Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 92

Jizọs Apụta n’Ihu Ndị Na-egbu Azụ̀

Jizọs Apụta n’Ihu Ndị Na-egbu Azụ̀

Obere oge Jizọs pụtachara n’ihu ndịozi ya, Pita gawara igbu azụ̀ n’Oké Osimiri Galili. Tọmọs, Jems, Jọn na ndị na-eso ụzọ Jizọs ndị ọzọ sokwa ya gaa. Ha ji abalị niile gbalịa ka ha gbute azụ̀, ma o nweghị nke ha gbutere.

N’isi ụtụtụ echi ya, ha hụrụ otu nwoke guzo n’akụkụ mmiri. Nwoke ahụ kpọrọ ha ma jụọ ha, sị: ‘Ọ̀ nwere azụ̀ unu gbutere?’ Ha zara ya, sị: “Mba.” Ọ gwara ha, sị: “Wụnyenụ ụgbụ unu n’akụkụ aka nri nke ụgbọ unu.” Mgbe ha wụnyere ya, azụ̀ juru n’ụgbụ ha nke na ha enwelighị ike ịdọbata ya n’ụgbọ ha. Ozugbo ahụ, Jọn matara na ọ bụ Jizọs ma kwuo, sị: “Ọ bụ Onyenwe anyị.” Ozugbo o kwuru ihe a, Pita amaba n’ime mmiri gawa ebe ahụ Jizọs nọ. Ndị na-eso ụzọ Jizọs ndị ọzọ ji ụgbọ soro ya gawa.

Mgbe ha rutere n’akụkụ mmiri ahụ, ha hụrụ achịcha, hụkwa azụ̀ n’ọkụ a kwanyere ebe ahụ. Jizọs agwa ha ka ha weta ụfọdụ azụ̀ ha gbutere ka ha hụọkwa ha n’ọkụ. Ọ gwaziri ha, sị: ‘Bịanụ, rie nri ụtụtụ.’

Mgbe ha richara nri ụtụtụ, Jizọs jụrụ Pita, sị: ‘Ị̀ hụrụ m n’anya karịa igbu azụ̀?’ Ọ zara ya, sị: ‘Ee, Onyenwe Anyị, ị ma na ahụrụ m gị n’anya.’ Jizọs gwara ya, sị: ‘Na-azụ ụmụ atụrụ m.’ Ọ jụrụ Pita ọzọ, sị: ‘Pita, ị̀ hụrụ m n’anya?’ Ọ zakwara ya, sị: ‘Onyenwe Anyị, ị ma na ahụrụ m gị n’anya.’ Jizọs agwakwa ya, sị: “Na-azụ ụmụ atụrụ m.” Ọ jụkwara ya nke ugboro atọ. Ya ewute Pita. Ọ gwaziri Jizọs, sị: ‘Onyenwe anyị, ị maara ihe niile. Ị ma na m hụrụ gị n’anya.’ Jizọs agwa ya, sị: “Na-azụ ụmụ atụrụ m.” Ọ gwakwara Pita, sị: “Na-eso m.”

“[Jizọs] gwara ha, sị: ‘Soronụ m, m ga-eme unu ndị na-akụta mmadụ.’ Ozugbo ahụ, ha hapụrụ ụgbụ ha wee soro ya.”—Matiu 4:19, 20