Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE IRI NA ISII

Na-eguzogide Ekwensu na Atụmatụ Aghụghọ Ya

Na-eguzogide Ekwensu na Atụmatụ Aghụghọ Ya

“Na-eguzogidenụ Ekwensu, ọ ga-agbapụkwa n’ebe unu nọ.”—JEMS 4:7.

1, 2. Ole ndị ka oge baptizim na-atọ ụtọ?

Ọ BỤRỤ na i jeerela Jehova ozi ruo ọtụtụ afọ, o nwere ike ịbụ na ị nụla ọtụtụ okwu baptizim ná mgbakọ anyị dị iche iche. N’agbanyeghị ugboro ole ị nọrọla mgbe a na-ekwu okwu baptizim, o nwere ike ịbụ na ọ na-emetụ gị n’ahụ́ mgbe ọ bụla ị hụrụ ndị nọ n’oche ihu n’ụlọ mgbakọ ka ha biliri ọtọ iji gosi na ha chọrọ ka e mee ha baptizim. Mgbe ahụ, obi na-atọ ndị niile na-ege ntị ụtọ, ha ejiri obi ha dum kụọ aka. Anya mmiri ọṅụ nwere ike iju gị n’anya ka ị na-ahụ ìgwè ndị ọzọ dị oké ọnụ ahịa ndị kpebirila ịkwado Jehova. Oge ndị dị otú ahụ na-atọ anyị ezigbo ụtọ!

2 Ọ bụ ezie na anyị na-ahụ ka a na-eme ndị mmadụ baptizim ugboro ole na ole n’afọ ná mgbakọ, ndị mmụọ ozi na-ahụ ya ọtụtụ ugboro karịa anyị. Chegodị echiche banyere ‘ọṅụ dị ukwuu na-adị n’eluigwe’ ka ha na-ahụ ka puku kwuru puku mmadụ na-esonyere nzukọ Jehova kwa izu n’ụwa dum! (Luk 15:7, 10) O doro anya na obi na-atọ ndị mmụọ ozi ụtọ ịhụ ka a na-eme ọtụtụ ndị ọhụrụ baptizim!—Hagaị 2:7.

EKWENSU “NA-EJEGHARỊ DỊ KA ỌDỤM NA-EBIGBỌ EBIGBỌ”

3. Gịnị mere Setan ji na-ejegharị “dị ka ọdụm na-ebigbọ ebigbọ,” gịnịkwa ka ọ chọrọ ime?

3 Otú ọ dị, e nwere ndị mmụọ na-anaghị enwe obi ụtọ mgbe ha hụrụ ndị a na-eme baptizim. Ọ na-afụ Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya ụfụ n’obi mgbe ha hụrụ ka puku kwuru puku mmadụ na-agbakụta ụwa a rụrụ arụ azụ. A sị ka e kwuwe, Setan turu ọnụ na ihe mere ndị mmadụ ji ejere Jehova ozi abụghị n’ihi na ha hụrụ ya n’anya n’ezie. O tukwara ọnụ na ọ dịghị mmadụ ọ bụla ga-ekwesị ntụkwasị ma ule tara akpụ bịara ya. (Job 2:4, 5) Mgbe ọ bụla mmadụ kpebiri ịrara onwe ya nye Jehova, o gosila na Setan ghara ụgha. Ọ na-adị ka à na-agba Setan aka ntị ọtụtụ puku ugboro kwa izu n’afọ. Ka a sịkwa ihe mere o ji “na-ejegharị dị ka ọdụm na-ebigbọ ebigbọ, na-achọ onye ọ ga-eripịa”! (1 Pita 5:8) Ọ na-agụsi “ọdụm” a agụụ ike iripịa anyị n’ụzọ ime mmụọ, mee ka anyị mebie mmekọrịta anyị na Chineke ma ọ bụkwanụ mee ka anyị ghọọ ndị iro Chineke.—Abụ Ọma 7:1, 2; 2 Timoti 3:12.

