Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE IRI NA ANỌ

Na-eme Ihe n’Eziokwu n’Ihe Niile

Na-eme Ihe n’Eziokwu n’Ihe Niile

‘Anyị chọrọ ka anyị na-eme ihe n’eziokwu n’ihe niile.’—NDỊ HIBRU 13:18.

1, 2. Gịnị mere o ji atọ Jehova ụtọ ma ọ hụ na anyị na-agbalịsi ike ime ihe n’eziokwu? Nye ihe atụ.

KA E were ya na otu nwaanyị na nwa ya nwoke si ebe ha gara ịzụ ihe na-apụta. Nwatakịrị ahụ akwụsị na mberede ma gbarụọ ihu. O ji nwa bebi o wetara n’ebe ahụ ha gara ịzụ ihe. O chefuru idewe ya ebe o wetara ya, chefuokwa ịgwa nne ya ka ọ zụtara ya nwa bebi ahụ. Ya ebewe ákwá arịrị ka nne ya nyere ya aka. Nne ya emeda ya obi ma kpọrọ ya gaghachi ebe ahụ ha zụrụ ihe ka o dewe nwa bebi ahụ ma rịọ onye nwe ya arịrịọ. Ihe ahụ o mere tọrọ nne ya ụtọ nke ukwuu. N’ihi gịnị?

2 Ndị nne na nna na-enwekarị obi ụtọ ịhụ ka ụmụ ha na-amụta na ime ihe n’eziokwu bara uru. Otú ahụ ka obi na-atọkwa Nna anyị nke eluigwe bụ́ “Chineke nke eziokwu” ụtọ. (Abụ Ọma 31:5) Ka ọ na-ahụ na anyị ji nwayọọ nwayọọ na-aghọ Ndị Kraịst tozuru okè, obi na-atọ ya ụtọ ịhụ ka anyị na-agbalịsi ike ime ihe n’eziokwu. Ebe ọ bụ na anyị chọrọ ime ihe na-atọ ya ụtọ ma nọrọ n’ịhụnanya ya, anyị na-ekwu ihe ahụ Pọl onyeozi kwuru, nke bụ́: ‘Anyị chọrọ ka anyị na-eme ihe n’eziokwu n’ihe niile.’ (Ndị Hibru 13:18) Ka anyị leba anya n’ihe anọ bụ́ isi nwere ike ime ka ime ihe n’eziokwu na-esiri anyị nnọọ ike mgbe ụfọdụ. E mechaa, anyị atụlee ngọzi ndị anyị ga-enweta n’ihi ime ihe n’eziokwu.

ỊGWA ONWE ANYỊ EZIOKWU

3-5. (a) Olee otú Okwu Chineke si dọọ aka ná ntị banyere mmadụ ịghọgbu onwe ya? (b) Gịnị ga-enyere anyị aka ịgwa onwe anyị eziokwu?

3 Nsogbu mbụ anyị ga-agbalị imeri bụ ịmụta ịgwa onwe anyị eziokwu. Ebe anyị bụ ndị na-ezughị okè, ọ dị mfe anyị ịghọgbu onwe anyị. Dị ka ihe atụ, Jizọs gwara Ndị Kraịst nọ na Leodisia na ha na-aghọ onwe ha aghụghọ n’ihi na ha chere na ha bụ ọgaranya, ebe ha bụ n’ezie ‘ndị ogbenye na ndị kpuru ìsì na ndị gba ọtọ’ n’ụzọ ime mmụọ, ya bụ, na e kwesịrị imere ha ebere. (Mkpughe 3:17) Aghụghọ ha na-aghọ onwe ha mere ka ọnọdụ ha ka njọ.

