Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 16

Ònye Bụ Job?

Ònye Bụ Job?

E nwere otu nwoke na-efe Jehova n’obodo Ọz. Aha ya bụ Job. Ọ bụ ezigbo ọgaranya, nweekwa ọtụtụ ụmụ. Ọ na-emere ndị mmadụ ihe ọma. Ọ na-enyere ma ndị ogbenye ma ụmụ nwaanyị di ha nwụrụ, ma ụmụ na-enweghị nne na nna aka. Ma, ọ̀ pụtara na e nweghị mgbe nsogbu ga-abịara ya ebe ọ bụ na ọ na-eme ihe dị mma?

Job amaghị na Setan bụ́ Ekwensu nọ na-ele ya. Jehova gwara Setan, sị: ‘Ị̀ hụla ohu m Job? E nweghị onye dị ka ya n’ụwa. Ọ na-erubere m isi, ma na-eme ihe dị mma.’ Setan gwara Jehova, sị: ‘Ama m na Job na-erubere gị isi. Ị na-echebe ya ma na-agọzi ya. I nyere ya ala na ọtụtụ anụmanụ. Ọ bụrụ na ị napụ ya ihe ndị ahụ, ọ ga-akwụsị ịna-efe gị.’ Jehova gwara Setan, sị: ‘I nwere ike ịnwa Job. Ma egbukwala ya.’ Gịnị mere Jehova ji kwere ka Setan nwaa Job? Ọ bụ na obi siri Jehova ike na Job ga-erubere ya isi.

Setan jizi ọtụtụ ihe nwaa Job. Ihe mbụ bụ na o mere ka ndị Siba zuru atụrụ na ịnyịnya ibu Job. O mekwara ka ọkụ regbuo atụrụ ya niile. Ndị Kaldia bịara zuru kamel niile Job nwere. E gburu ndị na-azụrụ ya atụrụ. Nke kacha njọ Setan mere Job bụ na o mere ka ụlọ kụgbuo ụmụ Job niile ebe ha na-eri ihe. Ihe ndị a gbawara Job obi, ma ọ kwụsịghị ife Jehova.

Setan chọrọ ka Job takwuo ahụhụ. N’ihi ya, o mere ka etuto too ya n’ahụ́ ya niile. Nke a mere ka ahụ́ na-egbu Job ezigbo mgbu. Job amaghị ihe mere ihe ndị a ji na-eme ya. Ma, ihe ndị a emeghị ka Job kwụsị ife Jehova. Mgbe Chineke hụrụ na Job akwụsịghị ife ya n’agbanyeghị ihe ndị a mere ya, obi tọrọ ya ezigbo ụtọ.

Ihe ọzọ Setan mere bụ na o zitere ụmụ nwoke atọ ka ha bịa nwaa Job. Ha gwara job, sị: ‘Ọ ga-abụ na i meela ihe ọjọọ ma chọọ izo ya. Chineke na-ata gị ahụhụ maka ya.’ Job kwuru, sị: ‘E nweghị ihe ọjọọ ọ bụla m mere.’ Job malitere iche na ọ bụ Jehova kpataara ya nsogbu ndị a niile. O kwuru na ihe Chineke na-eme ya adịghị mma.

Otu nwa okorobịa aha ya bụ Elaịhu gbara nnọọ nkịtị na-ege ihe ha na-ekwu. Mgbe ha kwuchara, ọ sịrị ha: ‘Ihe unu kwuru adịghị mma. Jehova dị elu karịa otú anyị nwere ike ịmata. Ọ gaghị emeli ihe ọjọọ. Ọ na-ahụ ihe niile ma na-enyere ndị nwere nsogbu aka.’

Jehova gwaziri Job, sị: ‘Olee ebe ị nọ mgbe m kere eluigwe na ụwa? Gịnị mere i ji kwuo na m na-eme gị ihe ọjọọ? I kwuola, ma ị maghị ihe mere ihe ụfọdụ ji na-eme.’ Job kwetara na ihe ndị ya kwuru adịghị mma. O kwuru, sị: ‘Emehiela m. Anụla m banyere gị, ma ugbu a ka m matara gị nke ọma. O nweghị ihe karịrị gị. Biko, gbaghara m maka ihe ndị m kwuru.’

Mgbe Setan nwachara Job, Jehova mere ka Job gbakee. O mere ka o nwee ihe karịa otú o nweburu. Job biri ogologo ndụ, obi tọkwara ya ụtọ. Jehova gọziri Job maka na o rubeere ya isi ma mgbe nsogbu bịaara ya. Ị̀ ga-achọ ịna-efe Jehova ka Job, ihe ọ sọkwara ya mee?

“Unu anụwo banyere ntachi obi Job, unu ahụwokwa ihe Jehova mesịrị mee.”​—Jems 5:11