Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Ịma Aka nke Ịdị Iche n’Okpukpe

Ihe Ịma Aka nke Ịdị Iche n’Okpukpe

Dị ka onye nkụzi, otu ihe ịma aka nke ndị nkụzi na narị afọ ndị gara aga na-echekebeghị ihu na-eche gị ihu​—⁠ịdị iche n’okpukpe.

N’OGE nile Mgbe Ụwa Na-emepechabeghị Anya, ụmụ amaala nke otu mba na-ekpekarị otu okpukpe. N’oge na-adịchabeghị anya dị ka na narị afọ nke 19, Europe na-ekpe nanị okpukpe ole na ole bụ isi: okpukpe Katọlik na okpukpe Protestant n’ebe ọdịda anyanwụ, okpukpe Orthodox na Alakụba n’ebe ọwụwa anyanwụ, na okpukpe ndị Juu. N’ụzọ ihe ịrụ ụka na-adịghị ya, ịdị iche iche juru ebe nile taa na Europe na gburugburu ụwa nile. Okpukpe ndị a na-amaghị ama agbanyewo mkpọrọgwụ, bụrụ ndị ụfọdụ ndị n’etiti ụmụ amaala n’onwe ha nakweere ma ọ bụ bụrụ ndị ndị si mba ọzọ kwafeta na ndị gbara ọsọ ndụ webatara.

N’ihi ya, taa ná mba ndị dị ka Australia, Britain, France, Germany, na United States, anyị na-ahụ ndị Alakụba, ndị Buddha, na ndị Hindu. N’otu oge ahụ, Ndịàmà Jehova, dị ka ndị Kraịst, na-ejesi ozi ike n’ihe karịrị 230 ala; ha aghọwo òtù okpukpe nke abụọ kasị ibu n’Itali na Spain. Na nke ọ bụla n’ime mba 14, ọnụ ọgụgụ ndị òtù ha na-arụsi ọrụ ike karịrị 100,000.​—⁠Lee igbe,  peji nke 15.

Ịdị iche iche nke okpukpe ndị e nwere ná mba pụrụ ịbụrụ onye nkụzi ihe ịma aka. Dị ka ihe atụ, a pụrụ iwelite ajụjụ ndị dị mkpa banyere ememe ndị na-ewu ewu: È kwesịrị ịmanye nwa akwụkwọ ọ bụla ime ememe nile​—⁠n’agbanyeghị okpukpe ya? Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ nwere ike ha agaghị ahụ ihe ọjọọ ọ bụla n’ememe ndị dị otú ahụ. Otú ọ dị, ọ̀ bụ na e kwesịghịkwa ịkwanyere echiche ezinụlọ ndị so n’ìgwè ndị ka nta ùgwù? E nwekwara ihe ọzọ a ga-atụle: Ná mba ebe iwu na-ekewa okpukpe na Ọchịchị, e tinyeghịkwa nkụzi okpukpe n’usoro ihe ndị a na-akụzi, ọ̀ bụ na ụfọdụ agaghị ele ya anya dị ka ihe na-ekwekọghị ekwekọ ime ka ememe ndị dị otú ahụ bụrụ iwu n’ụlọ akwụkwọ?

Ụbọchị Ọmụmụ

Nghọtahie pụrụ ọbụna ibilite banyere ememe ndị yiri ka ha enwetụghị ihe jikọrọ ha na okpukpe. Nke a bụ eziokwu banyere ụbọchị ọmụmụ, nke a na-eme n’ọtụtụ ụlọ akwụkwọ. Ọ bụ ezie na Ndịàmà Jehova na-akwanyere ikike ndị ọzọ nwere ime ememe ụbọchị ọmụmụ ùgwù, ihe ịrụ ụka adịghị ya na ị maara na ha na-ahọrọ ịhapụ ikere òkè n’ememe ndị dị otú ahụ. Ma eleghị anya ị maghị ihe kpatara ha na ụmụ ha jiworo kpebie ịhapụ ikere òkè n’ememe ndị a.

Le livre des religions (Akwụkwọ Okpukpe Dị Iche Iche), akwụkwọ nkà ihe ọmụma a na-ekesa nke ukwuu na France, na-akpọ omenala nke a ememe omenala ma denye ya n’etiti “ememe ndị na-emetụtaghị okpukpe.” Ọ bụ ezie na a na-ele ya anya taa dị ka omenala na-emetụtaghị okpukpe nke na-adịghị emerụ ahụ, ememe ụbọchị ọmụmụ gbara mkpọrọgwụ n’ezie n’ikpere arụsị.

Akwụkwọ bụ́ The Encyclopedia Americana (mbipụta nke 1991) na-asị: “Ọha mmadụ oge ochie nke Ijipt, Gris, Rom, na Peasia mere ememe ụbọchị ọmụmụ nke chi dị iche iche, ndị eze, na ndị a ma ama.” Ndị na-ede akwụkwọ bụ́ Ralph na Adelin Linton na-ekpughe ihe bụ isi kpatara nke a. N’akwụkwọ ha bụ́ The Lore of Birthdays (Nkụzi Omenala Banyere Ụbọchị Ọmụmụ), ha na-ede, sị: “Mesọpọtemia na Ijipt, ebe mmalite nke mmepeanya, bụkwa ala ndị mbụ ebe ụmụ mmadụ chetara ma nye ụbọchị ọmụmụ ha nsọpụrụ. Idebe ihe ndekọ ụbọchị ọmụmụ dị mkpa n’oge ochie n’ụzọ bụ isi n’ihi na ụbọchị ọmụmụ dị mkpa maka ikenye akara aka.” Njikọ nke a e jikọrọ ya na ịgụ kpakpando kpọmkwem bụ ihe na-akpata oké nchegbu nye onye ọ bụla na-ezere ịgụ kpakpando n’ihi ihe Bible na-ekwu banyere ya.​—⁠Aịsaịa 47:​13-⁠15.

Mgbe ahụ ọ bụghị ihe ijuanya na anyị na-agụ n’akwụkwọ The World Book Encyclopedia, sị: “Ndị Kraịst oge mbụ emeghị ememe ncheta ọmụmụ Ya [nke Kraịst] n’ihi na ha lere ememe ncheta ọmụmụ nke onye ọ bụla anya dị ka omenala ndị ọgọ mmụọ.”​—⁠Mpịakọta nke 3, peji nke 416.

Ndịàmà na-enwe obi ụtọ n’igwurikọ egwu

N’iburu ihe ndị dị n’elu n’uche, Ndịàmà Jehova na-ahọrọ ịhapụ ikere òkè n’ememe nile nke ụbọchị ọmụmụ. N’ezie ọmụmụ nke nwatakịrị bụ ihe omume obi ụtọ, nke dị ebube. Dị ka ihe sitere n’okike, ndị nne na nna nile na-aṅụrị ọṅụ ka ụmụ ha na-eto ma na-agbanwe ka afọ nke ọ bụla na-agabiga. Ndịàmà Jehova na-enwetakwa ọṅụ dị ukwuu n’igosipụta ịhụnanya ha maka ezinụlọ na ndị enyi ha site n’inye onyinye na igwurikọ egwu. Otú ọ dị, n’ihi mmalite nke ememe ncheta ọmụmụ, ha na-ahọrọ ime otú ahụ n’oge ndị ọzọ n’afọ dum.​—⁠Luk 15:​22-⁠25; Ọrụ 20:35.

Krismas

A na-agba Krismas gburugburu ụwa, ọbụna n’ọtụtụ mba na-abụghị nke ndị Kraịst. Ebe ihe ka ọnụ ọgụgụ n’okpukpe nile nke Krisendọm nakweere ụbọchị ezumike nke a, ọ pụrụ nnọọ iyi ihe na-eju anya na Ndịàmà Jehova na-ahọrọ ịhapụ ime ya. N’ihi gịnị ka o ji dị otú ahụ?

Dị ka ọtụtụ akwụkwọ nkà ihe ọmụma na-ekwu n’ụzọ doro anya, a kanyere ụbọchị ọmụmụ Jisọs ịbụ na December 25 n’ajụghị ase ka ọ dabakọọ n’ememe ndị Rom na-ekpere arụsị. Rịba ama nkwupụta ndị na-esonụ e wetara site n’akwụkwọ ntụaka dị iche iche:

“A maghị ụbọchị ọmụmụ Kraịst. Oziọma ndị ahụ ekwughị ma ụbọchị ma ọnwa ọ bụ.”​—⁠New Catholic Encyclopedia, Mpịakọta nke Abụọ, peji nke 656.

