Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ebe Ugwu Saneti

JỌJIA

Ihe Ndị Ị Ga-eburu n’Uche Gbasara Jọjia

Ihe Ndị Ị Ga-eburu n’Uche Gbasara Jọjia

Ebe otu nwoke bu mkpụrụ vaịn ọ ghọtara n’ubi, obi ana-atọ ya ụtọ

Otú Ala Ya Dị E nwere nnukwu ugwu dị iche iche na Jọjia. Ụfọdụ n’ime ha dị elu karịa puku mita anọ na narị ise. Snoo na-ekpuchikwa elu ugwu ndị ahụ. E kere obodo Jọjia ụzọ abụọ. E nwere ebe ọwụwa anyanwụ na ebe ọdịda anyanwụ. Ebe nke ọ bụla nwere obodo dị iche iche. Oge okpomọkụ na oge oyi ha anaghị abụ otu. Omenala ha, egwú na nri ha dịchakwa iche iche.

Ndị Bi na Ya E nwere ihe dị ka nde mmadụ atọ na narị puku asaa bi na Jọjia. Ọtụtụ n’ime ha bụ ndị nwe ala.

Okpukpe Ha Ọtụtụ n’ime ndị bi na Jọjia na-ekpe Chọọchị Ọtọdọks. Ma, ihe dị ka otu onye n’ime mmadụ iri n’obodo ahụ bụ ndị Alakụba.

Asụsụ Ha Asụsụ Jọjia dị iche n’asụsụ obodo ndị ọzọ ha na ha gbara agbata obi. Ihe ndị a kọrọ gbasara obodo a gosiri na e wepụtara mkpụrụ akwụkwọ ndị Jọjia tupu Oge Ndị Kraịst.

Ihe Ha Na-arụ Ọtụtụ ndị bi na Jọjia bụ ndị ọrụ ugbo. N’oge na-adịchabeghị anya, ndị mmadụ malitere ịna-abịa ebe ndị pụrụ iche na Jọjia elegharị anya. Ihe a so n’ihe kacha enye obodo a ego.

Otú Ebe Ahụ Na-adị Ebe ọwụwa anyanwụ Jọjia anaghị ekpo oké ọkụ, ọ naghịkwanụ ajụ oké oyi. A na-enwe oké okpomọkụ n’akụkụ Oké Osimiri Ojii dị n’ebe ọdịda anyanwụ Jọjia. Mkpụrụ osisi ndị dị ka oroma na-emekwa nke ọma ebe ahụ.

Ndị na-aghọ mkpụrụ vaịn n’obodo Kaketi

Nri Ha O nweghị ihe ndị Jọjia riwere ghara bred. Ha na-eme bred ha n’ekwu ọkụ. Ihe ha na-ejikarị eri nri ha bụ stuu e ji akwụkwọ nri na ihe ndị na-eme ka nri tọọ ụtọ sie. E ji ime mmanya mara ndị Jọjia kemgbe ụwa. Ọ na-abụ ha pịpụtachaa mmiri mkpụrụ osisi vaịn ha ji eme mmanya, ha agbanye ya n’ite ájá. Ọtụtụ ezinụlọ na-eji aka ha akọ mkpụrụ vaịn e ji eme mmanya, jirikwa aka ha mee mmanya nke ha. Ụdị mkpụrụ vaịn dị iche iche e nwere na Jọjia ruru ihe dị ka narị ise.

Ebe otu nwaanyị na-eme bred