Ngụkọta Ọnụ Ọgụgụ Niile E Nwere n’Afọ 2018
Alaka Ụlọ Ọrụ Ndịàmà Jehova: 87
Mba Ndị Nyere Akụkọ Ozi Ha: 240
Ọgbakọ Niile: 119,954
Ndị Bịara Ncheta Ọnwụ Jizọs n’Ụwa Niile: 20,329,317
Ndị Tara Achịcha: 19,521
Ọnụ Ọgụgụ Kasị Elu nke Ndị Nkwusa *: 8,579,909
Nkezi Ndị Kwusara Ozi Ọma Kwa Ọnwa: 8,360,594
Pasent O Ji Karịa nke 2017: 1.4
Ndị E Mere Baptizim *: 281,744
Nkezi Ndị Ọsụ Ụzọ * Kwa Ọnwa: 1,267,808
Nkezi Ndị Ọsụ Ụzọ Inyeaka Kwa Ọnwa: 446,642
Awa Niile Anyị Ji Kwusaa Ozi Ọma: 2,074,655,497
Nkezi Ọmụmụ Baịbụl * Kwa Ọnwa: 10,079,709
N’afọ ije ozi 2018, * Ndịàmà Jehova ji ihe karịrị ijeri naịra iri asaa na asaa, narị nde itoolu na anọ na narị puku ise na iri isii lekọta ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche, ndị ozi ala ọzọ, na ndị nlekọta sekit n’ebe ndị e zigara ha ka ha na-eje ozi. Ụmụnna na-eje ozi n’alaka ụlọ ọrụ anyị niile dị puku iri abụọ, narị atọ na iri atọ na otu. Ha niile na-eje ozi oge niile pụrụ iche.
^ para. 7 Onye nkwusa bụ onye na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke. (Matiu 24:14) Ị chọọ ịmatakwu gbasara otú e si nweta ọnụ ọgụgụ a, gaa na jw.org/ig gụọ isiokwu bụ́ “Ndịàmà Jehova Ole Ka E Nwere n’Ụwa Niile?”
^ para. 10 Ị chọọ ịmatakwu ihe mmadụ ga-eme tupu e mee ya baptizim, ya aghọọ Onyeàmà Jehova, gaa na jw.org/ig gụọ isiokwu bụ́ “Gịnị Ka M Ga-eme Ka M Bụrụ Onyeàmà Jehova?”
^ para. 11 Onye ọsụ ụzọ bụ Onyeàmà Jehova e mere baptizim na-akpa àgwà ọma, wepụtara onwe ya iji awa ole a kapịrị ọnụ na-ekwusa ozi ọma kwa ọnwa.
^ para. 14 Ị chọọ ịmatakwu gbasara ya, gaa na jw.org/ig gụọ isiokwu bụ́ “Gịnị Bụ Ọmụmụ Baịbụl?”
^ para. 15 Afọ ije ozi 2018 malitere na Septemba 1, 2017, ruo n’Ọgọst 31, 2018.