Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mmechi

Mmechi

NTỤLE zuru ezu nke ihe okpukpe Ndịàmà Jehova kwere na ha abụghị nzube nke broshuọ a. Kama nke ahụ, anyị agbalịwo ịkọwa ụfọdụ n’ime ụkpụrụ ndị Ndịàmà kwere na ha na igosi n’ụzọ doro anya ụdị ihe ndị dị n’ezinụlọ na-emetụta ụmụ akwụkwọ gị ma ọ bụrụ na otu n’ime nne na nna ha ma ọ bụ ha abụọ bụ Ndịàmà.

Ndịàmà Jehova na-elekwasị anya nke ukwuu ná ntolite ime mmụọ nke ụmụ ha. Obi sikwara ha ike na nke a na-enye aka ná ntolite ụmụ ha n’akụkụ ndị ọzọ. Ihe ndị ha kwenyere na ha na ụkpụrụ ndị ha na-agbaso na-enye ndụ ha nzube ma na-enyere ha aka iche nsogbu ndị ha na-enwe kwa ụbọchị ihu. Tinyere nke ahụ, nkwenkwe na ụkpụrụ ndị ahụ kwesịrị ịkwali ha ịgbalị ịbụ ụmụ akwụkwọ na-anụ ọkụ n’obi na ezigbo ụmụ amaala ná ndụ ha nile.

Ndịàmà na-agbalịsi ike inwe uche ziri ezi banyere ndụ, ya mere ha na-eji agụmakwụkwọ akpọrọ oké ihe. Ya mere, ọ bụ ọchịchọ ha isoro gị rụkọọ ọrụ ruo n’ike ha nile. N’akụkụ nke ha, n’ebe obibi ha na n’ebe ndị ha na-anọ efe ofufe gburugburu ụwa, ha ga-anọgide na-agba ụmụ ha ume ime òkè ha ná njikọ aka n’ọrụ nke a na-amịpụta mkpụrụ.