Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤKỌ NKE 4

Ihe Mere E Ji Chụpụ Ha n’Ebe Obibi Ha

Ihe Mere E Ji Chụpụ Ha n’Ebe Obibi Ha

LEE ihe na-eme ugbu a. A na-achụpụ Adam na Iv n’ogige Iden ahụ mara mma. Ị̀ ma ihe kpatara ya?

Ọ bụ n’ihi na ha mere ihe dị nnọọ njọ. Ya mere, Jehova nyere ha ahụhụ. Ị̀ ma ihe ọjọọ Adam na Iv mere?

Ha mere ihe Chineke sịrị ha emela. Chineke gwara ha ka ha na-eri mkpụrụ osisi ndị dị n’ogige ahụ. Ma ọ sịrị ha erila mkpụrụ nke otu osisi, ka ha ghara ịnwụ. O debere osisi ahụ ịbụ nke ya. Anyị maara na ọ bụ ihe ọjọọ iwere ihe onye ọzọ, ọ̀ bụ na anyị amaghị? Ma gịnị mere?

Otu ụbọchị, mgbe Iv nọ n’ogige ahụ naanị ya, otu agwọ gwara ya okwu. Nke ahụ dị nnọọ ịtụnanya! Ọ gwara Iv ka o rie mkpụrụ osisi ahụ Chineke sịrị ha erila. Mgbe Jehova kere agwọ, o keghị ha ikwu okwu. Ihe nke a pụtara bụ na ọ dị onye ọzọ nke mere ka agwọ ahụ kwuo okwu. Ònye ka ọ bụ?

Ọ bụghị Adam. Ọ ghaghị ịbụ otu onye n’ime ndị ahụ Jehova kere mgbe dị anya tupu ya ekee ụwa. Ndị ahụ bụ ndị mmụọ ozi, anyị apụghịkwa ịhụ ha. Otu n’ime ndị mmụọ ozi a ghọrọ onye dị nnọọ mpako. Ọ malitere iche na ya kwesịrị ịdị na-achị achị dị ka Chineke. Ọ chọrọ ka ụmụ mmadụ na-ege ya ntị kama ige Jehova ntị. Ọ bụ mmụọ ozi a mere ka agwọ ahụ kwuo okwu.

Mmụọ ozi a duhiere Iv. Mgbe ọ gwara ya na ọ ga-adị ka Chineke ma o rie mkpụrụ osisi ahụ, Iv kweere. O wee rie ya, Adam rikwara. Adam na Iv nupụụrụ Chineke isi, nke a mere e ji chụpụ ha n’ebe obibi ha mara mma.

Ma otu ụbọchị, Chineke ga-ahụ na e mere ka ala dum maa mma dị ka ogige Iden. E mesịa, anyị ga-amụ banyere ụzọ ị pụrụ isi kere òkè n’ime ka ọ dị otú ahụ. Ma ugbu a, ka anyị chọpụta ihe mere Adam na Iv.