Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤKỌ NKE 10

Oké Iju Mmiri Ahụ

Oké Iju Mmiri Ahụ

NDỊ na-anọghị n’ime ụgbọ ahụ nọ na-eme ihe ndị dịịrị ha n’ụbọchị. Ha ekwebeghị na Iju Mmiri ahụ ga-abịa. Ọ ghaghị ịbụ na ha chịịrị ọchị gaa n’ihu, ọbụna karịa otú ha na-achịbu. N’oge na-adịghịkwa anya, ọchị gwụrụ ha n’ezé.

Na mberede, mmiri malitere izo. O si na mbara igwe na-ezo, dị ka mgbe ị na-awụpụ mmiri na bọket. Noa kwuru eziokwu! Ma oge agaala onye ọ bụla ọzọ ịbanye n’ụgbọ ahụ. Jehova emechisiwo ọnụ ụzọ ya ike.

Ọ dịghị anya, mmiri wee kpuchie ndagwurugwu niile. Mmiri ahụ wee yie oké osimiri. Ọ kwaturu osisi, nupụsịa oké nkume, meekwa oké mkpọtụ. Egwu tụrụ ndị mmadụ. Ha wee rịgoro n’elu ugwu. Ewoo, ọ ga-adịzi ha ka ya bụrụ na ha ṅara Noa ntị wee bata n’ụgbọ ahụ mgbe ọnụ ụzọ ka gheere ha oghe! Ma ugbu a, oge agaala.

Mmiri ahụ nọkwa na-eto n’ike n’ike. Mmiri ahụ zoro ụbọchị iri anọ, ehihie na abalị. O kpuchiri akụkụ nnukwu ugwu niile, ọ dịghịkwa anya, ya erikpuo ugwu ndị kasị elu. Dị ka Chineke kwuru, ụmụ mmadụ na ụmụ anụmanụ niile na-anọghị n’ime ụgbọ ahụ nwụrụ. Ma ọ dịghị ihe mere ndị nọ n’ime ụgbọ ahụ.

Noa na ụmụ ya rụrụ ezigbo ọrụ n’iwu ụgbọ ahụ. Mmiri ahụ buliri ya elu, o wee na-ese n’elu mmiri. Otu ụbọchị, mgbe mmiri ozuzo ahụ kwụsịrị, anwụ malitere ịcha. Nke ahụ dị nnọọ mma nkiri. Ihe e nwere bụ naanị otu oké osimiri nke zuru ebe niile. Naanị ihe ọzọ a pụrụ ịhụ bụ ụgbọ ahụ nke na-ese n’elu ya.

Ndị dike ahụ anọghịzikwa. Ha agaghị anọkwa ọzọ imerụ ụmụ mmadụ ahụ́. Ma ha ma nne ha ma ndị niile ọzọ mere ihe ọjọọ, nwụrụ. Ma gịnị mere ndị bụ́ nna ha?

Ndị bụ́ nna ndị dike ahụ abụghị ụmụ mmadụ ndị dị ka anyị. Ha bụ ndị mmụọ ozi ndị rịdatara ibi dị ka mmadụ n’ụwa. Ya mere, mgbe Iju Mmiri ahụ bịara, ha esoghị ndị niile ọzọ nwụọ. Ha yipụrụ ahụ́ mmadụ ahụ ndị ha mere, wee laghachi n’eluigwe dị ka ndị mmụọ ozi. Ma e kweghịzi ka ha soro n’ezinụlọ Chineke nke ndị mmụọ ozi mejupụtara. Ha ghọrọ ndị mmụọ ozi Setan. A kpọrọ ha ndị mmụọ ọjọọ n’ime Bible.

Chineke wee mee ka ifufe fee, mmiri ahụ wee malite ịta. Ọnwa ise ka e mesịrị, ụgbọ ahụ wee dọrọ n’elu ugwu. Mgbe ọtụtụ ụbọchị gasịrị, ndị nọ n’ụgbọ ahụ lepụrụ anya ma hụ elu ugwu dị iche iche. Mmiri ahụ nọgidere nnọọ na-atalata.

Mgbe ahụ, Noa si n’ụgbọ ahụ zipụ nnụnụ ojii a na-akpọ ugoloọma. O fegharịrị ruo nwa oge wee laghachi, n’ihi na ọ hụghị ebe dị mma ọ ga-ebekwasị. O wee na-apụ, na-alọtakwa. Mgbe ọ bụla ọ lọtara, ọ na-ezu ike n’elu ụgbọ ahụ.

Noa chọrọ ịhụ ma mmiri ahụ niile ọ̀ tawo n’elu ala, o wee si n’ụgbọ ahụ zipụ nduru ọzọ. Nduru ahụ lọghachikwara n’ihi na ọ hụghị ebe ọ ga-ebe. Noa zipụrụ ya nke ugboro abụọ, o wee welata otu akwụkwọ oliv nke ọ kpụ n’ọnụ ya. Noa wee mara na mmiri ahụ atalatawo. Noa zipụrụ nduru ahụ nke ugboro atọ, o wee hụ ebe kọrọ akọ ọ ga-ebi.

Chineke gwara Noa okwu. Ọ sịrị ya: ‘Si n’ụgbọ ahụ pụta. Duru ezinụlọ gị na anụmanụ niile.’ Ha anọwo n’ime ụgbọ ahụ ihe karịrị otu afọ. Anyị pụrụ iche n’echiche otú obi si dị ha ụtọ ịpụta ọzọ n’elu ala, wee dịrị ndụ!