Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Ndị Bịara Mgbakọ Kwesịrị Ịma

Ihe Ndị Bịara Mgbakọ Kwesịrị Ịma

BAPTIZIM Ọ bụrụ e nwere ndị ruru eru ime baptizim n’ọgbakọ unu, ndị okenye unu ahaziela otú a ga-esi eme ha baptizim ma e mechie ihe omume ụtụtụ Satọdee.

ONYINYE A na-asụgharị mgbakọ a n’ihe karịrị narị asụsụ anọ. Ọ bụrụ na i nye onyinye si gị n’obi, a ga-eji ya nye aka n’ọrụ a anyị na-arụ n’ụwa niile. I nwere ike inye onyinye n’Ịntanet ma ị gaa na donate.pr418.com. Obi dị anyị ezigbo ụtọ maka ihe ọ bụla i nyere. Òtù Na-achị Isi na-ekelekwa gị maka otú i si jiri onyinye gị na-akwado ihe ndị gbasara Alaeze Chineke.

ỤLỌ AKWỤKWỌ MAKA NDỊ NA-EKWUSA OZI ỌMA ALAEZE Ndị ọsụ ụzọ oge niile nọ n’agbata afọ iri abụọ na atọ na afọ iri isii na ise, ndị chọrọ ijikwu oge ha na-ejere Jehova ozi, kwesịrị ime ka odeakwụkwọ ọgbakọ ha mara. Ha ga-edejupụta fọm dị n’Ịntanet maka ndị chọrọ ịga Ụlọ Akwụkwọ Maka Ndị Na-ekwusa Ozi Ọma Alaeze.

Ọ bụ Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova haziri ya

© 2021 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania