ nanị na ha agaghị akpọ isiala, n’ụzọ nke ofufe, nye ma ọ bụ gbuchapụrụ ihe oyiyi nke na-anọchite anya Ọchịchị. Ha na-ele ya anya dị ka ihe ya na nguzo ụmụ okorobịa atọ bụ́ ndị Hibru weere yiri, bụ́ ndị jụrụ ịkpọ isiala n’ihu ihe a kpụrụ akpụ nke eze Babilọn bụ́ Nebukadneza guzobere ná ndagwurugwu Dura. (Daniel, isi nke 3) Ya mere mgbe ahụ, ka ndị ọzọ na-egbuchapụ ma na-aṅụ iyi ikwesị ntụkwasị obi, a na-akụziri ụmụ Ndịàmà Jehova ịgbaso akọ na uche ha e ji Bible zụọ. Ya mere, ha na-anọ duu ma jiri nkwanye ùgwù hapụ ikere òkè. N’ihi ihe ndị dị otú ahụ, ụmụ Ndịàmà na-ahọrọ ịhapụ ikere òkè mgbe a na-abụ ma ọ bụ na-akpọ abụ e ji eto mba.
Ihe Ruuru Ndị Nne na Nna
N’ụbọchị ndị a, ihe ka ọnụ ọgụgụ ná mba nile na-akwanyere ihe ruuru ndị nne na nna ùgwù inye ụmụ ha nkụzi okpukpe n’ikwekọ n’ihe ndị ha kwenyere na ha. Okpukpe nile na-akwado ihe a ruuru mmadụ, dị ka iwu ọchịchị a ka ji eme ihe na Chọọchị Katọlik na-eme ihe atụ ya: “Ebe ha nyeworo ụmụ ha ndụ, ndị nne na nna nwere ibu ọrụ siri nnọọ ike nke inye ha ọzụzụ, ha nwekwara ikike ime otú ahụ; ọ bụ ya mere o ji dịrị n’ubu ndị nne na nna karịsịa inye ụmụ ha ọzụzụ ndị Kraịst n’ikwekọ n’ozizi Chọọchị.”—Canon 226.
Ọ gwụla ihe Ndịàmà Jehova chọrọ. Dị ka ndị nne na nna na-ahụ n’anya, ha na-agbalị ịkụbanye ezi ụkpụrụ ndị Kraịst n’ime ụmụ ha ma kụnye n’ime ha ịhụnanya maka ndị agbata obi na nkwanye ùgwù maka ihe onwunwe nke ndị ọzọ. Ọ na-agụ ha agụụ ịgbaso ndụmọdụ Pọl onyeozi nyere ndị Kraịst n’Efesọs: “Ndị nne na nna, emesola ụmụ unu n’ụzọ ga-akpasu ha iwe iwe. Kama nke ahụ, jiri ọzụzụ na ntụziaka ndị Kraịst zụlite ha.”—Ndị Efesọs 6:4, Today’s English Version.
Ezinụlọ Ndị E Kewara n’Ụzọ Okpukpe
N’ezinụlọ ụfọdụ, nanị otu n’ime nne na nna bụ Onyeàmà Jehova. N’ọnọdụ dị otú ahụ, a na-agba onye nke bụ Onyeàmà ume ịnakwere ihe ruuru onye nke na-abụghị Onyeàmà izikwa ụmụaka ihe n’ikwekọ ná nkweta okpukpe ndị nke ya. Ụmụaka e kpughepụrụ nye echiche okpukpe ndị dị iche iche na-enweta mmetụta na-adị * N’ezie, ụmụaka nile aghaghị ikpebi okpukpe ha ga-agbaso. Dị ka o si adịkarị, ọ bụghị ndị ntorobịa nile na-ahọrọ ịgbaso ụkpụrụ okpukpe nke ndị mụrụ ha, ma hà bụ Ndịàmà Jehova ma ọ bụ na ha abụghị.
ghị mma dị nta, ma ọ bụrụ na ha na-enweta ma ọlị.Ihe Ruuru Ụmụaka nke Nnwere Onwe Akọ na Uche
I kwesịkwara ịmara na Ndịàmà Jehova na-eji akọ na uche onwe onye nke onye Kraịst akpọrọ oké ihe. (Ndị Rom, isi nke 14) Mgbakọba Maka Ihe Ruuru Nwata, nke Mgbakọ Ezumezu nke Òtù Mba Ndị Dị n’Otu nakweere na 1989, nakweere na ọ bụ ihe ruuru nwata inwe “nnwere onwe nke echiche, akọ na uche na okpukpe” na “inwere onwe ya ikwupụta uche ya na ime ka e chebara uche ya ahụ echiche n’okwu ma ọ bụ ihe omume ọ bụla na-emetụta nwata ahụ.”
Ọ dịghị ụmụaka abụọ ọ bụla yiri onwe ha n’ihe nile. Ya mere, ị pụrụ iji ezi uche tụọ anya ọdịiche ụfọdụ ná mkpebi ndị Ndịàmà na-eto eto ma ọ bụ ụmụaka ndị ọzọ na-eme mgbe a bịara n’ihe omume na ọrụ ụfọdụ n’ụlọ akwụkwọ. Obi siri anyị ike na ị ga-anakwerekwa ụkpụrụ nke nnwere onwe akọ na uche.
^ par. 18 Banyere ụmụ sitere n’alụmdi na nwunye ndị na-anọghị n’otu okpukpe, Steven Carr Reuben, Ph.D., n’akwụkwọ ya bụ́ Raising Jewish Children in a Contemporary World na-ekwu, sị: “Ụmụaka na-enwe mgbagwoju anya mgbe ndị nne na nna na-ebi ndụ ngọnarị, mgbagwoju anya, ime ihe nzuzo, na izere okwu ndị metụtara okpukpe. Mgbe ndị nne na nna na-adịghị ezo ọnụ, na-ekwu eziokwu, na-edo anya banyere ihe ndị ha kwere, ihe ndị ha ji kpọrọ ihe, na usoro dị iche iche nke ememe ha, ụmụaka na-etolite na-enwe ụdị ịnọ ná ntụkwasị obi na echiche nke uru onwe onye n’okwu okpukpe nke dị mkpa nke ukwuu ná ntolite nke ùgwù onwe onye ha dum na ịmata ọnọdụ ha n’ụwa.”