ISI NKE 69
Gebriel Eleta Meri
Elizabet nwere otu onye ikwu bi n’obodo Nazaret nke dị na Galili. Aha ya bụ Meri. E nwere otu nwa okorobịa kwere ya nkwa na ya ga-alụ ya. A na-akpọ ya Josef, onye ọkwá nkà. Mgbe Elizabet dị ime ọnwa isii, mmụọ ozi Gebriel bịakwutere Meri. Ọ gwara ya, sị: ‘Ndeewo Meri. Jehova emerela gị ihe ọma.’ Ma, ọ ghọtaghị ihe ihe a Gebriel kwuru pụtara. O gwaziri ya, sị: ‘Ị ga-atụrụ ime, mụọ nwa nwoke, ma gụọ ya Jizọs. Ọ ga-abụ Eze. Alaeze ya ga-adịru mgbe ebighị ebi.’
Meri gwara ya, sị: ‘Ma, amaghị m nwoke. Olee otú m ga-esi mụọ nwa?’ Gebriel sịrị ya: ‘E nweghị ihe Jehova na-agaghị emeli. Mmụọ nsọ ga-abịakwasị gị, gị atụrụ ime mụọ nwa nwoke. Elizabet, onye ikwu gị dịkwa ime.’ Meri agwazie ya, sị: ‘Abụ m ohu Jehova. Ka ihe a i kwuru meere m dị ka i kwuru.’
Mgbe mmụọ ozi ahụ lawara, Meri gawara n’otu obodo dị n’ugwu ka ọ hụ Elizabet. Mgbe o rutere, kelee Elizabet, nwa Elizabet bu n’afọ wụliri elu. Elizabet jupụtara na mmụọ nsọ ma kwuo, sị: ‘Meri, Jehova agọziela gị. Ihe ọma meere m na nne Onyenwe m bịara n’ụlọ m.’ Meri gwara ya, sị: ‘Eji m obi m niile na-eto Jehova.’ Meri na Elizabet nọrọ ọnwa atọ tupu ya alaghachi Nazaret.
Mgbe Josef matara na Meri dị ime, ọ chọrọ ịgwa ya na ọ gaghị alụzi ya n’ihi na o chere na ọ bụ nwoke ọzọ tụwara ya ime. Ma, otu mmụọ ozi gwara ya okwu ná nrọ, sị: ‘Atụla ụjọ ịlụ Meri. O nweghị ihe ọjọọ o mere.’ Ọ bụ ya mere Josef ji lụọ Meri ma kpọrọ ya laa n’ụlọ ya.
“Jehova emewo ihe niile masịrị ya n’eluigwe na n’ụwa.”—Abụ Ọma 135:6