Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Usoro Ihe Omume Agụmakwụkwọ

Usoro Ihe Omume Agụmakwụkwọ

A ma Ndịàmà Jehova ama n’ụwa nile maka ọrụ nkụzi Bible ha.

N’IHI otú ha si were ọrụ nkụzi Bible ha n’ihe dị mkpa, ụfọdụ pụrụ iche na ha enweghị mmasị n’agụmakwụkwọ nkịtị. Ma ọ dịghị otú ahụ. Iji kụziere ndị ọzọ ihe, onye nkụzi aghaghị ibu ụzọ mụọ ihe, nke a na-achọkwa ọzụzụ na ntụziaka kwesịrị ekwesị. Ya mere tinyere iji ọmụmụ akwụkwọ nkịtị eme ihe nke ọma, Ndịàmà Jehova eri ọtụtụ afọ eritewo uru site n’usoro ihe omume agụmakwụkwọ na ụlọ akwụkwọ dị iche iche ndị Watch Tower Society na-eduzi. Ndị a enyeworo Ndịàmà na ndị ọzọ aka imewanye nke ọma n’uche, n’omume, na n’ime mmụọ.

Dị ka ihe atụ, n’ọtụtụ mba Ndịàmà echewo ihe ịma aka pụrụ iche ihu​—⁠ụzọ isi kụziere ndị nweworo ohere dị nta ma ọ bụ ndị na-enweghị ma ọlị inweta agụmakwụkwọ kwesịrị ekwesị ihe wee si otú ahụ ghara ịma ka e si agụ na ka e si ede. Iji gboo mkpa nke a, Watch Tower Society ahaziwo usoro ihe omume ịmụ ka e si agụ ma na-ede.

Na Nigeria, dị ka ihe atụ, Ndịàmà Jehova eduziwo klas ịgụ na ide ihe eri 1949. Ka ọ na-erule 1961, ọtụtụ puku ndị Nigeria esiwo na ya mụta ịgụ ihe, ihe ndekọ ndị e nwekwara na-egosi na n’agbata 1962 na 1994, a kụziiri ngụkọta nke 25,599 ndị ọzọ toruworo ogo mmadụ ịgụ na ide ihe na klas ndị a. Nchọpụta e mere n’isi nso a gosiri na ihe karịrị 90 pasent nke Ndịàmà Jehova na Nigeria maara ka e si agụ na ka e si ede, ma e jiri ya tụnyere ihe na-erughị 50 pasent nke ihe fọdụrụ n’ụba mmadụ ya. Na Mexico, Watch Tower Society eduziwo klas ịgụ na ide ihe dị iche iche eri 1946. N’ime 1994, a kụziiri ihe karịrị 6,500 mmadụ ịgụ na ide ihe. N’agbata 1946 na 1994, e nyeere ihe karịrị 127,000 mmadụ aka ịbụ ndị maara ka e si agụ na ka e si ede. A haziwokwa klas ịmụ ịgụ na ide ihe n’ọtụtụ mba ndị ọzọ, dị ka Bolivia, Cameroon, Honduras, na Zambia.

Ọtụtụ mgbe ndị nlekọta agụmakwụkwọ n’ala ebe ndị a haziworo ha anakwerewo usoro ihe omume ịmụ ịgụ na ide ndị dị otú ahụ. Dị ka ihe atụ, na Mexico otu onye ọrụ obodo dere, sị: “Enwere m ekele maka nkwado unu, n’aha gọọmenti steti a kwa, m na-enye unu ozi ekele ha si n’ezi obi maka ọrụ ọma unu na-aga n’ihu maka abamuru nke ndị mmadụ n’iwetara ndị na-amaghị ka e si agụ na ka e si ede ìhè nke ihe ọmụma. . . . M na-ekpere unu ekpere ọganihu n’ọrụ nkụzi unu.”

Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke

Ụmụ akwụkwọ n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke na-anata ọzụzụ n’ịgụ ihe na ikwu okwu n’ihu ọha

N’ihi na ha na-ewere ọrụ nkụzi Bible ha n’ihe dị oké mkpa, Ndịàmà Jehova na-agbalịsi ike imeziwanye ihe n’ikike ha ịkọwara ndị ọzọ nkụzi nile nke Bible. Iji nye ụdị enyemaka a, na nke ọ bụla n’ihe karịrị 78,000 ọgbakọ gburugburu ụwa, a na-enwe nzukọ a na-akpọ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke kwa izu. Ndị nile debanyere aha ha, ma hà bụ Ndịàmà ma ọ bụ na ha abụghị, na-eso n’usoro inye okwu dị mkpirikpi n’isiokwu e bu ụzọ họrọ n’ihu ndị na-ege ntị. N’agbanyeghị ihe bụ afọ ndụ ha, ụmụ akwụkwọ ahụ na-anara ndụmọdụ site n’ọnụ onye nduzi ná nzube nke ịzụ ha ná nkà dị iche iche nke ịgụ ihe na ikwu okwu n’ihu ọha. Ọbụna ndị kasị nwata, ngwa ngwa ha matara ka e si agụ ihe, pụrụ idebanye aha ma nata ọzụzụ a, nke na-abara ha uru n’akụkụ ndị ọzọkwa, gụnyere n’ọmụmụ akwụkwọ nkịtị ha. Ọtụtụ ndị nkụzi ekwuwo na ụmụ akwụkwọ Ndịàmà yiri ka ha na-akọwapụtakarị onwe ha nnọọ nke ọma.

A na-agbasi ịgụ akwụkwọ ume ike n’ime ọgbakọ ha, a na-agbakwa ezinụlọ nke ọ bụla ume n’otu aka ahụ inwe ọbá akwụkwọ ezinụlọ nke nwere ụdị akwụkwọ dị iche iche

Ọzọkwa, a na-agba ọgbakọ nke ọ bụla nke Ndịàmà Jehova ume inwe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ya, ma ọ bụ n’ebe nzukọ ya, ọbá akwụkwọ nwere ihe ndị na-enye aka ịmụ Bible, akwụkwọ ọkọwa okwu, na akwụkwọ ntụaka ndị ọzọ. Ndị nile na-abịa nzukọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze pụrụ iji ọbá akwụkwọ a mee ihe. A na-agbasi ịgụ akwụkwọ ume ike n’ime ọgbakọ ha, a na-agbakwa ezinụlọ nke ọ bụla ume n’otu aka ahụ inwe ọbá akwụkwọ ezinụlọ nke nwere ụdị akwụkwọ dị iche iche na-atụle mkpa ụmụaka na ndị okenye.

Ụlọ Akwụkwọ Ndị Ọzọ

Watch Tower Society na-eduzikwa ụlọ akwụkwọ dị iche iche maka ịzụ ndị ozi ala ọzọ, ma ụmụ nwoke ma ụmụ nwanyị, nakwa ụlọ akwụkwọ maka ịzụ ndị ikom nwere ibu ọrụ ije ozi n’ọgbakọ ebe ha bi. Ụlọ akwụkwọ ndị a bụ ihe àmà ndị ọzọ nke na Ndịàmà Jehova na-ewere agụmakwụkwọ n’ihe dị oké mkpa.