Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 17

Mozis Ahọrọ Ife Jehova

Mozis Ahọrọ Ife Jehova

Ihe a na-akpọ ezinụlọ Jekọb n’Ijipt bụ ụmụ Izrel. Mgbe Jekọb na Josef nwụrụ, Fero ọhụrụ malitere ịchị Ijipt. Ụjọ tụrụ ya na ndị Izrel adịwala ọtụtụ ma dị ike karịa ndị Ijipt. N’ihi ya, o mere ka ndị Izrel bụrụ ndị ohu ha. Ọ manyere ha ịna-akpụ brik na ịrụsiri ha ọrụ ike n’ugbo. Ka ha na-emesi ndị Izrel ike, ka ndị Izrel na-adịkwu ọtụtụ. Fero achọghị ka ndị Izrel dịrị ọtụtụ, ọ bụ ya mere o ji nye iwu ka e gbuo ụmụ nwoke niile ndị Izrel mụrụ ọhụrụ. Nke a mere ka ezigbo ụjọ tụwa ndị Izrel.

Otu nwaanyị onye Izrel aha ya bụ Jokebed mụrụ otu nwatakịrị nwoke mara mma. O tinyere ya n’otu nkata ma zoo ya n’etiti ahịhịa amị dị n’akụkụ Osimiri Naịl. Nwanne nwatakịrị a aha ya bụ Miriam nọ nso ka ọ mara ihe ga-eme ya.

Mgbe ada Fero bịara ịsa ahụ́ n’osimiri ahụ, ọ hụrụ nkata ahụ. O mepere ya, hụ nwa ọhụrụ na-ebe ákwá n’ime ya, ya emetere ya ebere. Miriam jụrụ ya, sị: ‘Ị̀ chọrọ ka m gaa kpọọrọ gị nwaanyị ga-azụrụ gị nwa a?’ Mgbe ada Fero sịrị ya gaa kpọọ, ya agaa kpọọ nne ya Jokebed. Ada Fero gwara Jokebed, sị: ‘Kuru nwa a zụọrọ m, m ga-akwụ gị ụgwọ.’

Mgbe nwa ahụ tolitewere, Jokebed kpọọrọ ya kpọnye ada Fero. Ada Fero agụọ ya Mozis ma zụọ ya ka ọ bụrụ nwa ya. Mozis ghọrọ ọkpara eze, a na-enyekwa ya ihe ọ bụla ọ chọrọ. Ma, o chefughị Jehova. Mozis ma na ya bụ onye Izrel, ọ bụghị onye Ijipt. Ọ họọrọ ife Jehova.

Mgbe Mozis dị afọ iri anọ, ọ chọrọ inyere ndị obodo ya aka. Otu ụbọchị, ọ hụrụ ebe onye Ijipt na-eti onye Izrel ihe, ya etigbuo onye Ijipt ahụ, ma zoo ozu ya n’ime ájá. Mgbe Fero nụrụ ya, ya achọọ igbu Mozis. Mozis agbalaa obodo a na-akpọ Midian. Jehova lekọtara ya n’ebe ahụ.

‘Okwukwe ka Mozis ji jụ ka a kpọọ ya nwa ada Fero, ọ họọrọ ka e megbukọta ya na ndị Chineke.’​—Ndị Hibru 11:24, 25