Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Nzube nke Broshuọ A

Nzube nke Broshuọ A

ỌKÀ ihe ọmụma ụwa bụ́ onye Netherlands bụ́ Spinoza dere, sị: “Agbalịwo m ịhapụ ịchị ihe ụmụ mmadụ na-eme ọchị, ịhapụ iruru ha újú, ma ọ bụ ịkpọ ha asị, kama nke ahụ ịghọta ha.” Dị ka onye nkụzi, ị na-eche ihe ịma aka nke ịgbalị ịghọta echiche, nzụlite, na nkwenkwe nke ụmụ akwụkwọ ị na-elekọta, gụnyere ụmụ akwụkwọ bụ́ ụmụ Ndịàmà Jehova. N’oge ụfọdụ, ụmụ akwụkwọ dị otú ahụ pụrụ iyi ka ha gbara iche n’okwu ụfọdụ. Ma mgbe o doro anya na omume ndị dị otú ahụ sitere ná nkwenkwe okpukpe na omume nke nwa akwụkwọ, ha kwesịrị ka i lebara ha anya. Watch Tower Bible and Tract Society (òtù ọrụ na-ebipụta akwụkwọ nke Ndịàmà Jehova) wepụtara broshuọ nke a, a hazikwara ya inyere gị aka ịghọta ụmụ akwụkwọ bụ́ Ndịàmà karị. Anyị nwere olileanya na ị ga-ewepụta oge dị mkpa iji jiri nlezianya gụọ ya.

Ịghọta nkwenkwe okpukpe nke onye ọzọ achọghị na ị ga-anakwere ma ọ bụ gbasoo ha, inye mmadụ ihe ọmụma abụghịkwa ime ndị na-eso ụzọ. Broshuọ nke a adịghị achọ ịmanye gị ma ọ bụ ụmụ akwụkwọ gị ịnakwere echiche dị iche iche nke okpukpe Ndịàmà. Ọchịchọ anyị bụ nanị inye gị ihe ọmụma banyere ụkpụrụ na nkwenkwe ndị ndị nne na nna nke ụfọdụ n’ime ụmụ akwụkwọ gị na-akụziri ha, ka o wee kara gị mfe ma ịghọta ụmụaka Ndịàmà ma iso ha rụkọọ ọrụ. Otú ọ dị, ihe a na-akụziri ụmụaka na ihe ha na-eme nwere ike ha agaghị ekwekọ mgbe nile, ebe ọ bụ na nwata nke ọ bụla na-amụta ịzụlite akọ na uche nke ya.

Dị ka ihe ka ọnụ ọgụgụ n’ime ndị nne na nna, Ndịàmà Jehova chọrọ ka ụmụ ha rite uru kachasịnụ site n’agụmakwụkwọ ha. Iji mezuo nke ahụ, ha na-akụziri ụmụ ha ikwenyere ndị nkụzi ha. N’aka nke ọzọ, ndị nne na nna bụ́ Ndịàmà na ụmụ ha na-enwe ekele mgbe ndị nkụzi mesoro ha ihe ná nghọta na nkwanye ùgwù.

Ndịàmà Jehova bụ ndị Kraịst a mazuru n’ụwa nile. Otú ọ dị, a na-aghọtahie ha mgbe ụfọdụ. Ya mere, olileanya anyị bụ na broshuọ nke a ga-enyere gị aka ịghọta ụmụaka Ndịàmà ị na-elekọta nke ọma karị. Karịsịa, anyị nwere olileanya na ị ga-ahụ ihe mere, n’ọnọdụ ụfọdụ kpọmkwem, ha pụrụ iji na-azọrọ ikike nke ịdị iche.