Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Akwụkwọ Ozi Si n’Aka Òtù Na-achị Isi

Akwụkwọ Ozi Si n’Aka Òtù Na-achị Isi

Ezi Ụmụnna Anyị:

Ebe anyị bụ ndị na-efe Jehova, anyị ji Okwu ya bụ́ Baịbụl kpọrọ ihe. Anyị kwetasiri ike na akụkọ ndị a kọrọ na ya bụ eziokwu, nakwa na ọ bụrụ na anyị emee ihe Baịbụl kwuru, ọ ga-abara anyị uru ná ndụ. O dokwara anyị anya na Baịbụl Jehova nyere anyị gosiri na ọ hụrụ anyị n’anya. (Abụ Ọma 119:105; Luk 1:3; 1 Jọn 4:19) Anyị chọsiri ike inyere ndị mmadụ aka ịmụta eziokwu magburu onwe ya dị n’Okwu Chineke. N’ihi ya, obi dị anyị ụtọ iwepụtara unu akwụkwọ a aha ya bụ “Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl.” Ka anyị kọọrọ unu ihe ụfọdụ gbasara akwụkwọ a.

Ndị e bu n’obi dee akwụkwọ a karịchaa bụ ụmụaka. Ma, e nwekwara ike iji ya kụziere ndị toro eto chọrọ ịmụtakwu Baịbụl ihe. Ebe ọ bụ na e dere Baịbụl maka mmadụ niile, o doro anya na anyị niile ga-amụta ihe n’akụkọ ndị a kọrọ na Baịbụl ma anyị gụọ ha. Ọ ga-emekwa ka anyị nwee ezigbo obi ụtọ.

Ihe ndị a kọrọ n’akwụkwọ a si na Baịbụl. A malitere mgbe Chineke kere mmadụ. A gbara mbọ dee akwụkwọ a otú ihe ndị a kọrọ na Baịbụl ga-adị mfe nghọta. A gbalịkwara dee ya n’usoro ha si mee.

Ihe e mere n’akwụkwọ a abụghị naanị ịkọ akụkọ ndị dị na Baịbụl. Kama, e dere ihe ndị dị na ya, seekwa foto ndị dị na ya otú ga-enyere anyị aka ịghọta otú ihe ndị a kọrọ si mee, nakwa otú obi dị ndị a kọrọ gbasara ha mgbe ihe ndị ahụ na-eme.

Akwụkwọ a ga-enyere anyị aka ịhụ ihe Baịbụl kwuru gbasara ndị rubeere Jehova isi na ndị na-erubereghị ya isi. Anyị ga-amụtakwa ihe n’ihe ndị a kọrọ gbasara ha. (Ndị Rom 15:4;1 Ndị Kọrịnt 10:6) Akwụkwọ a nwere nkebi iri na anọ. Na mbido nkebi nke ọ bụla, e dere ihe anyị ga-amụta na ya.

Ọ bụrụ na ị bụ nne ma ọ bụ nna, o nwere ike ị gụọrọ nwa gị otu n’ime isiokwu ndị dị na akwụkwọ a, gị na ya ekwurịta otú foto ndị dị na ya si gbasa ihe ndị a kọrọ. Unu gụchaa isiokwu nke ọ bụla, gị na ya agụọkwa amaokwu ndị e si na ha nweta ihe ndị a kọrọ na ya. Nyere nwa gị aka ka ọ hụ otú ihe e kwuru na Baịbụl si daba n’ihe a kọrọ n’isiokwu nke ọ bụla. Anyị nwekwara ike ime otu ihe a mgbe anyị na-enyere onye torola eto aka ịmata isi ihe Baịbụl na-ekwu.

Anyị na-atụ anya na akwụkwọ a ga-enyere ma ụmụntakịrị ma ndị torola eto chọrọ ịmụta banyere Chineke aka ịmata ihe Okwu Chineke na-ekwu, nakwa ime ihe ndị o kwuru. Ihe ndị a nwere ike ime ka ha bịa soro anyị na-efe Jehova ma soro n’ezinụlọ nke ndị na-efe ya ọ hụrụ n’anya.

Anyị bụ ụmụnna unu,

Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova