Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 96

Jizọs Ahọrọ Sọl

Jizọs Ahọrọ Sọl

Sọl bụ nwa amaala Rom a mụrụ na Tasọs. Ọ bụ onye Farisii maara iwu ndị Juu nke ọma. Ọ kpọkwara Ndị Kraịst asị. Ọ na-aga n’ụlọ ha kpụrụ ha gaa tụba n’ụlọ mkpọrọ. Ọ nọdị na-ele ka ndị iwe ji, ji okwute tụgbuo otu onye na-eso ụzọ Jizọs aha ya bụ Stivin.

Ịkpụrụ Ndị Kraịst nọ na Jeruselem gaa tụba n’ụlọ mkpọrọ ezughịrị Sọl. Ọ gwara nnukwu onye nchụàjà ka o ziga ya na Damaskọs ka ya kpụrụkwa ndị nke nọ ebe ahụ. Mgbe Sọl rutewere Damaskọs, ìhè si n’elu nwuo gburugburu ya, ya adaa n’ala. Ọ nụrụ olu jụrụ ya, sị: ‘Sọl, gịnị mere i ji na-akpagbu m?’ Sọl ajụọ, sị: ‘Ị̀ bụ onye?’ Olu ahụ zara ya, sị: ‘Abụ m Jizọs. Banye na Damaskọs, a ga-agwa gị ihe ị ga-eme.’ Ozugbo ahụ, Sọl kpuru ìsì, e duruzie ya banye n’obodo ahụ.

E nwere otu Onye Kraịst bi na Damaskọs aha ya bụ Ananayas. Jizọs gwara ya n’ọhụụ, sị: ‘Gaa chọọ Sọl n’ụlọ Judas nke dị n’okporo àmà a na-akpọ Nke Kwụ Ọtọ.’ Ananayas gwara ya, sị: ‘Onyenwe Anyị, Anụla m ọtụtụ ihe banyere nwoke ahụ. Ọ na-atụba ndị na-eso ụzọ gị n’ụlọ mkpọrọ.’ Ma, Jizọs gwara ya, sị: ‘Gakwuru ya. Ahọrọla m ya ka ọ na-aga mba dị iche iche ekwusa ozi ọma.’

Ananayas gara ebe ahụ Sọl nọ. Mgbe ọ hụrụ ya, ọ sịrị ya: ‘Sọl nwanna m, Jizọs zitere m ka m mee ka ị hụwa ụzọ.’ Ozugbo ahụ, Sọl hụwara ụzọ. A kụziiri ya banyere Jizọs, mee ya baptizim, ya aghọọ onye na-eso ụzọ Jizọs. Ugbu a ọ ghọrọla Onye Kraịst, o sooro Ndị Kraịst ibe ya na-ekwusa ozi ọma n’ụlọ nzukọ. Olee otú i chere obi ga-adị ndị Juu mgbe ha hụrụ Sọl ka ọ na-akụziri ndị mmadụ banyere Jizọs? O juru ha anya. Ha ajụọ, sị: ‘Onye a ọ̀ bụghị nwoke ahụ na-ejide ndị na-eso ụzọ Jizọs?’

Sọl nọrọ na Damaskọs afọ atọ kwusaa ozi ọma. Ndị Juu bịaziri kpọọ ya asị, ma chọwa otú ha ga-esi egbu ya. Ma mgbe ụmụnna matara ihe ha chọrọ ime, ha nyeere ya aka ka ọ gbapụ. Ha tinyere ya na nkata ma si n’oghere dị na mgbidi obodo ahụ budata ya.

Mgbe Sọl laghachiri Jeruselem, ọ gara ka o sonyere ụmụnna ndị nọ ebe ahụ. Ma, ụjọ ya nọ na-atụ ha. Otu onye na-eso ụzọ Jizọs aha ya bụ Banabas nyeere ya aka kpọrọ ya gakwuru ndịozi ma mee ka ha ghọta na Sọl agbanweela. Sọl sooro ọgbakọ dị na Jeruselem kwusasiwe ozi ọma ike. O mechara zawa Pọl.

“Kraịst Jizọs bịara n’ụwa ịzọpụta ndị mmehie. N’ime ndị a, abụ m onye mbụ.”—1 Timoti 1:15