Mgbe ọ bụla mmadụ raara onwe ya nye Jehova, e mee ya baptizim, ọ na-egosi na Setan bụ onye ụgha

4, 5. (a) Olee ihe abụọ dị mkpa Jehova napụrụ Setan ike ime? (b) Gịnị kwesịrị ime ka obi sie ezi Onye Kraịst ike?

4 Ọ bụ ezie na anyị nwere onye iro dị obi ọjọọ, anyị ekwesịghị ịtụ ụjọ. N’ihi gịnị? N’ihi na ọ dị ihe abụọ dị mkpa Jehova napụrụ ‘ọdụm a na-ebigbọ ebigbọ’ ike ime. Olee ihe abụọ ọ bụ? Nke mbụ bụ na Jehova buru amụma na “oké ìgwè mmadụ” bụ́ ezi Ndị Kraịst ga-alanahụ ‘oké mkpagbu ahụ’ na-abịanụ. (Mkpughe 7:9, 14) Amụma Chineke buru ga-emezurịrị. N’ihi ya, Setan n’onwe ya ma na ya enweghị ike ịrata ndị Chineke niile.

5 Ihe otu n’ime ndị kwesịrị ntụkwasị obi n’ebe Chineke nọ n’oge ochie kwuru mere ka anyị ghọta ihe ọzọ mere Setan enweghị ike ịrata ndị Chineke niile. Azaraya onye amụma gwara Eze Esa, sị: “Jehova ga-anọnyere unu ma ọ bụrụhaala na unu adịnyere ya.” (2 Ihe E Mere 15:2; 1 Ndị Kọrịnt 10:13) Ọtụtụ ihe atụ ndị dị na Baịbụl na-egosi na n’oge ochie, Setan eripịalighị ohu Chineke ọ bụla nke nọ Chineke nso mgbe niile. (Ndị Hibru 11:4-40) Taa, Onye Kraịst ọ bụla nke nọ Chineke nso ga-eguzogideli Ekwensu ma merie ya. N’eziokwu, Okwu Chineke mesiri anyị obi ike, sị: “Na-eguzogidenụ Ekwensu, ọ ga-agbapụkwa n’ebe unu nọ.”—Jems 4:7.

“ANYỊ NWERE MGBA . . . MEGIDE ÌGWÈ NDỊ MMỤỌ ỌJỌỌ”

6. Olee otú Setan si alụso Onye Kraịst ọ bụla ọgụ?

6 Setan enweghị ike imeri n’ọgụ ihe atụ ahụ, ma o nwere ike iripịa onye ọ bụla n’ime anyị ma ọ bụrụ na onye ahụ amụghị anya. Setan ma na ya nwere ike iripịa anyị ma ọ bụrụ na ya emee ka mmekọrịta anyị na Jehova ghara isi ike. Olee otú Setan si agbalị ime ya? Site n’ịlụsosi anyị ọgụ ike, site n’ịlụso anyị ọgụ n’otu n’otu, nakwa site n’aghụghọ ya. Ka anyị tụlee ụzọ atọ a bụ́ isi Setan si alụso anyị ọgụ.

