Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ụzọ Ndịàmà Jehova Si Ele Agụmakwụkwọ Anya

Ụzọ Ndịàmà Jehova Si Ele Agụmakwụkwọ Anya

Dị ka nne na nna nile, Ndịàmà Jehova na-eche banyere ọdịnihu ụmụ ha. Ya mere ha na-eji agụmakwụkwọ akpọrọ oké ihe. “Agụmakwụkwọ kwesịrị inyere ndị mmadụ aka ịghọ ndị òtù bara uru nke ọha mmadụ. O kwesịkwara inyere ha aka iwulite nghọta nke ihe nketa ọdịbendị ha na ibi ndụ na-eju afọ karị.”

DỊ KA nhota a sitere n’akwụkwọ The World Book Encyclopedia na-egosi, otu n’ime nzube bụ isi nke agụmakwụkwọ bụ ịzụ ụmụaka maka ndụ a na-adị kwa ụbọchị, nke na-agụnye ime ka ha nwee ike ilekọta mkpa dị iche iche nke ezinụlọ n’ọdịnihu. Ndịàmà Jehova kwenyere na nke a bụ ibu ọrụ dị nsọ. Bible n’onwe ya na-asị: “Ma ọ bụrụ na onye ọ bụla ebughị ụzọ cheere ndị nke aka ya ihe na-akpa ha, ma nke kachasị ndị ezinụlọ nke aka ya, ọ gọnarịwo okwukwe anyị, jọkarịakwa onye na-ekweghị ekwe ná njọ.” (1 Timoti 5:8) Afọ ndị e ji gaa akwụkwọ na-akwadebe ụmụaka maka ibu ọrụ ndị ha ga-ebu ná ndụ. N’ihi ya, Ndịàmà na-eche na e kwesịrị iji agụmakwụkwọ kpọrọ oké mkpa.

“Agụmakwụkwọ kwesịrị inyere ndị mmadụ aka ịghọ ndị òtù bara uru nke ọha mmadụ. O kwesịkwara inyere ha aka iwulite nghọta nke ihe nketa ọdịbendị ha na ibi ndụ na-eju afọ karị.”​—⁠The World Book Encyclopedia

Ndịàmà na-agbalịsi ike ibi ndụ kwekọrọ n’iwu Bible: “Ihe ọ bụla unu na-arụ, jirinụ obi unu dum rụọ ya, dị ka a ga-asị na unu na-arụrụ Onyenwe anyị, ọ bụghịkwa ụmụ mmadụ.” (Ndị Kọlọsi 3:23, Today’s English Version) Ụkpụrụ nke a metụtara akụkụ nile nke ndụ a na-adị kwa ụbọchị, gụnyere ụlọ akwụkwọ. N’ihi ya Ndịàmà na-agba ndị ha na-eto eto ume ịrụsi ọrụ ike na iji ọrụ ndị e kenyere ha n’ụlọ akwụkwọ kpọrọ mkpa.

“Ihe ọ bụla unu na-arụ, jirinụ obi unu dum rụọ ya, dị ka a ga-asị na unu na-arụrụ Onyenwe anyị, ọ bụghịkwa ụmụ mmadụ.”​—⁠Ndị Kọlọsi 3:23, Today’s English Version

Bible na-akụzikwa ịnọ n’okpuru iwu mba mmadụ bi na ya. Ya mere mgbe ịga akwụkwọ bụ iwu ruo otu afọ ndụ kpọmkwem, Ndịàmà Jehova na-eme ihe iwu a chọrọ.​—⁠Ndị Rom 13:​1-⁠7.

