JỌJIA | 1991-1997
Ndị Okenye Amalite Ịzụ Ụmụnna
N’agbata afọ 1991 na afọ 1994, ọtụtụ ọgbakọ ndị e nwere na Jọjia nwere naanị otu okenye ma ọ bụ otu ohu na-eje ozi. N’oge ahụ, ndị nọ n’otu ọgbakọ anaghị ezukọ otu ebe enwe ọmụmụ ihe. Ha na-ezukọ n’ìgwè dị iche iche n’ihi na ụmụnna ebighị ibe ha nso.
E zigara Nwanna Joni Shalamberidze na Nwanna Pavle Abdushelishvili n’obodo Telavi nke dị na Kaketi. Ha abụọ ejebuola ozi n’ebe a chọkwuru ndị ga-ekwusa ozi ọma n’ime ime obodo. E nwere narị ndị nkwusa atọ n’ọgbakọ dị na Telavi, mana enweghịdị otu mkpụrụ okenye ebe ahụ. Ọgbakọ ahụ nwere ìgwè iri na atọ. Ha na-ezukọ n’ebe dị iche iche enwe ọmụmụ ihe.
Nwanna Joni na Nwanna Pavle mechara chọpụta otu ihe mere ka ọ na-esiri ụmụnna ike ịna-eme nke ọma n’ọgbakọ. Nwanna Joni kwuru, sị: “Ọtụtụ ụmụnna nwere nnukwu ubi ha na-akọ, nweekwa ọtụtụ ubi vaịn. N’ebe ahụ, ha na-eme onye chọọ ịrụ ọrụ n’ubi ya, ndị agbata obi ya abịa nyere ya aka, ha chọọkwa ịrụ nke ha, onye ahụ agaa nyere ha aka. Ihe a na-eme ka ụmụnna na ndị na-abụghị Ndịàmà Jehova na-akpachi anya.”—1 Kor. 15:33.
Nwanna Joni na Nwanna Pavle gwara ụmụnna ka ha na-akpọ ụmụnna ibe ha ka ha na-enyere ha aka n’ọrụ ubi. Ha kwuru na ha nwere ike iji oge ahụ ha na-arụ ọrụ na-agba ibe ha ume. (Ekli. 4:9, 10) Nwanna Joni mechara kwuo, sị: “Ụmụnna mere ihe a anyị gwara ha, ya emee ka ha hụkwuo ibe ha n’anya.” Mgbe afọ atọ gachara, Nwanna Joni na Nwanna Pavle hapụrụ Kaketi. Ma, tupu ha ahapụ, e nweela ndị okenye ise na ndị ohu na-eje ozi iri na abụọ n’ebe ahụ.
Ọmụmụ Ihe Nyeere Ha Aka Ịmụtakwu Otú E Si Ezi Ozi Ọma
Ebe ọ bụ na a machibidoro anyị iwu ikwusa ozi ọma na Jọjia ruo ihe dị ka afọ 1992, ụmụnna na-adị ole na ole enwe Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche na Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ n’ebe dị iche iche. Ọ bụ eziokwu na ọmụmụ ihe ndị ahụ gbara ụmụnna ume, ma, ihe mere e ji enwe ha abụghị iji kụziere ha otú e si ezi ozi ọma.
Ma, ihe gbanwere mgbe ọchịchị ndị Kọmunist dara. Nzukọ Jehova kwuru ka ọgbakọ niile malite inwe Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke na Nzukọ Ije Ozi n’ọmụmụ ihe ha.
Nwanna Nwaanyị Naili Khutsishvili na nwanne ya nwaanyị aha ya bụ Lali Alekperova ka na-echeta otú obi si atọ ha ụtọ ma ha gaa ọmụmụ ihe mgbe ahụ. Lali kwuru, sị: “Ọmụmụ ihe ndị ahụ na-atọ anyị ụtọ. Obi tọrọ onye ọ bụla ụtọ na ụmụnna nwaanyị ga na-esozi eme ihe omume.”
