ISI NKE ISII
Otú Anyị Ga-esi Na-ahọrọ Ntụrụndụ Dị Mma
“Na-emenụ ihe niile iji nye Chineke otuto.”—1 NDỊ KỌRỊNT 10:31.
1, 2. Olee ihe anyị kwesịrị ime n’ihe banyere ntụrụndụ?
KA E were ya na ị chọrọ ịta mkpụrụ osisi na-atọ ụtọ, ma gị ahụ na o nwere ebe rere ere. Gịnị ka ị ga-eme? Ị chọọ, i nwere ike ịtacha mkpụrụ osisi ahụ, ma ebe dị mma ma ebe ahụ mebiri emebi; i nwere ike ịtụfu mkpụrụ osisi ahụ dum, ma ebe dị mma ma ebe ahụ mebiri emebi; ma ọ bụkwanụ, gị ebepụ ebe ahụ mebiri emebi, tazie ebe dị mma. Olee nke ị ga-eme?
2 E nwere ike ikwu na ntụrụndụ yiri mkpụrụ osisi ahụ. Mgbe ụfọdụ, i nwere ike ịchọ ịtụrụtụ ndụ, ma gị achọpụta na ọtụtụ n’ime ntụrụndụ ndị e nwere ugbu a rụrụ arụ, reekwa ere. Ya mere, gịnị ka ị ga-eme? Ụfọdụ ndị nwere ike ịnabata ihe na-adịghị mma, ma na-atụrụ ụdị ndụ ọ bụla e nwere n’ụwa a. Ndị ọzọ nwere ike izere ntụrụndụ niile iji hụ na ha etinyeghị aka n’ihe ọjọọ ọ bụla. Ndị ọzọ nwere ike ilezi anya zere ntụrụndụ na-adịghị mma ma mgbe ụfọdụ soro nwee ntụrụndụ dị mma. Olee ntụrụndụ i kwesịrị ịhọrọ iji nọrọ n’ịhụnanya Chineke?
3. Gịnị ka anyị ga-atụle ugbu a?
3 Ọtụtụ n’ime anyị ga-ahọrọ nke atọ ahụ. Anyị ghọtara na ọ dị mma inwe ntụrụndụ, ma anyị chọrọ inwe naanị ntụrụndụ dị mma. Ya mere, anyị kwesịrị ịtụle otú anyị ga-esi amata ntụrụndụ dị mma na nke na-adịghị mma. Ma, ka anyị burugodị ụzọ tụlee otú ntụrụndụ
anyị na-ahọrọ nwere ike isi metụta ofufe anyị na-efe Jehova.“NA-EMENỤ IHE NIILE IJI NYE CHINEKE OTUTO”
4. Olee otú nrara anyị raara onwe anyị nye Chineke kwesịrị isi emetụta ntụrụndụ anyị na-ahọrọ?
4 O nwere mgbe otu Onyeàmà merela agadi, nke e mere baptizim n’afọ 1946, kwuru, sị: “Emere m ka ọ bụrụ iwu na m ga-anọ mgbe ọ bụla a na-ekwu okwu baptizim, geekwa ntị nke ọma, dị ka à ga-asị na ọ bụ m ka a na-aga ime baptizim.” N’ihi gịnị? O kwuru, sị, “Iburu nraranye m n’uche mgbe niile bụ ihe dị mkpa nke na-enyere m aka ikwesị ntụkwasị obi.” O doro anya na ị ga-ekweta ihe ahụ o kwuru. Icheta na i kwere Jehova nkwa na ị ga-eji ndụ gị niile jeere ya ozi ga-eme ka ị na-atachi obi. (Ekliziastis 5:4; Ndị Hibru 10:7) N’ezie, ịtụgharị uche ná nrara ị raara onwe gị nye Chineke ga-emetụta ọ bụghị naanị otú i si ele ozi Ndị Kraịst anya, kamakwa, otú i si ele ihe niile ọzọ a na-eme ná ndụ anya, ma ntụrụndụ. Mgbe Pọl onyeozi na-edegara Ndị Kraịst nọ n’oge ya akwụkwọ, o mere ka eziokwu ahụ doo anya, sị: “Ma ùnu na-eri ihe ma ùnu na-aṅụ ihe ọṅụṅụ ma ùnu na-eme ihe ọ bụla ọzọ, na-emenụ ihe niile iji nye Chineke otuto.”—1 Ndị Kọrịnt 10:31.