7. Gịnị mere Setan ji na-alụsosi ndị Jehova ọgụ ike?

7 Ịlụsosi anyị ọgụ ike. Jọn onyeozi kwuru, sị: “Ụwa dum dị n’aka ajọ onye ahụ.” (1 Jọn 5:19) O ji ihe ahụ o kwuru dọọ ezi Ndị Kraịst niile aka ná ntị. Ebe ọ bụ na Setan eripịaala ụmụ mmadụ niile na-anaghị asọpụrụ Chineke n’ụwa a, o lekwasịziri ndị ọ na-enwetabeghị anya ma na-alụsosi ha ọgụ ike, ya bụ, ndị Jehova. (Maịka 4:1; Jọn 15:19; Mkpughe 12:12, 17) Ọ na-ewe oké iwe n’ihi na ọ ma na oge fọọrọ ya dị ntakịrị. Ya mere, ọ na-alụsosi anyị ọgụ ike. Taa, anyị na-atụ anya ọgụ ikpeazụ ọ ga-eji obi ọjọọ lụso anyị iji mebie mmekọrịta anyị na Chineke. N’ihi ya, karịa mgbe ọ bụla ọzọ, anyị kwesịrị ‘ịmata ihe oge nyere ugbu a, iji mata ihe anyị kwesịrị ime.’—1 Ihe E Mere 12:32.

8. Gịnị ka Pọl onyeozi bu n’uche mgbe o kwuru na anyị nwere “mgba” anyị na ndị mmụọ ọjọọ na-agba?

8 Ịgbaso anyị mgba n’otu n’otu. Pọl onyeozi dọrọ Ndị Kraịst ibe ya aka ná ntị, sị: “Anyị nwere mgba . . . megide ìgwè ndị mmụọ ọjọọ n’ebe ndị dị n’eluigwe.” (Ndị Efesọs 6:12) Gịnị mere Pọl ji kpọọ ya “mgba”? N’ihi na ọ pụtara ọgụ i jide m mụ ejide gị, na ọgụ a na-alụ ihu na ihu. N’ihi ya, ihe Pọl na-eme ka anyị ghọta n’ihe ahụ o kwuru bụ na onye ọ bụla n’ime anyị na ndị mmụọ ọjọọ na-agba mgba. Ma ànyị bi ná mba ebe ndị mmadụ kweere na ndị mmụọ ọjọọ dị ma ọ bụ na anyị ebighị, anyị kwesịrị icheta na mgbe anyị raara onwe anyị nye Jehova, e nwere ike ikwu na anyị abanyela n’ọgbọ mgba ahụ. Ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, malite mgbe Onye Kraịst ọ bụla raara onwe ya nye Chineke, o nweghị ike ịgbanahụ mgba ahụ. Ka a sịkwa ihe mere Pọl ji gbaa Ndị Kraịst nọ n’Efesọs ume ugboro atọ ka ha ‘guzosie ike’!—Ndị Efesọs 6:11, 13, 14.

9. (a) Gịnị mere Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya ji eji “atụmatụ aghụghọ” dị iche iche agbalị ịrata ndị mmadụ? (b) Gịnị mere Setan ji agbalị imebi echiche anyị, oleekwa otú anyị ga-esi eguzogide mgbalị ya? (Gụọ  igbe dị na peeji nke 192-193.) (ch) Olee atụmatụ aghụghọ ya anyị ga-eleba anya ugbu a?

9 Atụmatụ aghụghọ. Pọl gbara Ndị Kraịst ume ka ha guzogide “atụmatụ aghụghọ” Setan. (Ndị Efesọs 6:11) Ghọta na okwu Pọl gosiri na atụmatụ Setan dị ọtụtụ. Ndị mmụọ ọjọọ na-esi ụzọ aghụghọ dị iche iche alụso anyị ọgụ—iji rata anyị. Ụfọdụ Ndị Kraịst eguzosiela ike mgbe otu ọnwụnwa bịaara ha. Ma ka oge na-aga, ha dara mgbe ụdị ọnwụnwa ọzọ bịaara ha. N’ihi ya, Ekwensu na ndị mmụọ ọjọọ ya na-eleru omume onye ọ bụla n’ime anyị anya ka ha mata ebe anyị na-adịghị ike. Ha na-elekwasịzi anya n’ebe ọ bụla anyị na-adịghị ike ma lụso anyị ọgụ ka ha mebie mmekọrịta anyị na Chineke. Ma, obi dị anyị ụtọ na anyị maara ọtụtụ ụzọ Ekwensu si alụso anyị ọgụ, n’ihi na Baịbụl kọwara ụzọ ndị ahụ. (2 Ndị Kọrịnt 2:11) N’akwụkwọ a, anyị ebula ụzọ leba anya n’aghụghọ ya ndị dị ka ịhụ ihe onwunwe n’anya, mkpakọrịta ọjọọ, na mmekọahụ rụrụ arụ. Ugbu a, ka anyị leba anya n’atụmatụ aghụghọ ọzọ nke Setan, ya bụ, mgbaasị.

IME MGBAASỊ BỤ ỊGHỌ AGHỤGHỌ

10. (a) Gịnị bụ mgbaasị? (b) Olee otú Jehova si ele mgbaasị anya, oleekwa otú i si ele ya anya?

10 Ime mgbaasị bụ mmadụ na ndị mmụọ ọjọọ imekọ ihe. Ụzọ ụfọdụ e si eme mgbaasị bụ ịgba afa, ime anwansi, ịkọ ndị ọzọ ọgwụ, na ịjụ ndị nwụrụ anwụ ase. Dị ka anyị ma nke ọma, Jehova weere mgbaasị dị ka “ihe rụrụ arụ.” (Diuterọnọmi 18:10-12; Mkpughe 21:8) Ebe ọ bụ na anyị kwesịrị ‘ịkpọ ihe ọjọọ asị,’ anyị agaghị echetụdị n’echiche anyị na ndị mmụọ ọjọọ ịkpakọrịta. (Ndị Rom 12:9) Nke ahụ ga-abụ ịgba Nna anyị nke eluigwe bụ́ Jehova mgba okpuru n’ezie!

11. Gịnị mere ọ ga-eji bụrụ na Setan enwetala ezigbo mmeri ma o mee ka anyị tinye aka ná mgbaasị? Nye ihe atụ.

11 Otú ọ dị, Setan kpebisiri ike ime ka ụfọdụ n’ime anyị tinye aka ná mgbaasị n’ihi na ọ ma na ime otú ahụ bụ ịgba Jehova mgba okpuru. Mgbe ọ bụla Setan mere ka Onye Kraịst tinye aka ná mgbaasị, o nwetala ezigbo mmeri. N’ihi gịnị? Chee echiche banyere ihe atụ a: Ọ bụrụ na e mee ka onye agha hapụ ndị agha ibe ya, gbawa ha mgba okpuru ma sonyere ndị agha ọzọ bụ́ ndị iro, obi ga-atọ onyeisi ndị agha ahụ bụ́ ndị iro ụtọ. O nwere ike iji onye agha ahụ mere ihe ngosi ọ ga-eji na-akparị onyeisi ndị agha nke ọzọ. Otú ahụkwa, ọ bụrụ na Onye Kraịst etinye aka ná mgbaasị, ọ pụtara na ọ kpachaara anya hapụ Jehova ma mee Setan onyeisi ya. Chegodị echiche obi ụtọ Setan ga-enwe iji onye hapụrụ Jehova mere ihe ngosi o nwetara n’agha! Ọ̀ dị onye ọ bụla n’ime anyị chọrọ ka Ekwensu nweta ụdị mmeri ahụ? Tụfịakwa! Anyị abụghị ndị sabo.

IJI AJỤJỤ EME KA E NWEE OBI ABỤỌ

12. Olee ụzọ Setan si eme ka anyị gbanwee otú anyị si ele mgbaasị anya?

12 Ọ bụrụhaala na anyị kpọrọ mgbaasị asị, Setan agaghị ejili ya nweta anyị. N’ihi ya, ọ ma na tupu ya enweta anyị, na ya ga-agbanwe echiche anyị. Olee otú o si eme ya? Ọ na-achọ ụzọ ọ ga-esi megharịa Ndị Kraịst anya ka ụfọdụ n’ime ha chewe na “ihe ọma bụ ihe ọjọọ, na ihe ọjọọ bụ ihe ọma.” (Aịzaya 5:20) Iji mee otú ahụ, Setan na-ejikarị otu n’ime ụzọ ndị ọ na-eji enweta ndị mmadụ kemgbe ụwa, ya bụ, iji ajụjụ eme ka e nwee obi abụọ.