Nwanna Nwaanyị Naili kwuru, sị: “N’otu ihe ngosi e mere, onye nwe ụlọ nọ na-agụ akwụkwọ akụkọ n’elu ikpo okwu nụ aka a kụrụ n’ụzọ. Mgbe ọ sịrị ha batawa, ụmụnna nwaanyị abụọ esi n’ọnụ ụzọ e si abata n’ụlọ ahụ anyị nọ na-enwe ọmụmụ ihe bata, gbagoo n’elu ikpo okwu.” Lali kwukwara, sị: “Ọ bụ eziokwu na mgbe ahụ, anyị aghọtachaghị ihe ndị a na-eme n’ọmụmụ ihe ndị ahụ, ma ha mere ka anyị mụtakwuo otú anyị ga-esi na-ezi ozi ọma.”
A Chọkwuru Akwụkwọ Ndị E Ji Amụ Baịbụl
Ụmụnna ole na ole ji ígwè obibi akwụkwọ ndị a na-eji aka ahịgharị bie akwụkwọ anyị ọtụtụ afọ n’ụlọ ha. Ebe ọ bụ na a chọkwuru akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl, ụmụnna gakwuuru ụlọ ọrụ ndị na-ebi akwụkwọ ka ha na-ebiri ha magazin anyị. Ha kwetara ịna-ebiri ha ya n’ọnụ ego dị ala.
E nwere ihe ndị ụmụnna ahụ na-eme tupu ha ewegara ụlọ ọrụ ndị ahụ magazin anyị ka ha bie. Ha na-echepụta otú ha ga-esi hazie magazin ahụ ka ọ dị mma n’anya. Ha sụgharịchaa magazin anyị n’asụsụ Jọjin, ha ejiri taịpraịta dee ha ka ọ dị otú nke Bekee dị. Ha na-esikwa na magazin nke Bekee chakapụta foto ma mapawa ha ebe ha kwesịrị ịdị na nke ahụ ha ji taịpraịta dee. N’ikpeazụ, ha na-eweta akwụkwọ akụkọ, chakapụta mkpụrụ akwụkwọ ndị e ji aka akwụkwọ mara mma bie, jiri ha mee okwu ndị ga-adị n’ihu magazin ahụ ma mapawa ha n’ihu magazin nke Bekee. Ha mechaa ihe a niile, ha ewegara ya ndị ga-ebiri ha ya ka ha bie ya.
Mgbe ụmụnna mechara nweta kọmputa, Nwanna Levani Kopaliani na Nwanna Leri Mirzashvili gara mụọ otú e si eji ya arụ ọrụ. Nwanna Leri kwuru ihe mere mgbe ahụ. Ọ sịrị: “Ebe ọ bụ na ihe niile gbasara iji kọmputa arụ ọrụ edochabeghị anyị anya, ihe agachaghị otú a tụrụ anya ya
na mbụ. Ma, Jehova nyeere anyị aka. Nwayọọ nwayọọ, anyị bidoro iji aka anyị jiri kọmputa na-ede magazin anyị ma na-ahazi ha otú ha ga-adị ma e bie ha.”N’agbanyeghị nsogbu ndị a, ọgbakọ niile dị na Jọjia malitere inweta magazin anyị ndị ụcha ha mara mma e biri na Jọjia. Ka oge na-aga, ọ bịara siere ụmụnna nọ na Jọjia ike ibipụta magazin ole ga-ezuru mmadụ niile. Ma, nzukọ Jehova gwara ha ihe ha ga-eme n’oge ahụ.
Otú Ihe Si Gbanwee
N’afọ 1992, e nwere mgbakọ mba niile na Sent Pitasbọg, dị na Rọshịa. Ná mgbakọ a, ụmụnna anyị ndị Jọjia na ụmụnna ole na ole si n’alaka ụlọ ọrụ anyị dị na Jamanị nwere nnọkọ. Nwanna Genadi Gudadze kwuru ihe ha mere ná nnọkọ ahụ. Ọ sịrị: “Ha kọwaara anyị otú e si eme nsụgharị. Ha gwara anyị na a ga-ezitere anyị ndị ga-akụzikwuru anyị otú e si eme nsụgharị.”