4 I nwere ike icheta na Jems bụ́ onye na-eso ụzọ Jizọs dọrọ aka ná ntị, sị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla chere na ya na-efe Chineke n’ụzọ ziri ezi ma ọ dịghị achịkwa ire ya, kama na-aghọgbu obi ya, ụdị ofufe onye a na-efe bụ ihe efu.” (Jems 1:26) Ọ bụrụ na anyị echee na anyị nwere ike iji ire anyị na-ekwu ihe na-ezighị ezi ma buru n’obi na anyị na-efe Jehova ezi ofufe, ihe ọ pụtara bụ na anyị na-aghọgbu obi anyị. Ofufe anyị na-efe Jehova ga-abụ ihe efu, ya bụ, ihe furu ọhịa. Gịnị ga-eme ka anyị ghara ịdaba n’ọnọdụ ọjọọ dị otú ahụ?

5 N’otu ebe ahụ, Jems ji eziokwu nke Okwu Chineke tụnyere enyo. Ọ dụrụ anyị ọdụ ka anyị na-enyocha iwu Chineke nke zuru okè ma na-eme mgbanwe ndị kwesịrị ekwesị. (Jems 1:23-25) Baịbụl ga-enyere anyị aka ịgwa onwe anyị eziokwu ma mee ka anyị hụ ebe anyị ga-emezi ihe. (Abụ Ákwá 3:40; Hagaị 1:5) Anyị nwekwara ike ikpeku Jehova ekpere, rịọ ya ka o nyochaa anyị ma nyere anyị aka ịhụ ebe ndị anyị na-emejọ ma mezie ha. (Abụ Ọma 139:23, 24) Emeghị ihe n’eziokwu bụ nsogbu na-esi ike nchọpụta, anyị kwesịkwara ile ya anya otú Nna anyị nke eluigwe si ele ya anya. Ilu 3:32 kwuru, sị: “Onye aghụghọ bụ ihe arụ n’anya Jehova, ma ya na ndị na-eme ihe n’eziokwu na-enwe mmekọrịta chiri anya.” Jehova ga-enyere anyị aka iche echiche otú o si eche na ịhụ onwe anyị otú o si ahụ anyị. Cheta na Pọl kwuru, sị: ‘Anyị chọrọ ka anyị na-eme ihe n’eziokwu n’ihe niile.’ Anyị enweghị ike izu okè ugbu a, ma n’ezie, ọ na-agụsi anyị agụụ ike ịna-eme ihe n’eziokwu, anyị na-achọsikwa ike ime otú ahụ.

IME IHE N’EZIOKWU N’EZINỤLỌ

Ime ihe n’eziokwu ga-eme ka anyị ghara ime omume anyị ga-achọ izochi

6. Gịnị mere di na nwunye ji kwesị ịna-agwa ibe ha eziokwu, oleekwa nsogbu ha ga-esi otú ahụ gbaara ọsọ?

6 Ime ihe n’eziokwu kwesịrị ịbụ ihe e ji mara ezinụlọ Ndị Kraịst. N’ihi ya, di na nwunye kwesịrị ịna-agwa ibe ha eziokwu. N’alụmdi na nwunye Ndị Kraịst, e kwesịghị inwe àgwà ọjọọ ndị dị ka ịchụ nwoke ma ọ bụ ịchụ nwaanyị, ime enyi nzuzo n’Ịntanet ma ọ bụ ile foto ndị gba ọtọ n’ụdị ya ọ bụla. Ụfọdụ Ndị Kraịst bụ́ di ma ọ bụ nwunye emeela omume ọjọọ dị otú ahụ ma zochiere ya di ha ma ọ bụ nwunye ha. Ihe ahụ bụ emeghị ihe n’eziokwu. Buru n’obi ihe Eze Devid kwesịrị ntụkwasị obi kwuru, nke bụ́: “Mụ na ndị ụgha adịghị anọkọ; mụ na ndị na-ezochi ihe ha bụ adịghị akpakọrịta.” (Abụ Ọma 26:4) Ọ bụrụ na ị lụọla di ma ọ bụ nwunye, emekwala omume ga-eme ka i zochiwere di gị ma ọ bụ nwunye gị ihe ị bụ!

