Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Okwu Mmalite

Okwu Mmalite

NKE A bụ akwụkwọ na-akọ akụkọ mere eme. E nwetara ha n’akwụkwọ kachasị akwụkwọ niile, bụ́ Bible. Akụkọ ndị a bụ akụkọ mere eme banyere ụwa site na mgbe Chineke malitere ike ihe ruo n’oge anyị a. Ọbụna ha na-akọ banyere ihe ndị Chineke kwere nkwa ime n’ọdịnihu.

Akwụkwọ a na-eme ka ị ghọta ihe ụfọdụ banyere Bible. Ọ na-akọ banyere ndị a kpọrọ aha n’ime Bible na ihe ndị ha mere. Ọ na-egosikwa olileanya dị ebube nke ndụ ebighị ebi n’ime paradaịs elu ala bụ́ nke Chineke nyere ụmụ mmadụ.

E nwere akụkọ dị otu narị na iri na isii n’akwụkwọ a. E kere ha ụzọ asatọ. Peeji mbụ nke na-amalite nkebi nke ọ bụla na-akọ ná mkpirikpi ihe dị ná nkebi ahụ. E dere akụkọ niile n’usoro ha si mee. Nke ga-enyere gị aka ịmata mgbe ihe omume ụfọdụ, na ihe ndị ọzọ gbara ha gburugburu, mere.

E ji okwu ndị dị mfe kọọ akụkọ ndị a. Ọtụtụ n’ime unu bụ́ ụmụntakịrị ga-enwe ike ịgụ ya n’onwe unu. Unu ndị mụrụ ụmụ ga-achọpụta na obere ụmụaka unu ga-enwe obi ụtọ ka a na-agụrụ ha akụkọ ndị a ugboro ugboro. Unu ga-achọpụta na akwụkwọ a nwere ọtụtụ ihe ndị ga-amasị ma ụmụaka ma ndị okenye.

E depụtara akụkụ Akwụkwọ Nsọ ụfọdụ ná ngwụsị nke akụkọ nke ọ bụla. A na-agba gị ume ịgụ akụkụ Bible ndị a bụ́ ebe ndị e si nweta akụkọ ndị a kọrọ. Mgbe ị gụsịrị otu akụkọ, tụlee ajụjụ ndị e depụtara maka akụkọ ahụ, bụ́ ndị dị ma ị gafee Akụkọ nke 116, ma gbalịa icheta azịza ha.