Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

JỌJIA

Di M Akwụsịghị Ịgụ Ya Ruo Mgbe Ọ Gụchara Ya

Marina Kopaliani

Di M Akwụsịghị Ịgụ Ya Ruo Mgbe Ọ Gụchara Ya
  • A MỤRỤ YA N’AFỌ 1957

  • E MERE YA BAPTIZIM N’AFỌ 1990

  • ONYE Ọ BỤ Ya na Badri di ya ji ozi ha kpọrọ ihe n’agbanyeghị ụmụ abụọ ha na-azụ. Nwanna Badri mechara soro na Kọmitii Na-elekọta Mba. O ji obi ya niile fee Jehova ruo mgbe ọ nwụrụ n’afọ 2010.

N’AFỌ 1989, mụ na di m gara n’ụlọ otu onye agbata obi anyị hụ ka Ndịàmà Jehova na-amụrụ ya Baịbụl. Ọ bụ Nwanna Givi Barnadze na-amụrụ ya Baịbụl. Ma, Nwanna Givi Barnadze enweghị Baịbụl n’ihi na ọ dịghị mfe inweta Baịbụl na Jọjia n’oge ahụ.

Ihe anyị nụrụ Nwanna Givi Barnadze na-akụziri onye agbata obi anyị tọrọ anyị ụtọ, ya emee ka anyị chọwa otú anyị ga-esi enweta Baịbụl. Mgbe di m hụrụ nwanne ya nwoke, ọ gwara ya na ya na-achọ ebe ya ga-enweta Baịbụl. Ọ gwara di m na o nwere nke ọhụrụ e dere n’asụsụ Jọjin ya zụtara n’oge na-adịbeghị anya, nakwa na ya ga-enye ya Baịbụl ahụ. Ihe a o kwuru juru di m anya.

Mgbe di m ji Baịbụl ahụ lọta, ọ gara nọrọ ọdụ n’oche ma malite ịgụ ya. Ọ gụgidere ya chi ejie. Mgbe o tetara n’ụtụtụ echi ya, ọ malitekwara ịgụ ya. Mgbe m si ọrụ lọta, m hụrụ ya ebe ọ nọ ọdụ n’oche na-agụkwa ya. Ọ kwụsịghị ịgụ ya. N’ihi ya, m gwara ya ka ọ gwa ndị ọrụ ha ka ha nye ya abalị ole na ole ka o nwee ike ịgụcha ya. O teghị aka, ya agụchaa Baịbụl.

Mgbe Nwanna Barnadze mechara malite ịmụrụ mụ na di m akwụkwọ bụ́ Ezi-Okwu Ahu Nke Nedubà ná Ndu Ebigh-Ebi, obi tọrọ anyị ụtọ ebe ọ bụ na anyị nwere Baịbụl. Baịbụl a baara anyị ezigbo uru n’ihi na anyị enweghị akwụkwọ a anyị ji na-amụ Baịbụl, onye na-amụkwaranụ anyị ya enweghị Baịbụl. Mgbe ihe dị ka otu afọ gachara, e mere mụ na di m baptizim.