7, 8. Olee ihe atụ ndị dị na Baịbụl ga-enyere ụmụntakịrị aka ịmụta uru ime ihe n’eziokwu bara?

7 Mgbe ndị nne na nna na-akụziri ụmụ ha uru ime ihe n’eziokwu bara, ha kwesịrị iji ihe atụ ndị dị na Baịbụl. Mgbe ha na-akụziri ha banyere ndị na-emeghị ihe n’eziokwu, ha nwere ike ịkọrọ ha banyere Ekan, bụ́ onye zuru ohi ma gbalịa izochi ya; Gehezaị, bụ́ onye ghara ụgha n’ihi akpịrị ogologo; nakwa Judas, bụ́ onye zuru ohi ma jiri obi ọjọọ ghaa ụgha iji rara Jizọs nye.—Jọshụa 6:17-19; 7:11-25; 2 Ndị Eze 5:14-16, 20-27; Matiu 26:14, 15; Jọn 12:6.

8 Mgbe ha na-akụziri ha banyere ndị mere ihe n’eziokwu, ha nwere ike ịkọrọ ha banyere Jekọb, bụ́ onye gwara ụmụ ya ka ha weghachi ego ha hụrụ n’akpa ha n’ihi na o chere na e chefuru ego ahụ echefu; Jefta na ada ya nwaanyị, bụ́ onye mezuru nkwa nna ya kwere n’agbanyeghị na o furu ya oké ihe; nakwa Jizọs, bụ́ onye ji obi ike kọwaa onwe ya n’ihu ndị ọjọọ bịara ijide ya iji mezuo amụma ma chebe ndị enyi ya. (Jenesis 43:12; Ndị Ikpe 11:30-40; Jọn 18:3-11) Ihe atụ ole na ole ndị a nwere ike ime ka ndị nne na nna nweta ihe ọmụma bara uru dị n’Okwu Chineke nke ga-enyere ha aka ịkụziri ụmụ ha ime ihe n’eziokwu, jirikwa ya kpọrọ ihe.

9. Gịnị ka ndị nne na nna kwesịrị izere ma ọ bụrụ na ha chọrọ isetịpụrụ ụmụ ha ihe nlereanya n’ime ihe n’eziokwu, gịnịkwa mere ihe nlereanya dị otú ahụ ji dị mkpa?

9 Isi otú ahụ akụzi ihe chọrọ ka ndị nne na nna rụọ ọrụ dị mkpa. Pọl onyeozi jụrụ, sị: “Gị onye na-akụziri onye ọzọ ihe, ị́ dịghị akụziri onwe gị? Gị onye na-ekwusa ‘Ezula ohi,’ ị̀ na-ezu ohi?” (Ndị Rom 2:21) Ụfọdụ ndị nne na nna na-emegharị ụmụ ha anya site n’ịkụziri ha ka ha na-eme ihe n’eziokwu ma ha onwe ha ana-aghọ aghụghọ. Ha nwere ike ịkpịrị ihe, kwuo okwu aghụghọ ndị na-egosi na ihe ha mere dị mma, ya bụ, okwu ndị dị ka, “Ha ma na ndị mmadụ ga-ewere ihe a,” ma ọ bụ, “Ihe a bụ obere ụgha. O nweghị ihe o mere.” N’ezie, ohi bụ ohi, n’agbanyeghị otú ihe e zuru hà. Ụgha bụ ụgha, n’agbanyeghị ihe a na-ekwu mgbe ahụ ma ọ bụ otú ụgha ahụ hà. * (Luk 16:10) Ọ naghị ara ụmụaka ahụ́ ịchọpụta ihu abụọ, o nwekwara ike ime ka ha mụta ihe ọjọọ. (Ndị Efesọs 6:4) Otú ọ dị, ọ bụrụ na ha amụta ime ihe n’eziokwu n’aka ndị nne na nna ha, mgbe ha tolitere, o nwere ike ime ka ha na-eto Jehova n’ụwa a na-anaghị eme ihe n’eziokwu.—Ilu 22:6.