5. Olee otú Levitikọs 22:18-20 si enyere anyị aka ịghọta ịdọ aka ná ntị ahụ dị ná Ndị Rom 12:1?
Ndị Rom 12:1) Ahụ́ gị bụ ma uche gị ma obi gị ma ike gị. Ị na-eji ihe a niile ejere Chineke ozi. (Mak 12:30) Pọl kwuru na ozi ahụ e ji mkpụrụ obi dum na-eje bụ àjà. O nwere ihe okwu ahụ bụ́ “àjà” na-adọ aka ná ntị ya. N’Iwu Mozis, Chineke anaghị anabata àjà na-adịghị mma. (Levitikọs 22:18-20) Otú ahụkwa, ọ bụrụ na ihe ọ bụla emetọọ àjà ime mmụọ Onye Kraịst na-achụ, Chineke agaghị anabata ya. Ma, olee otú nke ahụ nwere ike isi mee?
5 Ihe niile ị na-eme ná ndụ na-emetụta ofufe ị na-efe Jehova. N’akwụkwọ ozi Pọl degaara Ndị Rom, o kwuru okwu gbara ọkpụrụkpụ iji mee ka ndị kwere ekwe ibe ya ghọta na nke a bụ eziokwu. Ọ gbara ha ume, sị: ‘Nyefeenụ Chineke ahụ́ unu dị ka àjà dị ndụ, dị nsọ, nke dị Chineke mma, ya bụ, ozi dị nsọ site n’ike iche echiche unu.’ (6, 7. Olee otú Onye Kraịst nwere ike isi metọọ ahụ́ ya, gịnịkwa ka o nwere ike ịkpatara ya?
6 Pọl dụrụ Ndị Kraịst nọ na Rom ọdụ, sị: “Unu enyefekwala akụkụ ahụ́ unu n’aka mmehie.” Pọl gwakwara ha ka ha ‘mee ka omume niile nke ahụ́ nwụọ.’ (Ndị Rom 6:12-14; 8:13) N’akwụkwọ ozi ahụ o dere, o bularị ụzọ kwuo ihe ụfọdụ ndị bụ́ ‘omume nke ahụ́.’ Baịbụl kwuru banyere ụmụ mmadụ na-emehie emehie, sị: ‘Ọnụ ha jupụtara n’ịbụ ọnụ.’ “Ụkwụ ha dị ngwa ịwụfu ọbara.” “Ha adịghị atụ egwu Chineke.” * (Ndị Rom 3:13-18) Onye Kraịst ga-emerụ ahụ́ ya ma ọ bụrụ na o jiri “akụkụ ahụ́” ya na-eme mmehie ndị dị otú ahụ. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na Onye Kraịst akpachara anya taa na-ele ihe rụrụ arụ, dị ka ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ ma ọ bụ ime ihe ike jọgburu onwe ya, ọ ‘na-enyefe anya ya n’aka mmehie,’ sikwa otú ahụ na-emerụ ahụ́ ya dum. Ofufe ọ bụla ọ na-efe Chineke ga-abụ àjà na-adịkwaghị nsọ, nke Chineke na-anaghị anabata. (Diuterọnọmi 15:21; 1 Pita 1:14-16; 2 Pita 3:11) Nke ahụ bụ inweta ụsụ ahịa dị ukwuu n’ihi itinye aka ná ntụrụndụ na-adịghị mma!
7 O doro anya na ntụrụndụ Onye Kraịst họọrọ nwere ike ịkpatara ya oké nsogbu. N’ihi ya, anyị kwesịrị ịhọrọ ntụrụndụ nke ga-eme ka àjà anyị na-achụrụ Chineke ka mma, ọ bụghị nke ga-emetọ ya. Ka anyị tụlezie otú anyị ga-esi achọpụta ụdị ntụrụndụ dị mma na nke na-adịghị mma.
“KPỌỌNỤ IHE ỌJỌỌ ASỊ”
8, 9. (a) Olee ụzọ abụọ e nwere ike ikwu na ntụrụndụ dị? (b) Olee ụdị ntụrụndụ ndị anyị na-ezere, n’ihi gịnịkwa?
