Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 14

Otu Ohu nke Rubeere Chineke Isi

Otu Ohu nke Rubeere Chineke Isi

Josef bụ otu n’ime ụmụ Jekọb ndị ikpeazụ. Ụmụnne ya ndị tọrọ ya hụrụ na nna ha hụrụ ya n’anya karịa ha. Olee otú i chere obi dị ha maka ihe a? Ha nweere Josef anyaụfụ, kpọọkwa ya asị. Josef rọrọ nrọ ndị pụrụ iche ma kọọrọ ya ụmụnne ya. Ha ghọtara na nrọ ndị ahụ pụtara na otu ụbọchị na ha ga-akpọrọ Josef isiala. Nke a mere ka ha kpọkwuo ya asị.

Otu ụbọchị, ụmụnne Josef nọ na-azụ atụrụ n’ebe dị nso n’obodo Shikem. Jekọb zigara Josef ka ọ gaa mata ma ahụ́ ọ̀ dịkwa ha. Mgbe ha hụrụ ya n’ebe dị anya ka ọ na-abịa, ha gwara ibe ha, sị: ‘Lee! Ọrọ nrọ abịawala. Bịanụ ka anyị gbuo ya.’ Ha jidere ya ma tụba ya n’olulu mmiri nke miri emi. Ma otu n’ime ụmụnne ya aha ya bụ Juda, sịrị: ‘Ka anyị ghara igbu ya. Ka anyị resị ya ndị ọzọ ka ọ gbawara ha ohu.’ N’ihi ya, ha resịrị ya ndị ahịa si Midian na-aga Ijipt. Ha rere ya mkpụrụ ego ọlaọcha iri abụọ.

Ụmụnne Josef chịịrị uwe mwụda ya, bịanye ya n’ọbara ewu ma chịgara ya nna ha. Ha gwara nna ha, sị: ‘Ihe a ọ̀ bụ uwe mwụda nwa gị?’ N’ihi ya, Jekọb chere na anụ ọhịa adọgbuola Josef. Obi gbawara ya. E nweghị onye na-akasili ya obi.

Mgbe Josef na ndị ahụ zụụrụ ya rutere Ijipt, otu onye a ma ama aha ya bụ Pọtịfa zụụrụ ya ka ọ gbawara ya ohu. Ma Jehova nọnyeere Josef. Pọtịfa chọpụtara na Josef na-arụsi ọrụ ike, nakwa na ọ bụ onye e kwesịrị ịtụkwasị obi. Obere oge, Pọtịfa mere ya onye na-elekọta ihe niile o nwere.

Nwunye Pọtịfa hụrụ na Josef mara mma ma gbasie ike. N’ụbọchị ọ bụla, ọ na-agwa Josef ka ya na ya kwaa iko. Olee ihe Josef ga-eme? O kweghị eme ihe a o kwuru. Josef gwara ya, sị: ‘Agaghị m eme ya, ọ bụ ihe ọjọọ. Nna m ukwu tụkwasịrị m obi, ị bụkwa nwunye ya. Ọ bụrụ na mụ na gị akwaa iko, m ga-emehie Chineke.’

Otu ụbọchị, nwunye Pọtịfa ji ike chọọ ka ya na Josef kwaa iko. O jidere Josef n’uwe, ya ahapụrụ ya uwe ya gbapụ n’èzí. Mgbe Pọtịfa lọtara, nwunye ya gwara ya na Josef chọrọ idina ya n’ike. Ihe a ọ gwara ya abụghị eziokwu. Ihe a mere ka ezigbo iwe wee Pọtịfa, ya atụba Josef n’ụlọ mkpọrọ. Ma Jehova echefughị Josef.

“Ya mere, wedanụ onwe unu ala n’okpuru aka dị ike nke Chineke, ka o wee bulie unu elu mgbe oge ruru.”​—1 Pita 5:6