Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

NKEBI NKE 7

Site Mgbe A Kpọlitere Jizọs n’Ọnwụ Ruo Mgbe A Tụrụ Pọl Mkpọrọ

Site Mgbe A Kpọlitere Jizọs n’Ọnwụ Ruo Mgbe A Tụrụ Pọl Mkpọrọ

N’ụbọchị nke atọ ka Jizọs nwụsịrị, e mere ka o si n’ọnwụ bilie. N’ụbọchị ahụ, ọ pụtara ugboro ise n’ihu ụmụazụ ya. Jizọs nọgidere na-apụta n’ihu ha ruo ụbọchị iri anọ. Mgbe e mesịrị, ka ndị na-eso ụzọ ya nọ na-ele anya, Jizọs rigooro n’eluigwe. Ụbọchị iri ka nke a gasịrị, Chineke wụsara mmụọ nsọ n’ahụ́ ụmụazụ Jizọs ndị nọ na-echere n’ime Jeruselem.

Ka e mesịrị, ndị iro Chineke tụbara ndịozi ahụ n’ụlọ mkpọrọ, ma otu mmụọ ozi napụtara ha. Ndị mmegide ji nkume tụgbuo Stivin onye na-eso ụzọ Jizọs. Ma anyị ga-amụ ụzọ Jizọs si họpụta otu n’ime ndị mmegide ahụ ịbụ ohu ya pụrụ iche, o wee ghọọ Pọl onyeozi. Afọ atọ na ọkara mgbe ọnwụ Jizọs gasịrị, Chineke zigara Pita onyeozi izi Kọniliọs nke na-abụghị onye Juu na ezinụlọ ya ozi ọma.

Ihe dị ka afọ iri na atọ mgbe nke ahụ gasịrị, Pọl malitere njem ozi ọma mbụ ya. Na njem nke abụọ ya, Timoti sonyeere Pọl. Anyị ga-amụ ụzọ Pọl na ndị so ya mee njem si nwee ọtụtụ oge obi ụtọ n’ozi Chineke. N’ikpeazụ, a tụrụ Pọl mkpọrọ na Rom. A tọhapụrụ ya mgbe afọ abụọ gasịrị, ma a tụrụ ya mkpọrọ ọzọ wee gbuo ya. Ihe omume ndị a kọrọ ná NKEBI NKE 7 mere n’ime ihe karịrị afọ iri atọ na abụọ.

 

NÁ NKEBI A

AKỤKỌ NKE 102

Jizọs Dị Ndụ

Mgbe mmụọ ozi kwapụrụ nkume e ji dochie ọnụ ili ebe e liri Jizọs, ndị agha nọ nche ebe ahụ tụrụ ụjọ n’ihi ihe ha hụrụ n’ime ebe ahụ e liri ya.

AKỤKỌ NKE 103

N’ime Ụlọ A Kpọchiri Akpọchi

Gịnị mere na ndị na-eso ụzọ Jizọs amataghịzi ya mgbe o bilitechara n’ọnwụ?

AKỤKỌ NKE 104

Jizọs Alaghachi n’Eluigwe

Tupu Jizọs alaghachi n’eluigwe, o nyere ndị na-eso ụzọ ya otu iwu ikpeazụ.

AKỤKỌ NKE 105

Ha Nọ Na Jeruselem Na-echere

Gịnị mere Jizọs ji wụsa ndị na-eso ụzọ ya mmụọ nsọ n’ụbọchị Pentikọst?

AKỤKỌ NKE 106

A Tọhapụ Ha n’Ụlọ Mkpọrọ

Ndị ndú okpukpe ndị Juu tụkpuru ndịozi Jizọs n’ụlọ mkpọrọ ka ha kwụsị ha ikwusa ozi ọma. Ma Chineke nwere ihe ọzọ o bu n’obi.

AKỤKỌ NKE 107

A Tụọ Stivin Nkume

Mgbe a na-egbu Stivin, o kpere ekpere pụrụ iche.

AKỤKỌ NKE 108

N’ụzọ Damaskọs

Ìhè na-enwu zaa na olu si n’eluigwe gbanwere ndụ Sọl.

AKỤKỌ NKE 109

Pita Agaa Ịhụ Kọniliọs

Ò nwere agbụrụ ma ọ bụ ndị Chineke na-ewere na ha ka ndị ọzọ?

AKỤKỌ NKE 110

Timoti​—⁠Onye Inyeaka Ọhụrụ nke Pọl

Timoti hapụrụ ụlọ ha gaa soro Pọl kwusawa ozi ọma n’ebe dị iche iche.

AKỤKỌ NKE 111

Nwata Nwoke Ụra Buuru

Ụra buuru Yutikọs mgbe Pọl na-agwa ndị na-eso ụzọ nọ na Troas okwu, ọ bụghị mgbe Pọl na-ekwu okwu nke abụọ ya ka ihe a mere. E nwere ọrụ ebube merenụ n’agbata oge Pọl kwuru okwu nke mbụ na mgbe o kwuru nke abụọ.

AKỤKỌ NKE 112

Ụgbọ Ha Ekpuo n’Otu Agwaetiti

Mgbe o yiri ka olileanya adịghịzi, Chineke gwara Pọl ihe mere ka obi sie ya ike.

AKỤKỌ NKE 113

Mgbe Pọl Nọ na Rom

Olee otú Pọl onyeozi ga-esi kwusaa ozi ọma ebe ọ bụ na a tụrụ ya mkpọrọ?