8 E nwere ike ikwu na ntụrụndụ dị ụzọ abụọ. Otu bụ ntụrụndụ nke Ndị Kraịst ga-ezere kpamkpam; nke ọzọ abụrụ ntụrụndụ nke Ndị Kraịst nwere ike họrọ ma ọ bụ jụ. Ka anyị burugodị ụzọ leba anya na nke mbụ ahụ, ya bụ, ntụrụndụ nke Ndị Kraịst ga-ezere.
9 Dị ka anyị kwuru n’Isi nke Mbụ, ihe a na-eme ná ntụrụndụ ụfọdụ bụ ihe Baịbụl kwuru hoo haa na ọ dịghị mma. Dị ka ihe atụ, chee echiche banyere Ịntanet, fim, TV, na egwú, bụ́ ndị na-egosi ebe a na-arụ ụrụ, ebe a na-eme ihe ndị mmụọ ọjọọ, ebe a na-egosi ndị gba ọtọ, ma ọ bụ egwú ndị na-akwado omume rụrụ arụ ndị jọgburu onwe ha. Ebe ọ bụ na ihe a na-eme ná ntụrụndụ ndị rụrụ arụ dị otú ahụ megidere ụkpụrụ Baịbụl ma ọ bụ iwu ya, ezi Ndị Kraịst kwesịrị izere ihe ndị ahụ n’agbanyeghị na a na-egosi ha dị ka ihe dị mma. (Ọrụ 15:28, 29; 1 Ndị Kọrịnt 6:9, 10; Mkpughe 21:8) Ọ bụrụ na ị jụ ntụrụndụ dị otú ahụ na-adịghị mma, ị na-egosi Jehova na ị ‘kpọrọ ihe ọjọọ asị’ n’ezie, na ị ‘na-esikwa n’ihe ọjọọ wezụga onwe gị’ mgbe niile. Ọ ga-egosikwa na i nwere ‘okwukwe na-abụghị nke ihu abụọ.’—Ndị Rom 12:9; Abụ Ọma 34:14; 1 Timoti 1:5.
10. Olee echiche dị ize ndụ ụfọdụ ndị nwere banyere ntụrụndụ, n’ihi gịnịkwa?
10 Ma, ụfọdụ ndị nwere ike iche na ile ihe ntụrụndụ ndị na-egosi omume rụrụ arụ enweghị ihe o mere. Ha na-eche, sị, ‘Enwere m ike ile ya na fim ma ọ bụ na TV, ma, agaghị m eme ụdị ihe ahụ.’ Mmadụ iche otú ahụ bụ ịghọgbu onwe ya, ọ dịkwa ize ndụ. (Jeremaya 17:9) Ọ bụrụ na ọ na-atọ anyị ụtọ ile ihe Jehova sịrị na ọ dịghị mma, ànyị ‘kpọrọ ihe ọjọọ asị’ n’ezie? Ile ebe a na-eme omume ọjọọ kwa mgbe kwa mgbe ga-emebi echiche anyị. (Abụ Ọma 119:70; 1 Timoti 4:1, 2) Ime otú ahụ nwere ike imetụta ihe anyị na-eme ma ọ bụ otú anyị si ele omume ọjọọ nke ndị ọzọ anya.
11. Olee otú Ndị Galeshia 6:7 si bụrụ eziokwu n’ihe banyere ntụrụndụ?
11 Ihe ahụ emeela ụfọdụ ndị n’ezie. Ụfọdụ Ndị Kraịst emeela omume rụrụ arụ n’ihi na ha na-elekarị ihe ntụrụndụ na-adịghị mma. Ahụhụ ha tara kụziiri ha na ‘mkpụrụ ọ bụla mmadụ na-agha, ọ bụ ya ka ọ ga-aghọrọ.’ (Ndị Galeshia 6:7) Ma, e nwere ike izere mkpụrụ ọjọọ dị otú ahụ. Ọ bụrụ na i lezie anya kụọ mkpụrụ dị mma n’obi gị, ị ga-eji obi ụtọ ghọrọ mkpụrụ dị mma ná ndụ gị.—Gụọ igbe dị na peeji nke 67, bụ́ “ Olee Ụdị Ntụrụndụ M Kwesịrị Ịhọrọ?”
