Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤKỌ NKE 53

Nkwa Jefta Kwere

Nkwa Jefta Kwere

Ọ̀ DỊTỤWO mgbe i kwere nkwa, ya e mesịa siere gị ike imezu? Nwoke nke nọ na foto a mere otú ahụ, ọ bụkwa ya mere o ji nọrọ ná mwute. Nwoke ahụ bụ onyeikpe dị ike nke Izrel nke aha ya bụ Jefta.

Jefta nọ ndụ n’oge ụmụ Izrel na-adịghị efekwa Jehova ofufe. Ha malitere ọzọ ime ihe ọjọọ. Jehova wee kwere ka ndị Amọn na-emegbu ha. Nke a mere ka ụmụ Izrel kpọkuo Jehova, na-asị: ‘Anyị emehiewo megide gị. Biko, zọpụta anyị!’

Ihe ọjọọ ndị ha mere wutere ha. Ha gosiri na o wutere ha site n’ịmaliteghachi ife Jehova ofufe. N’ihi ya, Jehova maliteghachiri inyere ha aka.

Ụmụ Izrel họpụtara Jefta ibuso ndị Amọn ọjọọ ahụ agha. Jefta chọsiri ike ka Jehova nyere ya aka n’agha ahụ. N’ihi ya, o kwere Jehova nkwa, sị: ‘Ọ bụrụ na i mee ka m merie ndị Amọn, onye mbụ nke ga-esi n’ụlọ m pụta ịbịa zute m mgbe m si ná mmeri ahụ na-alọta, m ga-enye gị ya.’

Jehova gere ntị ná nkwa Jefta kwere, o wee nyere ya aka inwe mmeri. Mgbe Jefta na-alọta, ị ma onye mbụ pụtara izute ya? Ọ bụ ada ya, naanị otu nwa o nwere. ‘Ewoo, ada m!’ ka Jefta tiri ná mkpu. ‘Lee ihe mwute ị na-akpatara m. Ma ekwewo m Jehova nkwa, aghaghịkwa m imezu ya.’

Mgbe ada Jefta nụrụ banyere nkwa ahụ, o wutekwara ya na mbụ. N’ihi na ọ pụtara na ọ ga-ahapụ nna ya na ndị enyi ya. Ma, ọ ga-eji oge fọdụrụ ná ndụ ya na-ejere Jehova ozi n’ụlọikwuu ya dị na Shaịlo. N’ihi ya, ọ sịrị nna ya: ‘Ọ bụrụ na i kwewo Jehova nkwa, ị ghaghị imezu ya.’

Ya mere, ada Jefta jere Shaịlo, o weere oge fọdụrụ ná ndụ ya na-ejere Jehova ozi n’ụlọikwuu ya. Ụbọchị anọ n’ime afọ ọ bụla, ndị inyom Izrel na-eje eleta ya n’ebe ahụ, ha na ya na-anọrịkwa. Ha hụrụ ada Jefta n’anya n’ihi na ọ bụ nnọọ ezigbo ohu Jehova.