Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe A Na-aga Ịkọ ná Nkebi nke 10

Ihe A Na-aga Ịkọ ná Nkebi nke 10

Jehova bụ Eze kachanụ n’eluigwe na ụwa. Kemgbe ụwa, ihe o kwuru na-eme, ọ ga na-emekwa ruo mgbe ebighị ebi. Dị ka ihe atụ, ọ napụtara Jeremaya mgbe a chọrọ igbu ya. Ọ napụtakwara Shedrak, Mishak na Abednego mgbe a tụbara ha n’ọkụ, napụtakwa Daniel n’olulu ọdụm. Jehova chebekwara Esta ka o nwee ike isi n’aka ya napụta ndị obodo ya. Ọ gaghị ekwe ka ihe ọjọọ dịgide ruo mgbe ebighị ebi. Ihe ndị e kwuru na Baịbụl gbasara otu nnukwu ihe a kpụrụ akpụ na otu nnukwu osisi Nebukadneza rọrọ ná nrọ gosiri na Alaeze Chineke ga-eme ka ihe ọjọọ niile kwụsị n’oge na-adịghị anya ma chịwa ụwa niile.

NÁ NKEBI A

ISI NKE 57

Jehova Eziga Jeremaya Ka O Kwusaa Okwu Ya

Ihe onye amụma a bụ́ obere nwa gwara ndị okenye Juda were ha ezigbo iwe.

ISI NKE 58

E Bibiri Jeruselem

Ndị Juda nọgidere na-ekpere arụsị, n’ihi ya, Jehova jụrụ ha.

ISI NKE 59

Ụmụ Okorobịa Anọ Erubere Jehova Isi

Ụmụ okorobịa Hibru ekpebisie ike ịna-erubere Jehova isi, ma mgbe ha nọ n’obí eze Babịlọn.

ISI NKE 60

Alaeze nke Ga-adịru Mgbe Ebighị Ebi

Daniel akọwaa ihe nrọ na-atụ ụjọ Nebukadneza rọrọ pụtara.

ISI NKE 61

Ha Akpọghị Isiala

Shedrak, Mishak, na Abednego jụrụ ịkpọrọ ihe eze Babịlọn ji ọlaedo kpụọ isiala.

ISI NKE 62

Alaeze E Ji Tụnyere Nnukwu Osisi

E ji nrọ ahụ Nebukadneza rọrọ gosi ihe ga-eme ya.

ISI NKE 63

Ihe E Dere n’Ahụ́ Ájá

Olee mgbe e dere ihe ndị ahụ n’ahụ́ ájá. Gịnịkwa ka ha pụtara?

ISI NKE 64

A Tụbara Daniel n’Olulu Ọdụm

Na-agwa Jehova okwu n’ekpere kwa ụbọchị ka Daniel.

ISI NKE 65

Esta Anapụta Ndị Obodo Ha

Ọ bụ eziokwu na Esta bụ onye mba ọzọ, bụrụkwa nwa na-enweghị nne na nna, o mechara bụrụ nwunye eze.

ISI NKE 66

Ezra Kụziri Iwu Chineke

Mgbe ndị Izrel gechara Ezra ntị, ha kwere Chineke nkwa pụrụ iche.

ISI NKE 67

Mgbidi Jeruselem

Nehemaya nụrụ na ndị iro ya chọrọ ịbịa mesie ha ike. Gịnị mere ọ tụghị ụjọ?