13. Olee otú Setan sirila jiri ajụjụ gbalịa ime ka e nwee obi abụọ?

13 Legodị otú Setan si jụọ ajụjụ n’oge ochie. N’Iden, ọ jụrụ Iv, sị: “Ọ̀ bụ eziokwu na Chineke sịrị unu erila mkpụrụ si n’osisi ọ bụla dị n’ubi a?” N’oge Job, mgbe ndị mmụọ ozi nwere nzukọ n’eluigwe, Setan jụrụ, sị: “Ọ̀ bụ n’efu ka Job na-atụ egwu Chineke?” Mgbe Jizọs malitere ije ozi n’ụwa, Setan mara Kraịst aka, sị: “Ọ bụrụ na ị bụ ọkpara Chineke, gwa nkume ndị a ka ha ghọọ achịcha.” Legodị! Na nke Jizọs, Setan asọghị anya ịkwa Jehova emo site n’ikwughachi okwu Jehova kwuru n’ihe dị ka izu isii tupu mgbe ahụ, sị: “Onye a bụ Ọkpara m, onye m hụrụ n’anya, onye ihe ya masịrị m”!—Jenesis 3:1; Job 1:9; Matiu 3:17; 4:3.

14. (a) Olee otú Setan na-esi eji atụmatụ ya eme ka ndị mmadụ nwewe obi abụọ banyere mgbaasị? (b) Gịnị ka anyị ga-eleba anya ugbu a?

14 Taa, Ekwensu na-eji ihe yiri ya agbalị ime ka ndị mmadụ nwee obi abụọ ma mgbaasị ọ̀ bụ ihe ọjọọ. Ọ dị mwute na o meela ka ụfọdụ Ndị Kraịst nwewe obi abụọ. Ha amalitela iche na ụdị mgbaasị ụfọdụ adịchaghị njọ. E nwere ike ikwu na ha na-eche, sị, ‘Ọ̀ bụ eziokwu na ọ bụ ihe ọjọọ?’ (2 Ndị Kọrịnt 11:3) Olee otú anyị ga-esi nyere ndị dị otú ahụ aka ịgbanwe echiche ha? Olee ihe anyị ga-eme ka atụmatụ Setan ghara inweta anyị? Iji saa ajụjụ ndị a, ka anyị leba anya n’ebe abụọ Setan jirila aghụghọ webata mgbaasị na ha, ya bụ, ntụrụndụ na ịgwọ ọrịa.

IJI ỌCHỊCHỌ ANYỊ NA MKPA ANYỊ ESIRI ANYỊ ỌNYÀ

15. (a) Olee otú ọtụtụ ndị si ele mgbaasị anya n’ala Bekee? (b) Olee otú echiche ndị ụwa banyere mgbaasị sirila megharịa ụfọdụ Ndị Kraịst anya?

15 N’ala Bekee, ọ dịchaghị ihe ndị mmadụ ji anwansi, amoosu na ụdị mgbaasị ndị ọzọ kpọrọ. Na fim, n’akwụkwọ, n’ihe a na-egosi na TV, nakwa n’egwuregwu kọmputa, a na-eme ka ime mgbaasị yie ihe egwuregwu, ihe ziri ezi, na ihe na-enweghị ihe o mere. Ụfọdụ fim na akwụkwọ ndị kọrọ akụkọ banyere ime anwansi eriela ndị mmadụ isi ma mee ka ha nwee òtù na-akwado ya. O doro anya na ndị mmụọ ọjọọ emeela ka ndị mmadụ leghara nsogbu ndị ime anwansi na-akpata anya. Nke ahụ ò metụtala Ndị Kraịst? Ee, o metụtala otú ụfọdụ ndị si eche echiche. Olee otú o sirila metụta echiche ha? Dị ka ihe atụ, mgbe otu Onye Kraịst lechara otu fim metụtara ime anwansi, ọ sịrị, “Elere m fim ahụ, ma emeghị m mgbaasị.” Gịnị mere echiche dị otú ahụ ji dị ize ndụ?