IHE MMADỤ GA-EJI ỤKPỤRỤ BAỊBỤL KPEBIE
12. Olee otú Ndị Galeshia 6:5 si gbasa ntụrụndụ, olee ihe kwesịrị iduzi anyị n’ikpebi ihe anyị ga-eme?
12 Ka anyị leba anya ugbu a n’ụdị ntụrụndụ nke abụọ, ya bụ, ụdị ntụrụndụ Okwu Chineke na-ekwughị hoo haa na ọ dịghị mma, ma ọ sịghịkwanụ kpọmkwem na ọ dị mma. Mgbe Onye Kraịst ọ bụla na-ahọrọ ụdị ntụrụndụ ahụ, o kwesịrị iji aka ya kpebie ihe ọ maara dị mma. (Ndị Galeshia 6:5) Otú ọ dị, mgbe anyị chọrọ ikpebi ụdị ihe ahụ, anyị nwere ihe ga-eduzi anyị. Baịbụl nwere ụkpụrụ ma ọ bụ eziokwu dị mkpa ndị ga-eme ka anyị ghọta ihe bụ́ uche Jehova n’okwu ahụ. Ọ bụrụ na anyị echebara ụkpụrụ ndị ahụ echiche, anyị ga-aghọta “ihe uche Jehova bụ” n’ihe niile, ọbụna n’ihe banyere ntụrụndụ anyị na-ahọrọ.—Ndị Efesọs 5:17.
13. Gịnị ga-eme ka anyị zere ntụrụndụ na-adịghị Jehova mma?
Ndị Filipaị 1:9) Ihe ọzọkwa bụ na Ndị Kraịst maara na ntụrụndụ masịrị otu onye nwere ike ọ gaghị amasị onye ọzọ. Ya mere, a gaghị atụ anya na Ndị Kraịst niile ga-ahọrọ otu ụdị ntụrụndụ. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ bụrụ na anyị ejiri ụkpụrụ Chineke na-eduzi uche anyị na obi anyị mgbe niile, ọ ga na-anụ anyị ọkụ n’obi mgbe niile izere ụdị ntụrụndụ ọ bụla na-adịghị Jehova mma.—Abụ Ọma 119:11, 129; 1 Pita 2:16.
13 O doro anya na nghọta Ndị Kraịst niile nwere banyere ntụrụndụ abụghị otu. (14. (a) Olee ihe anyị kwesịrị ichebara echiche mgbe anyị na-ahọrọ ntụrụndụ? (b) Olee otú anyị ga-esi ebute Alaeze Chineke ụzọ ná ndụ anyị?
14 Mgbe ị na-ahọrọ ntụrụndụ, o nwere ihe ọzọ dị mkpa ị ga-echebara echiche, ya bụ, oge gị. Ọ bụ ezie na ụdị ntụrụndụ ị na-ahọrọ na-egosi ihe dị gị mma, otú ị na-etinyeru oge na ya na-egosi ihe i weere na ọ bụ ihe kacha gị mkpa. N’ezie, ihe kacha Ndị Kraịst mkpa bụ ihe metụtara ofufe Chineke. (Matiu 6:33) Gịnịzi ka ị ga-eme iji jide n’aka na ị na-ebute ihe metụtara Alaeze Chineke ụzọ ná ndụ gị? Pọl onyeozi sịrị: “Na-echesinụ nche ike ka otú unu si na-eje ije ghara ịdị ka ndị na-amaghị ihe kama dị ka ndị maara ihe, na-azụtara onwe unu oge kwesịrị ekwesị.” (Ndị Efesọs 5:15, 16) N’eziokwu, ikpebisi ike na ị gaghị etinyebiga oge ókè ná ntụrụndụ ga-eme ka i nwee oge ị ga-eji na-eme “ihe ndị ka mkpa,” ya bụ, ihe ndị ga-eme ka mmekọrịta gị na Chineke ka mma.—Ndị Filipaị 1:10.
