Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

JỌJIA

Ha Hụrụ Ibe Ha n’Anya na Jọjia n’Agbanyeghị Mba Ha Si na Ya

Ha Hụrụ Ibe Ha n’Anya na Jọjia n’Agbanyeghị Mba Ha Si na Ya

E NWERE obere nwatakịrị nwaanyị aha ya bụ Sanel. Tupu amụọ ya, ndị dọkịta gwara nne na nna ya na ọ bụrụ na a mụọ ya ná ndụ, e nwere ọrịa ọjọọ ọ ga na-arịa. Mgbe e mechara mụọ ya, ndị dọkịta kwuru na a ga-awa ya ahụ́ n’ụbọchị ahụ a mụrụ ya. Nne na nna ya bi n’obodo Abkazịa. Obodo a kewapụrụ onwe ha ná mba Jọjia, chịwa onwe ha. Ha chọrọ dọkịta ga-awa Sanel ahụ́ n’amịnyeghị ya ọbara, ma ha achọtaghị.

Ha kpọtụụrụ Kọmitii Na-ahụ Maka Mmekọrịta Anyị na Ndị Ụlọ Ọgwụ. * Kọmitii ahụ gbara mbọ ozugbo nweta otu dọkịta n’isi obodo Jọjia bụ́ Tibilisi. Dọkịta a kwetara ịwa Sanel ahụ́ n’amịnyeghị ya ọbara. Ihe a mere ka ahụ́ ruo nne na nna Sanel ala. Ma, nne Sanel enwetachabeghị onwe ya kemgbe ọ mụchara ya, n’ihi ya, ọ gaghị agali ebe a ga-awa Sanel ahụ́. E kpebiziri ka nne nne ya na nne nna ya kpọrọ ya gawa ụlọ ọgwụ ahụ na Tibilisi. Ma nne nne ya ma nne nna ya bụcha Ndịàmà Jehova.

A wara obere nwa ahụ ahụ́ n’amịnyeghị ya ọbara. Nne nne ya na nne nna ya mechara kwuo, sị: “Anyị nọrọ ihe karịrị abalị iri abụọ n’ụlọ ọgwụ. Ọtụtụ ụmụnna ndị Jọjia bịara leta anyị ma nyere anyị aka. Ha kasiri anyị obi. Anyị agụọla n’akwụkwọ anyị banyere otú ụmụnna anyị si hụ ibe ha n’anya, ma ugbu a, ha emeerela anyị ihe ahụ anyị na-agụta n’akwụkwọ.”

^ para. 4 Ndị okenye nọ na Kọmitii Na-ahụ Maka Mmekọrịta Anyị na Ndị Ụlọ Ọgwụ na Jọjia enwetala ihe karịrị narị ndị dọkịta abụọ na iri ise kwetara ịna-awa Ndịàmà Jehova ahụ́ n’amịnyeghị ha ọbara.