IME IHE N’EZIOKWU N’ỌGBAKỌ

10. N’ihe banyere ikwu eziokwu mgbe anyị na ụmụnna anyị nọ, olee ihe ndị anyị kwesịrị iburu n’obi?

10 Anyị na Ndị Kraịst ibe anyị imekọ ihe mgbe niile ga-eme ka anyị na-amụta ime ihe n’eziokwu. Dị ka anyị mụtara n’Isi nke Iri na Abụọ, anyị kwesịrị ịkpachara anya n’otú anyị si eji onyinye ikwu okwu eme ihe, nke ka nke, mgbe anyị nọ n’ebe ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwaanyị nọ. Ọ naghị ara ahụ́ mkparịta ụka nkịtị aghọọ asịrị, ma ọ bụkwanụ nkwutọ! Ọ bụrụ na anyị akọọ akụkọ anyị na-amaghị ma ò mere eme, o nwere ike ime ka anyị na-akọsa ụgha. N’ihi ya, ọ ka mma ka anyị chịkwaa egbugbere ọnụ anyị. (Ilu 10:19) N’aka nke ọzọ, o nwere ike ịbụ na anyị ma na akụkọ ahụ bụ eziokwu, ma ọ pụtaghị na anyị kwesịrị ịkọrọ ya ndị ọzọ. Dị ka ihe atụ, o nwere ike ịbụ na ihe ahụ agbasaghị anyị, ma ọ bụkwanụ, ya abụrụ na ọ dịghị mma ịkọrọ ya ndị ọzọ. (1 Ndị Tesalonaịka 4:11) Ụfọdụ ndị nwere ọnụ ọjọọ, na-asị na ọ bụ ikwu eziokwu, ma anyị kwesịrị ịna-ekwu okwu ọma ma ọ bụ okwu dị n’amara mgbe niile.—Ndị Kọlọsi 4:6.

11, 12. (a) Olee otú ụfọdụ ndị mere mmehie dị oké njọ si eme ka nsogbu ha ka njọ? (b) Olee ụfọdụ ụgha Setan na-agha banyere mmehie dị oké njọ, oleekwa otú anyị ga-esi ezere ha? (ch) Olee otú anyị ga-esi na-agwa nzukọ Jehova eziokwu?

11 Ọ dị oké mkpa na anyị ga na-agwa ndị na-edu ndú n’ọgbakọ eziokwu. Ụfọdụ ndị, bụ́ ndị mere mmehie dị oké njọ, na-eme ka nsogbu ha ka njọ site n’ịgbalị izochi mmehie ha ma na-aghara ndị okenye ụgha mgbe ha jụrụ ha ajụjụ banyere ya. Ndị dị otú ahụ na-amalite ibi ndụ ihu abụọ, na-eme ka à ga-asị na ha na-efe Jehova ma na-aṅụ mmehie dị oké njọ ka mmiri. N’ezie, ibi ụdị ndụ ahụ ga-eme ka a na-enyo ihe niile ha na-eme enyo. (Abụ Ọma 12:2) Ndị ọzọ na-agwatụ ndị okenye eziokwu ma zochie ihe ndị dị mkpa. (Ọrụ 5:1-11) Ihe na-akpata emeghị ihe n’eziokwu dị otú ahụ bụ ikwere n’ụgha Setan na-agbasa.—Gụọ igbe dị na peeji nke 164-165, bụ́ “ Ụgha Setan Na-agha Banyere Mmehie Ndị Dị Oké Njọ.”

12 Ọ dịkwa mkpa ịgwa nzukọ Jehova eziokwu mgbe anyị na-edejupụta akwụkwọ. Dị ka ihe atụ, mgbe anyị na-ede akụkọ ozi ubi, anyị kwesịrị ịkpachara anya ka anyị ghara ịgha ụgha. Otú ahụkwa ka anyị kwesịrị ime mgbe anyị na-edejupụta akwụkwọ maka ihe ùgwù ije ozi, anyị ekwesịghị ịgha ụgha banyere ahụ́ ike anyị ma ọ bụ ihe ọ bụla a jụrụ anyị banyere onwe anyị.—Ilu 6:16-19.