Ntụrụndụ dị mma, egwú, ihe omume ntụsara ahụ, mmega ahụ, na nleta nke ọbá akwụkwọ dị iche iche na ebe ndebe ihe mgbe ochie na-ekerecha òkè dị mkpa n’agụmakwụkwọ a haziri nke ọma

N’elelịghị ịdị mkpa nke ọzụzụ maka ndụ a na-adị kwa ụbọchị, Bible na-egosi na ọ bụghị nke a nanị bụ ihe mgbaru ọsọ nke agụmakwụkwọ, ọ bụghịkwanụ nke bụ isi. Agụmakwụkwọ gara nke ọma kwesịrị ịkụnye n’ime ụmụaka ọṅụ nke ibi ndụ ma nyere ha aka iwere ọnọdụ ha n’etiti ọha mmadụ dị ka ndị mmadụ a haziri nke ọma. N’ihi ya, Ndịàmà Jehova na-eche na nhọrọ nke ihe ndị a na-eme n’èzí ọnụ ụlọ akwụkwọ dị oké mkpa. Ha kwenyere na ntụrụndụ dị mma, egwú, ihe omume ntụsara ahụ, mmega ahụ, nleta nke ọbá akwụkwọ dị iche iche na ebe ndebe ihe mgbe ochie, na ihe ndị ọzọ, na-ekere òkè dị mkpa n’agụmakwụkwọ a haziri nke ọma. Ná ntụkwasị, ha na-akụziri ụmụ ha ịkwanyere ndị meworo okenye ùgwù na ịchọ ohere dị iche iche iji nyere ha aka.

Gịnị Banyere Inwetakwu Agụmakwụkwọ?

N’ihi nkà na ụzụ ọhụrụ, ohere inweta ọrụ na-anọgide na-agbanwe. N’ihi ya, ọtụtụ ndị na-eto eto aghaghị ịrụ ọrụ n’akụkụ ma ọ bụ n’ọrụ ndị ha na-enwebeghị ọzụzụ na ha kpọmkwem. Ebe ọ dị otú ahụ, àgwà ọrụ na ọzụzụ onwe onye ha, karịsịa ikike ha ikwekọ ná mgbanwe, ga-aba uru ọbụna karị nye ha. N’ihi ya, ọ ka mma ka ụmụ akwụkwọ ghọọ ndị toruworo ogo mmadụ nwere, dị ka onye edemede n’Oge Ntụte bụ́ Montaigne si kwuo ya, ‘isi a kwadebere nke ọma kama ịbụ isi a wụjuru ihe.’

Enweghị ọrụ, nke na-emetụta ma mba ndị bara ọgaranya ma ndị dara ogbenye, na-eyikarị ndị na-eto eto bụ́ ndị na-enweghị iru eru zuru ezu egwu. Ya mere, ọ bụrụ na ohere ọrụ emee ka ịgbakwụnye ọzụzụ ọzọ n’ọ̀tụ̀tụ̀ kasị ala iwu chọrọ dị mkpa, ọ dịịrị ndị nne na nna iduzi ụmụ ha n’ime mkpebi banyere inwetakwu agụmakwụkwọ, na-atụle ma uru ndị a ga-erite ma àjà ịgụkwu akwụkwọ ga-achọ ka a chụọ.

Otú ọ dị, o yikarịrị ka ị ga-ekwenye na ọganihu ná ndụ na-agụnye ihe karịrị nanị ụba ihe onwunwe. N’oge ndị a, ihe nile funarịrị ndị ikom na ndị inyom ndị ndụ ha dum mikpuworo n’ọrụ ha mgbe ọrụ ha funarịrị ha. Ụfọdụ nne na nna ejiriwo ndụ ezinụlọ ha na oge ha gaara eji soro ụmụ ha nọkọọ chụọ àjà, na-atụfu ohere ọma nke inyere ha aka itolite, n’ihi na ọrụ ego rikpuru ha.

N’ụzọ doro anya, agụmakwụkwọ a haziri nke ọma kwesịrị iburu n’uche na a chọrọ ihe karịrị ụba ihe onwunwe iji mee ka anyị nwee obi ụtọ n’ezie. Jisọs Kraịst sịrị: “E dewo ya: ‘Mmadụ adịghị adị ndụ nanị n’achịcha, kama n’okwu ọ bụla nke na-esite n’ọnụ Chineke.’” (Matiu 4:4, New International Version) Dị ka ndị Kraịst, Ndịàmà Jehova na-aghọta ịdị mkpa nke ịzụlite àgwà omume ọma na nke ime mmụọ nakwa ịkwadebe onwe ha maka ilekọta mkpa ha nke ihe ndị a na-ahụ anya.