15. Gịnị mere anyị ji kwesị ịgbara nsogbu ọsọ mgbe anyị na-ahọrọ ntụrụndụ?
15 Mgbe anyị na-ahọrọ ntụrụndụ, anyị kwesịkwara ịgbara nsogbu ọsọ. Gịnị ka nke ahụ pụtara? Chee echiche ọzọ banyere ihe atụ ahụ e ji mkpụrụ osisi mee. Ọ bụrụ na ị chọghị ịta ebe ahụ rere ere, ebe ị ga-ebepụ abụghị naanị ebe ahụ mebiri emebi, kamakwa, gburugburu ya. N’otu aka ahụ, anyị kwesịrị ịgbara nsogbu ọsọ mgbe Ilu 4:25-27) Isochi ndụmọdụ dị n’Okwu Chineke anya ga-enyere gị aka ime otú ahụ.
anyị na-ahọrọ ntụrụndụ. Ihe Onye Kraịst maara ihe na-ezere abụghị naanị ntụrụndụ a ma nke ọma na o megidere ụkpụrụ Baịbụl, kamakwa, ọ na-ezere ụdị ntụrụndụ ndị a na-enyo enyo ma ọ bụ ndị yiri ka hà ga-emebi mmekọrịta ya na Chineke. (“IHE Ọ BỤLA NKE DỊ ỌCHA”
16. (a) Olee otú anyị ga-esi egosi na anyị na-ele omume ọma anya otú Jehova si ele ya anya? (b) Olee otú ime ihe Baịbụl kwuru ga-esi bụrụ ụzọ i si ebi ndụ?
16 Mgbe ezi Ndị Kraịst na-ahọrọ ntụrụndụ, ihe mbụ ha na-eme bụ ichebara ihe bụ́ uche Jehova echiche. Baịbụl na-agwa anyị echiche Jehova na ụkpụrụ ya. Dị ka ihe atụ, Eze Sọlọmọn depụtara ihe dị iche iche Jehova kpọrọ asị, ihe ndị dị ka “ire na-agha ụgha, na aka na-awụfu ọbara nke na-emeghị ihe ọjọọ, obi nke na-echepụta ihe ọjọọ, ụkwụ nke na-eme ngwa ịgbaga n’ihe ọjọọ.” (Ilu 6:16-19) Olee otú echiche Jehova kwesịrị isi emetụta echiche gị? Ọbụ abụ gbara ume, sị: “Unu ndị hụrụ Jehova n’anya, kpọọnụ ihe ọjọọ asị.” (Abụ Ọma 97:10) Ntụrụndụ ndị ị na-ahọrọ kwesịrị igosi na ị kpọrọ ihe Jehova kpọrọ asị asị n’ezie. (Ndị Galeshia 5:19-21) Burukwa n’uche na ihe na-egosi ụdị onye ị bụ n’ezie bụ ihe ị na-eme mgbe naanị gị nọ, ọ bụghị naanị ihe ị na-eme mgbe gị na ndị ọzọ nọ. (Abụ Ọma 11:4; 16:8) Ya mere, ọ bụrụ na i ji obi gị dum chọọ ka ihe niile ị na-eme ná ndụ na-egosi na ị na-ele omume ọma anya otú Jehova si ele ya anya, ị ga na-ahọrọ ntụrụndụ ndị kwekọrọ n’ụkpụrụ Baịbụl mgbe niile. Ime otú ahụ ga-abụ ụzọ i si ebi ndụ.—2 Ndị Kọrịnt 3:18.
17. Tupu anyị ahọrọ ntụrụndụ, olee ajụjụ ndị anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị?
17 Olee ihe ọzọ ị ga-eme iji jide n’aka na ị ga na-eme ihe kwekọrọ n’otú Jehova si eche echiche mgbe ị na-ahọrọ ntụrụndụ? Jụọ onwe gị, sị, ‘Olee otú ihe a ga-esi emetụta m, oleekwa otú ọ ga-esi emetụta mmekọrịta mụ na Chineke?’ Dị ka ihe atụ, tupu gị ekpebie ma ị̀ ga-ele fim e wetaara gị, jụọ onwe gị, sị, ‘Olee otú ihe dị na fim a ga-esi emetụta akọnuche m?’ Ka anyị leba anya n’ụkpụrụ ndị ga-abara anyị uru n’okwu a.