13. Olee otú anyị ga-esi na-eme ihe n’eziokwu ma ọ bụrụ na anyị na-arụrụ nwanna ọrụ ma ọ bụ na nwanna na-arụrụ anyị ọrụ?

13 Anyị kwesịkwara ịgwa ụmụnna anyị eziokwu mgbe anyị na ha na-emekọ ihe ego. Mgbe ụfọdụ, nwanna na nwanna nwere ike imekọ ihe ego. Ha kwesịrị ịkpachara anya ka ha ghara ikwu banyere ya mgbe ha bịara ọmụmụ ihe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ma ọ bụ mgbe ha nọ n’ozi ọma. O nwekwara ike ịbụ na nwanna na-arụrụ nwanna ọrụ. Ọ bụrụ na nwanna na-arụrụ anyị ọrụ, anyị ga-akpachara anya ka anyị na-eme ihe n’eziokwu mgbe anyị na-emeso ya ihe, na-akwụ ya ụgwọ n’oge, na-akwụ ya ihe anyị na ya kwekọrịtara, nakwa ihe iwu kwuru ka a na-enye ndị ọrụ. (1 Timoti 5:18; Jems 5:1-4) N’aka nke ọzọ, ọ bụrụ na anyị na-arụrụ nwanna ọrụ, anyị kwesịrị ịrụ ọrụ ruru ego ole ọ ga-akwụ anyị. (2 Ndị Tesalonaịka 3:10) Anyị ekwesịghị ịtụ anya ka ọ na-emenyere anyị n’ihi na ọ bụ nwanna, dị ka à ga-asị na iwu ji ya inye anyị oge ezumike, ego mmachi akpa ma ọ bụ ihe ndị ọzọ a na-enyeghị ndị ọrụ ndị ọzọ.—Ndị Efesọs 6:5-8.

14. Ọ bụrụ na nwanna na nwanna jikọrọ aka na-achụ nta ego, gịnị ka ha kwesịrị ilezi anya mee, n’ihi gịnịkwa?

14 Ọ́ bụrụkwanụ na anyị na nwanna jikọrọ aka na-achụ nta ego, ikekwe, ya abụrụ ịgbazinye ego? Baịbụl kwuru ihe dị mkpa ma baa uru anyị kwesịrị ime: Dee ihe niile ede! Dị ka ihe atụ, mgbe Jeremaya zụrụ otu ibé ala, o dere akwụkwọ ala ahụ ụzọ abụọ, nwee ndị akaebe, ma dewe ya n’ebe ihe na-agaghị eme ya, a dịghị ama ama. (Jeremaya 32:9-12; gụọkwa Jenesis 23:16-20.) Mgbe anyị na ụmụnna anyị na-emekọ ihe ego, ịsa anya na mmiri dee ihe niile ede, bịanye aka na ya ma nwee ndị akaebe bịanyere aka na ya apụtaghị na anyị atụkwasịghị ụmụnna anyị obi. Kama nke ahụ, ọ na-enye aka igbochi nghọtahie, emeghị ihe e kwuru, na ihe ndị nwere ike ịkpata esemokwu. Ndị Kraịst ọ bụla ha na ibe ha na-emekọ ihe ego kwesịrị iburu n’obi na ọ dịghị ihe ego ọ bụla kwesịrị imebi ịdị n’otu na udo nke ọgbakọ. *1 Ndị Kọrịnt 6:1-8.

IME IHE N’EZIOKWU MGBE ANYỊ NA NDỊ ỤWA NA-EMEKỌ IHE

15. Olee otú Jehova si ele ịghọ aghụghọ n’achụmnta ego anya, oleekwa otú Ndị Kraịst si ele omume dị otú ahụ ndị mmadụ na-eme anya?