16. Gịnị mere o ji dị njọ ịhọrọ ntụrụndụ ndị metụtara anwansi?

16 Ọ bụ ezie na e nwere ihe dị iche n’ime mgbaasị na ile ya ele, nke ahụ apụtaghị na ile mgbaasị enweghị ihe o mere. N’ihi gịnị? Chegodị echiche: Okwu Chineke kwuru na Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya enweghị ike ịma ihe dị anyị n’obi. * N’ihi ya, dị ka anyị kwuru ná mmalite, ndị mmụọ ọjọọ na-eleru anya ala n’ihe ndị anyị na-eme, ma ụdị ntụrụndụ na-amasị anyị, iji mata ihe anyị na-eche na ebe anyị na-anaghị eme nke ọma n’ofufe Chineke. Ọ bụrụ na àgwà Onye Kraịst egosi na fim ma ọ bụ akwụkwọ ndị metụtara ịgba afa, ịkọ ọgwụ, omume onye mmụọ ọjọọ ji ma ọ bụ ihe ọzọ metụtara ndị mmụọ ọjọọ na-atọ ya ụtọ, ọ na-akpọ ndị mmụọ ọjọọ òkù. Ihe ọ pụtara bụ na ọ na-egosi ha ebe ọ na-anaghị emezi emezi! Ihe ndị mmụọ ọjọọ ga-eme bụ isi ebe ahụ o gosiri ha lụsosie ya ọgụ ike ruo mgbe ha meriri ya. N’ezie, e nwere ụfọdụ ndị ntụrụndụ metụtara anwansi mere ka ha malite inwe mmasị ná mgbaasị. O meela ka ha mewe mgbaasị.—Ndị Galeshia 6:7.

Rite uru n’enyemaka Jehova mgbe ị na-arịa ọrịa

17. Olee atụmatụ aghụghọ nke Setan nwere ike iji siere ndị na-arịa ọrịa ọnyà?

17 Mmasị anyị nwere ná ntụrụndụ abụghị naanị ihe Setan ji esiri anyị ọnyà, kama ọ na-ejikwa ịgwọ ọrịa esiri anyị ọnyà. Olee otú o si eme ya? Onye Kraịst ọrịa ya na-ekweghị ala ala n’agbanyeghị mgbalị niile o mere ịgwọ ya nwere ike ịda mbà n’obi. (Mak 5:25, 26) Nke ahụ nwere ike inye Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya ohere magburu onwe ya isiri onye ahụ ọnyà. Ha ma nke ọma na Okwu Chineke dọrọ anyị aka ná ntị ka anyị ghara ịchọ “enyemaka nke ndị na-eme ajọ ihe.” (Aịzaya 31:2) Iji mee ka Onye Kraịst ghara irube isi n’aka ná ntị ahụ Baịbụl dọrọ, ndị mmụọ ọjọọ nwere ike ịnwa onye ọrịa ahụ itinye aka n’ọgwụ ndị metụtara “ime anwansi” ma ọ bụ mgbaasị n’ihi amaghị ihe ọzọ ọ ga-eme. Ime otú ahụ jọgburu onwe ya. Ọ bụrụ na ndị mmụọ ọjọọ ejiri atụmatụ aghụghọ ahụ rata onye ọrịa ahụ, ọ ga-eme ka mmekọrịta ya na Chineke ghara isi ike. Olee otú nke ahụ ga-esi eme?