18, 19. (a) Olee otú ụkpụrụ ahụ dị ná Ndị Filipaị 4:8 ga-esi enyere anyị aka ịmata ma ntụrụndụ anyị ọ̀ dị mma? (b) Olee ụkpụrụ ndị ọzọ ga-enyere gị aka ịhọrọ ntụrụndụ dị mma? (Gụọ ihe e dere n’ala ala peeji.)
18 Otu n’ime ụkpụrụ ndị dị mkpa bụ nke ahụ dị ná Ndị Filipaị 4:8, nke sịrị: “Ihe ọ bụla nke bụ́ eziokwu, ihe ọ bụla nke dị mkpa, ihe ọ bụla nke ziri ezi, ihe ọ bụla nke dị ọcha, ihe ọ bụla nke na-akpali ịhụnanya, ihe ọ bụla nke a na-ekwu okwu ọma banyere ya, omume ọma ọ bụla dịnụ na ihe ọ bụla dịnụ nke kwesịrị otuto, na-echebaranụ ihe ndị a echiche.” N’ezie, Pọl anaghị ekwu banyere ntụrụndụ, kama ọ na-ekwu banyere ihe anyị na-atụgharị n’uche, nke kwesịrị ịbụ ihe dị Chineke mma. (Abụ Ọma 19:14) Ma, e nwere ike iji ụkpụrụ dị n’okwu Pọl kọwaa ihe banyere ntụrụndụ. Olee otú a ga-esi akọwa ya?
19 Jụọ onwe gị, sị, ‘Fim, egwuregwu vidio, ma ọ bụ ụdị ntụrụndụ ndị ọzọ m na-ahọrọ hà na-eme ka m na-eche banyere “ihe ọ bụla nke dị ọcha”?’ Dị ka ihe atụ, mgbe i lechara fim, olee ihe ndị ị hụrụ na fim ahụ ndị ị na-eche banyere ha mgbe niile? Ọ bụrụ na ha dị mma, zie ezie, na-emekwa ka ahụ́ ruo gị ala, mara na ntụrụndụ ahụ kwesịrị ekwesị. Otú ọ dị, ọ bụrụ na fim ahụ i lere na-eme Matiu 12:33; Mak 7:20-23) N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na iche banyere omume rụrụ arụ ga-eme ka obi ghara iru gị ala, mebie akọnuche gị e ji Baịbụl zụọ, nweekwa ike imebi mmekọrịta gị na Chineke. (Ndị Efesọs 5:5; 1 Timoti 1:5, 19) Ebe ọ bụ na ntụrụndụ dị otú ahụ ga-akpatara gị nsogbu, kpebisie ike izere ya. * (Ndị Rom 12:2) Mee dị ka ọbụ abụ, bụ́ onye kpekuru Jehova ekpere, sị: “Mee ka anya m ghara ịhụ ihe na-abaghị uru.”—Abụ Ọma 119:37.
ka ị na-eche banyere ihe na-adịghị ọcha, mara na ntụrụndụ ahụ adịghị mma, ọ na-akpatakwa nsogbu. (NA-ACHỌ ỌDỊMMA NKE NDỊ ỌZỌ
20, 21. Olee otú 1 Ndị Kọrịnt 10:23, 24 si gbasa ịhọrọ ntụrụndụ dị mma?
20 Pọl kwuru otu n’ime ụkpụrụ Baịbụl ndị anyị kwesịrị ichebara echiche mgbe anyị na-ekpebi ihe anyị ga-eme. Ọ sịrị: “Iwu kwadoro ihe niile; ma ọ bụghị ihe niile na-ewuli elu. Ka onye ọ bụla na-achọ, ọ bụghị uru nke ya, kama nke onye nke ọzọ.” (1 Ndị Kọrịnt 10:23, 24) Olee otú ụkpụrụ ahụ si gbasa ịhọrọ ntụrụndụ dị mma? I kwesịrị ịjụ onwe gị, sị, ‘Olee otú ntụrụndụ m na-ahọrọ ga-esi emetụta ndị ọzọ?’
