Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 55

Mmụọ Ozi Jehova Anapụta Hezekaya

Mmụọ Ozi Jehova Anapụta Hezekaya

Ndị Asiria weghaara Alaeze ebo iri nke Izrel. Ugbu a, Senakerib, eze Asiria na-achọkwa iweghara alaeze ebo abụọ nke Juda. O ji nwayọọ nwayọọ na-ewekọrọ obodo ndị dị na Juda. Ma, obodo ọ chọsiri ike ka o weghara bụ Jeruselem. Ihe ọ na-amaghị bụ na Jehova na-eche Jeruselem nche.

Hezekaya, eze Juda nyere Senakerib nnukwu ego ka ọ hapụ iweghara Jeruselem. N’agbanyeghị na Senakerib naara ya ego ahụ, o zigakwara ndị agha ya ka ha gaa bibie Jeruselem. Ka ndị agha Asiria na-abịaru Jeruselem nso, ezigbo ụjọ jidere ndị Juda. Hezekaya agwa ha, sị: ‘Unu atụla ụjọ. Ndị agha Asiria siri ike, ma Jehova ga-eme ka anyị dị ike karịa ha.’

Senakerib zigara Rabshake ka ọ gaa Jeruselem menye Hezekaya na ndị obodo ya ụjọ. Rabshake gara guzoro n’akụkụ mgbidi Jeruselem, ma malite iji olu dara ụda na-agwa ha, sị: ‘Jehova agaghị anapụtali unu. Unu ekwekwala ka Hezekaya rafuo unu. E nweghị chi ga-anapụtali unu n’aka anyị.’

Hezekaya jụrụ Jehova ihe ya ga-eme. Jehova gwara ya, sị: ‘Ekwela ka ihe a Rabshake na-ekwu menye gị ụjọ. Senakerib agaghị eweghara Jeruselem.’ Senakerib mechara zigara Hezekaya akwụkwọ ozi. N’akwụkwọ ozi ahụ, ọ sịrị Hezekaya: ‘Chịlierenụ anyị aka elu. Jehova agaghị azọpụtali unu n’aka anyị.’ Hezekaya rịọrọ Chineke, sị: ‘Jehova, biko napụta anyị, ka onye ọ bụla mara na naanị gị bụ ezi Chineke.’ Jehova gwara ya, sị: ‘Eze Asiria agaghị abata na Jeruselem. M ga-echebe obodo m.’

Senakerib chere na o nweghị ihe ga-eme ka ọ ghara iweghara Jeruselem. Ma, n’otu abalị, Jehova zigara otu mmụọ ozi ya n’ebe ndị agha Asiria mara ụlọikwuu. Mmụọ ozi ahụ gburu ndị agha Asiria dị otu narị puku na puku iri asatọ na puku ise. Ndị agha Senakerib niile nwụrụ n’otu abalị. O nweghị ihe ọzọ Senakerib ma ọ ga-eme, ya ejiri ihere lawa n’ụlọ ya n’ihi na e meriela ya. Jehova napụtara Hezekaya na Jeruselem dum otú ahụ o kwuru na ọ ga-eme. Ọ bụrụ na ị nọ na Jeruselem n’oge ahụ, ị̀ gaara atụkwasị Jehova obi na ọ ga-azọpụta ndị ya?

“Mmụọ ozi Jehova na-ama ụlọikwuu gburugburu ndị na-atụ egwu ya, ọ na-anapụtakwa ha.”—Abụ Ọma 34:7