“Ememe Saturnalia na Rom nyere ihe ilereanya maka ihe ka ukwuu n’ime omenala erimeri nke oge Krismas.”—Encyclopædia of Religion and Ethics

“Ihe ka ukwuu n’omenala nile nke Krismas na-ewu ewu ugbu a na Europe, ma ọ bụ ndị e dekọrọ site n’oge ndị gara aga, abụghị ezigbo omenala ndị Kraịst, kama ha bụ omenala ndị ọgọ mmụọ ndị Chọọchị webataworo ma ọ bụ kwere ka ha dịrị. . . . Ememe Saturnalia na Rom nyere ihe ilereanya maka ihe ka ukwuu n’ime omenala erimeri nke oge Krismas.”​—⁠Encyclopædia of Religion and Ethics (Edinburgh, 1910), nke James Hastings bụ editọ ya, Mpịakọta nke Atọ, peji nke 608-609.

“A gbawo Krismas na December 25 n’ime chọọchị nile nke ndị Kraịst eri narị afọ nke anọ. N’oge ahụ, nke a bụ ụbọchị nke ememe ndị na-ekpere arụsị nke etiti oge oyi nke a na-akpọ ‘Ọmụmụ (Latin, natale) nke Anyanwụ,’ ebe ọ bụ na anyanwụ na-eyi ka a mụghachiri ya ka oge ụbọchị hà na-adịwanye ogologo. Na Rom, Chọọchị ahụ webatara omenala nke a na-ewu nnọọ ewu . . . site n’inye ya nghọta ọhụrụ.”​—⁠Encyclopædia Universalis, 1968, (French) Mpịakọta nke 19, peji nke 1375.

“Mmalite nke oriri Krismas bụ nke ime ihe dị iche site n’ememe ndị na-ekpere arụsị bụ́ Sol Invictus (Mithra) kpalitere. N’aka nke ọzọ, December 25, bụ́ ụbọchị etiti oge oyi, bụ nke e jikọrọ ya na ìhè nke tiwapụrụ n’ụwa site na Kraịst, e sikwa otú a bugharịa ihe atụ nke Sol Invictus ka ọ bụrụ nke Kraịst.”​—⁠Brockhaus Enzyklopädie, (German) Mpịakọta nke 20, peji nke 125.

Mgbe ha na-amụta ihe ndị bụ eziokwu banyere Krismas, olee otú ụfọdụ siworo meghachi omume? The Encyclopædia Britannica na-ekwu, sị: “Na 1644 ndị puritan nke England ji Òtù Ndị Ome Iwu machibido ime oriri ma ọ bụ ememe okpukpe ọ bụla, ná ndabere nke na ọ [Krismas] bụ oriri ndị ọgọ mmụọ, nyekwa iwu ka e jiri ibu ọnụ debe ya. Charles nke Abụọ tụteghachiri ememe ahụ, ma ndị Scotland rapagidere n’echiche ndị Puritan.” Ndị Kraịst oge mbụ agbaghị Krismas, Ndịàmà Jehova adịghịkwa agba ya taa ma ọ bụ na-ekere òkè n’ihe omume ndị e jikọrọ ha na Krismas.

Otú ọ dị, Bible na-ekwu okwu ọma banyere inye onyinye ma ọ bụ ịkpọ ezinụlọ na ndị enyi òkù ịbịa maka nri na-enye ọṅụ n’oge ndị ọzọ. Ọ na-agba ndị nne na nna ume ịkụziri ụmụ ha isi n’ezi obi na-emesapụ aka, kama inye onyinye nanị mgbe ọha na eze na-atụ anya ka e mee otú ahụ. (Matiu 6:​2, 3) A na-akụziri ụmụ Ndịàmà Jehova ikwe ka ndị ọzọ biri na ịkwanyere mmadụ ùgwù, nke a gụnyekwara ịnakwere ihe ruuru ndị ọzọ ịgba Krismas. N’akụkụ nke ha, ọ na-amasị ha mgbe a kwanyeere mkpebi ha nke ekereghị òkè n’ememe nile nke Krismas ùgwù.

Ememe Ndị Ọzọ

Ndịàmà Jehova na-ewere otu nguzo ahụ banyere ụbọchị ezumike ndị ọzọ nke okpukpe ma ọ bụ ndị na-abụchaghị maka okpukpe ndị na-ewere ọnọdụ n’oge afọ ije akwụkwọ n’ala dị iche iche, dị ka ememe nile nke June na Brazil, Epifani na France, Carnival na Germany, Setsubun na Japan, na Halloween na United States. Banyere ndị a ma ọ bụ ememe ndị ọzọ kpọmkwem a na-akpọghị aha n’ebe a, ndị nne na nna bụ́ Ndịàmà ma ọ bụ ụmụ ha ga-enwe obi ụtọ n’ezie ịza ajụjụ ọ bụla ị pụrụ inwe.