Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 33

Rut na Neomi

Rut na Neomi

Mgbe nri kọrọ n’Izrel, otu onye Izrel aha ya bụ Neomi na di ya, nakwa ụmụ ha abụọ kwagara Moab. Di Neomi mechara nwụọ. Ụmụ ya lụrụ Rut na Ọpa. Rut na Ọpa bụ ndị Moab. Ọ dị mwute na ụmụ Neomi mechakwara nwụọ.

Mgbe Neomi nụrụ na nri adịkwala n’Izrel, o kpebiri ịlaghachi Izrel. Rut na Ọpa sokwa ya. Ma, mgbe ha na-ala, Neomi gwara ha, sị: ‘Unu hụrụ ụmụ m n’anya, hụkwa mụnwa n’anya. Achọrọ m ka unu lụgharịa di. Laghachinụ Moab.’ Rut na Ọpa gwara ya, sị: ‘Anyị hụrụ gị n’anya. Anyị achọghị ịhapụ gị.’ Neomi nọ na-agwa ha ka ha lawa. Ọpa mechara lawa, ma Rut ekweghị ala. Neomi gwara Rut, sị: ‘Ọpa alawala ka ọ lakwuru ndị ebe ha na chi ya. Soro ya lawa. Lakwuru ndị ebe unu.’ Ma Rut gwara ya, sị: ‘M gaghị ahapụ gị. Ndị gị ga-abụ ndị m, Chineke gị ga-abụkwa Chineke m.’ Olee otú i chere obi dị Neomi mgbe Rut gwara ya ihe a?

Rut na Neomi rutere Izrel n’oge a na-ewe ọka bali n’ubi. Otu ụbọchị, Rut gara ka ọ tụtụkọta ọka n’ubi otu nwoke aha ya bụ Boaz. Boaz bụ nwa Rehab. Boaz nụrụ na Rut bụ onye Moab, nakwa na o kweghị ahapụ Neomi maka na ọ hụrụ ya n’anya. Boaz gwara ndị na-arụrụ ya ọrụ ka ha hapụ ọka ụfọdụ n’ubi ka Rut tụtụkọta ha.

Na mgbede ụbọchị ahụ, Neomi jụrụ Rut, sị: ‘N’ubi onye ka ị rụrụ ọrụ taa?’ Rut sịrị ya: ‘Ọ bụ n’ubi otu nwoke aha ya bụ Boaz.’ Neomi gwara ya, sị: ‘Boaz bụ otu n’ime ndị ikwu di m. Soro ụmụ agbọghọ ndị ọzọ na-arụ ọrụ n’ubi ya. O nweghị ihe ga-eme gị.’

Rut rụgidere ọrụ n’ubi Boaz ruo mgbe e wechara ihe ubi. Boaz hụrụ na Rut rụsiri ọrụ ike, bụrụkwa ezigbo nwaanyị. N’oge ahụ, ọ bụrụ na nwoke anwụọ n’amụtaghị nwa, otu onye ikwu ya ga-alụ nwunye ya. Ọ bụ ya mere Boaz ji lụọ Rut. Ha mụtara otu nwa nwoke aha ya bụ Obed. Obed mechara bụrụ nna nna Eze Devid. Obi tọrọ ndị enyi Neomi ụtọ maka nwa a Rut mụrụ. Ha gwara Neomi, sị: ‘Jehova bu ụzọ nye gị Rut, onye hụrụ gị n’anya. Ugbu a, i nweela nwa nwa. Ka otuto dịrị Jehova.’

“E nwere enyi nke na-arapara n’ahụ́ karịa nwanne.”—Ilu 18:24