15 Ọ bụghị naanị n’ọgbakọ ka Onye Kraịst kwesịrị ịna-eme ihe n’eziokwu. Pọl sịrị: ‘Anyị chọrọ ka anyị na-eme ihe n’eziokwu n’ihe niile.’ (Ndị Hibru 13:18) Mgbe anyị na ndị ụwa na-emekọ ihe ego, Onye kere anyị chọrọ ka anyị na-eme ihe n’eziokwu. Naanị n’akwụkwọ Ilu, e nwere ebe anọ e kwuru okwu banyere ihe ọ̀tụ̀tụ̀ adịgboroja. (Ilu 11:1; 16:11; 20:10, 23) N’oge ochie, ndị mmadụ na-ejikarị ihe ọ̀tụ̀tụ̀ atụ ngwá ahịa a zụrụ azụ nakwa ego a ga-eji azụ ya. Ndị ahịa na-anaghị eme ihe n’eziokwu na-eji ụzọ ihe ọ̀tụ̀tụ̀ abụọ, nke zuru ezu na nke na-ezughị ezu ha ga-eji na-aghọgbu ndị ahịa ha. * Jehova kpọrọ omume dị otú ahụ asị! Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịnọrọ n’ịhụnanya ya, anyị ga-ezere ụdị aghụghọ niile a na-aghọ n’achụmnta ego kpamkpam.

16, 17. Olee ụdị emeghị ihe n’eziokwu e nwere n’ụwa taa, oleekwa ihe Ndị Kraịst kpebisiri ike ime?

16 Ọ naghị eju anyị anya ịhụ na ọtụtụ mmadụ anaghị eme ihe n’eziokwu n’ihi na ọ bụ Setan na-achị ụwa a. Kwa ụbọchị, e nwere ike ịnwa anyị ọnwụnwa ịghọ aghụghọ. Mgbe ndị mmadụ na-ede akwụkwọ ha ji achọ ọrụ, ha na-aghakarị ụgha banyere onwe ha, mepụta asambodo adịgboroja, ma ọ bụ ghaa ụgha banyere otú ha nweruru ahụmahụ n’ọrụ. Ndị mmadụ na-aghakwa ụgha mgbe ha na-edejupụta akwụkwọ ka e nye ha ikike ịgafe mba ọzọ, mgbe ha na-edejupụta akwụkwọ ụtụ isi, akwụkwọ ịnshọransị na akwụkwọ ndị ọzọ, iji nweta ihe ha chọrọ. Ọtụtụ ụmụ akwụkwọ na-aghọ aghụghọ ule, ma ọ bụkwanụ mgbe ha na-ede edemede ụlọ akwụkwọ, ha nwere ike ịga n’Ịntanet dere ihe onye ọzọ dere, mee ka à ga-asị na ọ bụ ha dere ya n’onwe ha. Ndị mmadụ na-enyekwa ndị isi ọrụ na-arụrụ aka aka azụ iji nweta ihe ha chọrọ. Anyị ma na ụdị ihe ndị a ga na-eme n’ụwa a ebe ọ bụ na ọtụtụ ndị bụ “ndị hụrụ naanị onwe ha n’anya, ndị hụrụ ego n’anya, . . . ndị na-adịghị ahụ ezi ihe n’anya.”—2 Timoti 3:1-5.

17 Ezi Ndị Kraịst kpebisiri ike na ha agaghị eme ụdị omume ndị ahụ. Ihe mere ọ na-eji esi ike mgbe ụfọdụ ime ihe n’eziokwu bụ na ndị na-anaghị eme ihe n’eziokwu yiri ka ihe ọ̀ na-agara ha nke ọma n’ụwa a, ha ana-eritekwa uru. (Abụ Ọma 73:1-8) Ka ọ dịgodị, ihe nwere ike ịna-esiri Ndị Kraịst ike n’ihi na ha chọrọ ịna-eme ihe n’eziokwu “n’ihe niile.” Ime ihe n’eziokwu ọ̀ bara uru? À na-ajụkwa nke ahụ ajụ? N’ihi gịnị? Olee ngọzi mmadụ ga-enweta n’ime ihe n’eziokwu?