21 Akọnuche gị nwere ike ikwe ka ị na-enwe ụdị ntụrụndụ i weere na ọ bụ ‘ihe iwu kwadoro,’ ma ọ bụ na ọ dị mma. Otú ọ dị, ọ bụrụ na ị chọpụta na ọ dịghị Ndị Kraịst ndị ọzọ mma, bụ́ ndị akọnuche ha na-anaghị ekwe ka ha mee ihe ụfọdụ, i nwere ike ikpebi ịhapụ ya. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ị chọghị ‘imehie ụmụnna gị’—ma ọ bụkwanụ ‘imehie Kraịst,’ dị ka Pọl kwuru—site n’ime ka o siere Ndị Kraịst ibe gị ike karị ikwesị ntụkwasị obi n’ebe Chineke nọ. Buru ndụmọdụ ahụ n’uche, nke bụ́: ‘Unu abụla 1 Ndị Kọrịnt 8:12; 10:32) Ndụmọdụ ahụ Pọl nyere na-egosi ichebara ndị ọzọ echiche, amamihe dịkwa na ya. Ezi Ndị Kraịst taa na-anabata ya site n’izere ntụrụndụ nke nwere ike ịbụ ‘ihe iwu kwadoro,’ ma bụrụ nke na-adịghị ‘ewuli elu.’—Ndị Rom 14:1; 15:1.
ihe ịsụ ngọngọ.’ (22. Gịnị mere Ndị Kraịst ji anabata echiche dị iche iche n’ihe mmadụ kwesịrị ikpebiri onwe ya?
22 Ma, e nwere ihe ọzọ e kwesịrị ilebara anya n’ihe banyere ịchọ ọdịmma nke ndị ọzọ. Onye Kraịst nke akọnuche ya na-anaghị ekwe ka o mee ihe Ndị Kraịst ibe ya na-eme ekwesịghị isi ọnwụ na ndị niile nọ n’ọgbakọ Ndị Kraịst ga na-eme ihe o chere bụ́ ntụrụndụ kwesịrị ekwesị. Ọ bụrụ na o mee otú ahụ, ọ ga-adị ka ọkwọ ụgbọala nke siri ọnwụ na ndị ọkwọ ụgbọala ndị ọzọ niile ha na ya na-agba n’otu okporo ụzọ ga na-agba otú ọ chọrọ isi na-agba. Ikwu ụdị ihe ahụ adịghị mma. N’ihi inwe ịhụnanya Ndị Kraịst, onye akọnuche ya na-anaghị ekwe mee ihe ụfọdụ kwesịrị ịkwanyere Ndị Kraịst ibe ya ùgwù, bụ́ ndị otú ha si ele ntụrụndụ anya dị iche n’otú o si ele ya anya, ma ya abụrụ nke na-emebighị ụkpụrụ Ndị Kraịst. Ọ ga-esi otú ahụ ‘mee ka mmadụ niile mara na o nwere ezi uche.’—Ndị Filipaị 4:5; Ekliziastis 7:16.
23. Olee otú ị ga-esi achọpụta ma ntụrụndụ ị na-ahọrọ ọ̀ dị mma?
23 E gbuo ya nkenke, olee otú ị ga-esi achọpụta ma ntụrụndụ ị na-ahọrọ ọ̀ dị mma? Zere ụdị ntụrụndụ ọ bụla nke na-egosi omume rụrụ arụ n’ezoghị ihe ọ bụla ezo, ya bụ, ihe Okwu Chineke kwuru hoo haa na ọ dịghị mma. Soro ụkpụrụ Baịbụl ndị e nwere ike iji kọwaa ụdị ntụrụndụ ndị ahụ Baịbụl na-ekwughị ihe ọ bụla banyere ha. Zere ntụrụndụ nke ga-emebi akọnuche gị, kpebiekwa ịhapụ ụdị ntụrụndụ ndị nwere ike inye akọnuche ndị ọzọ nsogbu, karịsịa nke Ndị Kraịst ibe gị. Kpebisie ike ime otú ahụ ma wetara Chineke otuto. Ọ ga-emekwa ka gị na ezinụlọ gị nọrọ n’ịhụnanya ya.
^ par. 6 Otú e si dee ya n’asụsụ Grik bụ: “Ha anaghị atụ egwu Chineke n’anya ha.”
^ par. 19 Ị ga-ahụ ụfọdụ ụkpụrụ ndị ọzọ metụtara ntụrụndụ n’Ilu 3:31; 13:20; Ndị Efesọs 5:3, 4; na Ndị Kọlọsi 3:5, 8, 20.