Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 100

Pọl na Timoti

Pọl na Timoti

E nwere otu nwa okorobịa nọ n’ọgbakọ dị na Listra aha ya bụ Timoti. Nna ya bụ onye Grik, ma nne ya bụ onye Juu. Aha nne ya bụ Yunis, aha nne nne ya abụrụ Lọịs. Ha si na mgbe Timoti dị obere kụziwere ya gbasara Jehova.

Mgbe Pọl gara kwusaa ozi ọma na nke ugboro abụọ ya n’obodo dị iche iche, ọ gara Listra. Ọ chọpụtara na Timoti hụrụ ụmụnna nọ na Listra n’anya, chọsiekwa ike inyere ha aka. Pọl gwara Timoti ka o soro ya gaa kwusawa ozi ọma. Pọl ji nwayọọ nwayọọ kụziere Timoti otú e si ezi ozi ọma na otú e si akụzi ihe.

Mmụọ nsọ nyeere Pọl na Timoti aka n’ebe niile ha gara zie ozi ọma. N’otu abalị, Pọl hụrụ ọhụụ ebe otu nwoke na-agwa ya ka ọ bịa Masedonia nyere ha aka. N’ihi ya, Pọl, Timoti, Saịlas na Luk gawara ebe ahụ ka ha kwusaa ozi ọma ma hiwe ọgbakọ dị iche iche.

Ọtụtụ ndị nọ na Masedonia nke dị na Tesalonaịka ghọrọ Ndị Kraịst. Ma, ọtụtụ ndị Juu malitere imere Pọl na ndị ya na ha so anyaụfụ. Ha kpọkọtara ìgwè mmadụ ma kpụrụ Pọl na ụmụnna ụfọdụ kpụgara ndị na-achị obodo. Ha gwara ha, sị: ‘Ndị a na-enupụrụ ọchịchị ndị Rom isi.’ Ihe a nwere ike ime ka e gbuo Pọl na Timoti. N’ihi ya, ha ji abalị gbaga Beria.

Ndị Beria chọsiri ike ịnụ ozi ọma. Ma ndị Grik ma ndị Juu nọ ebe ahụ ghọrọ Ndị Kraịst mgbe e ziri ha ozi ọma. Mgbe ụfọdụ ndị Juu si Tesalonaịka bịa ma mee ka e bido inye ụmụnna nsogbu, Pọl si Beria gawa Atens. Timoti na Saịlas nọgidere na Beria ma na-eme ka okwukwe ụmụnna sikwuo ike. Pọl mechara zighachi Timoti na Tesalonaịka ka ọ gbaa ụmụnna nọ ebe ahụ ume ka ha die nsogbu a na-enye ha. Pọl mechakwara ziga Timoti n’ọgbakọ ndị ọzọ ka ọ gbaa ha ume.

Pọl gwara Timoti, sị: ‘A ga-akpagbu ndị niile chọrọ ife Jehova.’ A kpagburu Timoti ma tụọ ya mkpọrọ n’ihi na ọ na-efe Jehova. Ma, obi dị ya ụtọ n’ihi na o mere ka o gosi na nsogbu agaghị emeli ka ya hapụ Jehova.

Pọl gwara Ndị Filipaị, sị: ‘Ana m ezitere unu Timoti. Ọ ga-akụziri unu otú unu ga-esi na-efe Jehova nakwa otú unu ga-esi na-ezi ozi ọma.’ Pọl ma na Timoti ga-arụ ọrụ a nke ọma. Ha abụọ bụ enyi, sorokwa jee ozi ọma ruo ọtụtụ afọ.

“Enweghị m onye ọzọ nke nwere ụdị obi o nwere, bụ́ onye ihe banyere unu ga-emetụ n’obi n’ezie. N’ihi na ndị ọzọ niile na-achọ ọdịmma nke onwe ha, ọ bụghị nke Kraịst Jizọs.”—Ndị Filipaị 2:20, 21