Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 71

Jehova Chebere Jizọs

Jehova Chebere Jizọs

E nwere ndị bi n’ebe ọwụwa anyanwụ Izrel. Ha kweere na kpakpando nwere ike iduzi ha ụzọ. N’otu abalị, ụfọdụ n’ime ha hụrụ ihe yiri kpakpando na-egbuke egbuke n’eluigwe ka ọ nọ na-aga, ha esoro ya na-aga. Ihe a duuru ha gaa Jeruselem. Mgbe ha rutere, ha jụwara ndị mmadụ, sị: ‘Olee ebe nwa ahụ a mụrụ nke ga-abụ eze ndị Juu nọ? Anyị bịara ka anyị kpọọrọ ya isi ala.’

Mgbe Herọd, eze na-achị Jeruselem nụrụ banyere eze ọhụrụ a, obi kooro ya n’elu. Ọ jụrụ ndị isi nchụàjà, sị: ‘Olee ebe a sị na a ga-amụ onye a ga-abụ eze?’ Ha gwara ya, sị: ‘Ndị amụma kwuru na ọ ga-abụ na Betlehem.’ N’ihi ya, Herọd kpọrọ ndị ahụ si ebe Ọwụwa Anyanwụ bịa ma gwa ha, sị: ‘Gaanụ Betlehem ma chọpụta ebe nwa a nọ. Unu hụ ya, bịanụ gwa m. M chọkwara ịga kpọọrọ ya isi ala.’ Ma, ihe ahụ o kwuru abụghị eziokwu.

Ihe ahụ yiri kpakpando gawakwara ọzọ. Ndị ahụ si ebe ọwụwa anyanwụ sokwaara ya gawa Betlehem. Mgbe ọ kwụsịrị n’otu ụlọ dị na Betlehem, ha banyere na ya. Ha hụrụ Jizọs na Meri nne ya ebe ahụ. Mgbe ha hụrụ Jizọs, ha kpọọrọ ya isiala, nyekwa ya onyinye. Ihe ha nyere ya bụ ọlaedo, frankinsens, na mea. Ọ̀ bụ Jehova gwara ndị ahụ ka ha gaa chọọ Jizọs? Mba.

N’abalị ahụ, Jehova gwara Josef ná nrọ, sị: ‘Herọd chọrọ igbu Jizọs. Kpọrọ nwunye gị na nwa gị gbaga Ijipt. Nọrọnụ ebe ahụ ruo mgbe m ga-agwa unu lọghachi.’ Josef kpọọrọ nwunye ya na nwa ya gbaga Ijipt ozugbo.

Jehova gwakwara ndị ahụ si ebe Ọwụwa Anyanwụ ka ha ghara ịlaghachi na nke Herọd. Mgbe Herọd hụrụ na ha alọghachighị, ezigbo iwe were ya. Ebe ọ bụ na ọ mataghị ebe Jizọs nọ, o nyere iwu ka e gbuo ụmụntakịrị nwoke niile nọ na Betlehem ha na Jizọs bụ ọgbọ. Ma, tupu ihe a ana-eme, Jizọs nọzi n’Ijipt ebe ha na-agaghị agali mee ya ihe ọ bụla.

Ka oge na-aga, Herọd nwụrụ. Jehova agwa Josef, sị: ‘Ugbu a, laghachinụ Izrel n’ihi na o nweghịzi ihe ga-eme Jizọs.’ N’ihi ya, Josef kpọọrọ Meri na Jizọs laghachi Izrel ma gaa biri n’obodo Nazaret.

“Otú ahụ ka okwu m nke si n’ọnụ m pụta ga-adị . . . , ọ ga-emezukwa ihe m zigara ya ka o mee.”—Aịzaya 55:11