18. Olee otú e si achọpụta ọrịa, na otú e si agwọ ọrịa, nke Onye Kraịst kwesịrị izere, n’ihi gịnịkwa?

18 Jehova dọrọ ndị Izrel malitere “ime anwansi” aka ná ntị, sị: “Mgbe unu gbasara ọbụ aka unu, m na-ewepụ anya m n’ebe unu nọ. Ọ bụ ezie na unu na-ekpe ọtụtụ ekpere, adịghị m ege ntị.” (Aịzaya 1:13, 15) N’ezie, anyị chọrọ izere ihe ọ bụla nwere ike ime ka Chineke ghara ige ntị n’ekpere anyị, na ihe nwere ike ime ka Jehova kwụsị inyere anyị aka, nke ka nke, mgbe anyị na-arịa ọrịa. (Abụ Ọma 41:3) N’ihi ya, ọ bụrụ na e nwere ihe gosiri na otú a ga-esi chọpụta ihe ezi Onye Kraịst na-arịa ma ọ bụ otú a ga-esi gwọọ ya ọrịa metụtara mgbaasị, o kwesịrị ịjụ ya. * (Matiu 6:13) Ya jụ ya, obi ga-esi ya ike na Jehova ga na-akwado ya.—Gụọ igbe dị na peeji nke 194, bụ́ “ Ọ̀ Bụ Mgbaasị n’Eziokwu?

EBE A NA-AKỌSA AKỤKỌ BANYERE NDỊ MMỤỌ ỌJỌỌ

19. (a) Gịnị ka Ekwensu mere ka ọtụtụ mmadụ kweta banyere ike ya? (b) Olee akụkọ ezi Ndị Kraịst kwesịrị izere?

19 Ọtụtụ ndị bi n’ala Bekee anaghị atụcha ike Setan ụjọ, ma ndị bi ná mba ndị ọzọ n’ụwa na-atụ ya ụjọ. Ná mba ndị ahụ, Ekwensu emeela ka ọtụtụ ndị kweta na ya nwere ike karịa otú o nwere n’ezie. Ụfọdụ ndị na-atụ ndị mmụọ ọjọọ egwu n’ihe niile ha na-eme n’ụbọchị. A na-akọkarị akụkọ banyere ike ndị mmụọ ọjọọ na-akpa. A na-ejikarị obi ụtọ akọ akụkọ ndị ahụ; ha na-atọkwa ndị mmadụ ụtọ. Ànyị kwesịrị iso na-akọsa ụdị akụkọ ahụ? Mbanụ. Ndị na-efe ezi Chineke anaghị akọsa ụdị akụkọ ahụ n’ihi ihe abụọ dị mkpa.

20. Olee otú mmadụ nwere ike isi na-akọsa ụgha Setan n’amaghị ama?

20 Ihe mbụ mere anyị agaghị eso na-akọsa ụdị akụkọ ahụ bụ na ọ bụrụ na mmadụ ana-akọsa ike ndị mmụọ ọjọọ na-akpa, onye ahụ na-akwado ọrụ Setan. N’ihi gịnị? Okwu Chineke kwuru na Setan nwere ike ịrụ ọrụ dị ike, ma ọ dọrọ aka ná ntị na ọ na-eji “ihe ịrịba ama ụgha” na “aghụghọ” eduhie ndị mmadụ. (2 Ndị Tesalonaịka 2:9, 10) Ebe Setan bụ onyeisi nduhie, ọ ma otú ọ ga-esi enweta obi ndị nwere mmasị ná mgbaasị, marakwa otú ọ ga-esi eme ka ha kweta ihe ndị na-abụghị eziokwu. Ndị dị otú ahụ nwere ike iji obi ha dum kwere na o nwere ihe ha hụrụ na ihe ha nụrụ. Ha nwekwara ike na-akọrọ ya ndị mmadụ dị ka ọ̀ bụ eziokwu. Ka oge na-aga, a na-etinye akụkọ ndị ahụ nnu na ose, ka ha na-esi n’aka fere n’aka. Ọ bụrụ na Onye Kraịst ana-akọsa akụkọ ndị ahụ, ọ pụtara na ọ na-eme uche Ekwensu, bụ́ “nna ụgha.” Ọ ga na-akọsa ụgha Setan.—Jọn 8:44; 2 Timoti 2:16.

21. Olee ihe anyị kwesịrị ịna-ekwu okwu banyere ya?

21 Ihe nke abụọ bụ na ọ bụrụgodị na Onye Kraịst na ndị mmụọ ọjọọ mekọrọ ihe n’oge gara aga, o kwesịghị ịna-akọrọ Ndị Kraịst ibe ya akụkọ ndị dị otú ahụ mgbe niile. N’ihi gịnị? A dụrụ anyị ọdụ, sị: ‘Na-elegidenụ anya n’ebe Onye Nnọchiteanya Ukwu na Onye Mmezu nke okwukwe anyị nọ, bụ́ Jizọs.’ (Ndị Hibru 12:2) N’ezie, anyị kwesịrị ilegide anya n’ebe Kraịst nọ, ọ bụghị n’ebe Setan nọ. O doro anya na mgbe Jizọs nọ n’ụwa, ọ kọọrọghị ndị na-eso ụzọ ya akụkọ banyere ndị mmụọ ọjọọ n’agbanyeghị na o nwere ike ịkọrọ ha ọtụtụ ihe banyere ihe Setan ga-emeli na ihe ọ na-agaghị emeli. Kama nke ahụ, Jizọs lekwasịrị anya n’ikwusa Alaeze Chineke. Ya mere, ebe anyị na-eṅomi Jizọs na ndịozi ya, anyị kwesịrị ịna-ekwu banyere “ihe ndị dị ebube nke Chineke.”—Ọrụ 2:11; Luk 8:1; Ndị Rom 1:11, 12.

22. Olee otú anyị ga-esi na-eme ka ‘ọṅụ na-adị n’eluigwe’?

22 N’eziokwu, Setan na-eji atụmatụ aghụghọ dị iche iche, nke gụnyere mgbaasị, agbalị imebi mmekọrịta anyị na Jehova. Otú ọ dị, ọ bụrụ na anyị akpọọ ihe ọjọọ asị ma jidesie ezi ihe ike, anyị agaghị enye Ekwensu ohere imebi mkpebi anyị mere ịjụ ụdị mgbaasị niile. (Ndị Efesọs 4:27) Chegodị echiche ‘ọṅụ dị ukwuu ga-adị n’eluigwe’ ma ọ bụrụ na anyị ‘ana-eguzosi ike megide atụmatụ aghụghọ nke Ekwensu’ ruo mgbe Ekwensu na-agaghị adịkwa!—Ndị Efesọs 6:11.

^ par. 16 Aha ndị e ji kọwaa Setan (ya bụ, Onye Mmegide, Onye Nkwutọ, Onye Nduhie, Onye Ọnwụnwa na Onye Ụgha) apụtaghị na o nwere ike inyocha obi anyị na uche anyị. Otú ọ dị, a kpọrọ Jehova onye “na-enyocha obi,” kpọọkwa Jizọs onye “na-enyocha akụrụ na obi.”—Ilu 17:3; Mkpughe 2:23.

^ par. 18 Ị chọọ ịgụkwu banyere ya, gụọ isiokwu bụ́ “Ọ̀ Bụ Nnwale Ahụ Ike Dịịrị Gị?” n’Ụlọ Nche December 15, 1994, peeji nke 19-22, na isiokwu bụ́ “Nhọrọ Ị Na-eme Banyere Ọgwụgwọ—Ọ̀ Dị Ihe O Mere?” n’Ụlọ Nche February 15, 2001, peeji nke 30.