NGỌZI NDỊ A NA-ENWETA N’IME IHE N’EZIOKWU

18. Gịnị mere inwe aha ọma n’ihi ime ihe n’eziokwu ji baa oké uru?

18 Ọ dịghị ihe bara uru ná ndụ karịa ime ihe n’eziokwu, na ịbụ onye e nwere ike ịtụkwasị obi. (Gụọ igbe dị na peeji nke 167, bụ́ “ M̀ Na-eme Ihe n’Eziokwu Mgbe Niile?”) Cheedị echiche, onye ọ bụla nwere ike ịmụta àgwà ahụ! Ọ dabereghị na nkà gị, akụnụba gị, otú ị dị, ọnọdụ gị ma ọ bụ ihe ndị ọzọ ị na-enweghị ike ịgbanwe agbanwe. Ezi aha bụ akụ̀, ma ọtụtụ ndị enweghị ya. Ọ dị ụkọ. (Maịka 7:2) Ụfọdụ ndị nwere ike ịkwa gị emo n’ihi ime ihe n’eziokwu, ma o nwere ike ịdị ndị ọzọ mma, meekwa ka ha na-atụkwasị gị obi ma na-akwanyere gị ùgwù. Ọtụtụ n’ime Ndịàmà Jehova achọpụtala na ime ihe n’eziokwu abaarala ha uru n’ọrụ ha. Mgbe a chụrụ ndị ọrụ na-anaghị eme ihe n’eziokwu n’ọrụ, a chụghị ha, ha enwetakwala ọrụ mgbe a chọsiri ndị ọrụ na-eme ihe n’eziokwu ike n’ụlọ ọrụ.

19. Olee otú ime ihe n’eziokwu ga-esi emetụta akọnuche anyị nakwa mmekọrịta anyị na Jehova?

19 Ma ọ̀ ga-eme ka i rite ụdị uru ahụ ma ọ bụ na ọ gaghị eme, ị ga-achọpụta na ime ihe n’eziokwu na-eweta ngọzi ka ukwuu. Ọ ga-eme ka i nwee akọnuche dị ọcha. Pọl dere, sị: ‘Anyị kwenyesiri ike na anyị nwere akọnuche ziri ezi.’ (Ndị Hibru 13:18) Ihe ọzọkwa bụ na Nna anyị nke eluigwe nke nwere ịhụnanya na-ahụ àgwà ọma gị, ọ hụkwara ndị na-eme ihe n’eziokwu n’anya. (Abụ Ọma 15:1, 2; Ilu 22:1) N’ezie, ime ihe n’eziokwu ga-enyere gị aka ịnọrọ n’ịhụnanya Chineke, ọ dịghịkwa ụgwọ ọrụ karịrị ya. Ka anyị leba anya n’isiokwu ọzọ yiri ya, ya bụ, otú Jehova si ele ọrụ anya.

^ par. 9 N’ọgbakọ, ndị okenye nwere ike ihiwere mmadụ òtù ikpe ma ọ bụrụ na onye ahụ kpachaara anya na-agha ụgha iji mebie aha ndị ọzọ.

^ par. 14 Ị chọọ ịma ihe e kwesịrị ime ma e nwee nsogbu n’achụmnta ego, gụọ isiokwu dị na peeji nke 222-223.

^ par. 15 Ha na-eji otu ihe ọ̀tụ̀tụ̀ azụ ihe ma jiri nke ọzọ na-ere ya ere, si otú ahụ na-erite uru na ha abụọ. Ha nwekwara ike iji ihe ọ̀tụ̀tụ̀ otu aka ya ka ogologo ma ọ bụ nke otu aka ya dị arọ karịa nke ọzọ, ka ha were ya ghọgbuo onye ahịa ha mgbe ọ bụla.