Ibipụta akwụkwọ anyị n’asụsụ Jọjin abụghị obere ọrụ. Ihe kpatara ya bụ na mkpụrụ akwụkwọ Jọjin pụrụ iche. Ọ dịbeghịkwa ná ngwá ọrụ kọmputa a na-akpọ MEPS nzukọ Jehova ji ebi akwụkwọ. N’ihi ya, a gbara mbọ tinye mkpụrụ akwụkwọ Jọjin ná ngwá ọrụ kọmputa ahụ ka e nwee ike iji ya na-ahazi otú akwụkwọ anyị ga-adị tupu e bie ya, nakwa ka a na-ebipụta ya n’asụsụ Jọjin.
N’ihe dị ka afọ 1978, otu nwoke aha ya bụ Datikashvili na ezinụlọ ya si Jọjia kwaga Amerịka. Otu n’ime ụmụ ya aha ya bụ Marina mechara bata n’ọgbakọ. O nyeere ụmụnna nọ na Bruklin ezigbo aka mgbe ha na-ese mkpụrụ akwụkwọ Jọjin ka e nwee ike itinye ha ná ngwá ọrụ kọmputa ahụ ma jiri ya na-ebipụta akwụkwọ anyị n’asụsụ Jọjin. Obere oge ha mechara, e bipụtara traktị anyị dị iche iche na brọshọ bụ́ “Lee! Ana M Eme Ihe Nile Ka Ha Dị Ọhụrụ,” na Jamanị.
A Kụziiri Ha Otú E Si Eme Nsụgharị
N’afọ 1993, Nwanna Michael Fleckenstein na Silvia nwunye ya, si n’alaka ụlọ ọrụ anyị dị na Jamanị bịa Tibilisi ka ha kụziere ụmụnna na-asụgharị akwụkwọ anyị otú e si eme nsụgharị ma hiwe ọfis ebe ha ga-anọ na-arụ ọrụ ha. Nwanna Michael kwuru, sị: “Echefubeghị m nnọkọ ahụ anyị nwere na Sent Pitasbọg mgbe ahụ anyị bịara mgbakọ. Mgbe anyị bịara Tibilisi mgbe ọnwa iri na asatọ gachara, e gosiri anyị ụmụnna anyị na-asụgharị akwụkwọ anyị n’asụsụ Jọjin. O juru anyị anya ịhụ na otú ha si na-arụ ọrụ ha dị mma.”
Mgbe ọnwa ole na ole gachara, e nwere ndị nsụgharị iri na otu na-arụ ọrụ n’ọfis dị n’otu obere ụlọ e nwere ebe ahụ. Ọzụzụ e nyere ha mere ka ụmụnna na-enweta akwụkwọ anyị ndị e ji amụ Baịbụl mgbe niile.
Ibuga Akwụkwọ Anyị n’Ebe Dị Iche Iche n’Oge E Nwere Ọgba Aghara
Mgbe ọchịchị Sọviet Yuniọn dachara, a bịara nwee ọgba aghara n’ọtụtụ obodo ndị Sọviet na-achịbu. Jọjia sokwa n’obodo ndị e nwere ọgba aghara na ha. Isi n’otu obodo gaa obodo ọzọ bịara sie ike n’ihi na o nwere ike ịta isi mmadụ.
Otu ụbọchị na Nọvemba afọ 1994, mgbe Nwanna Aleko Gvritishvili na ụmụnna nwoke abụọ ọzọ na-achọ ịgafe otu obodo, ndị amị kwụsịrị ụgbọala ha ma sị ha pụta. Nwanna Aleko kwuru, sị: “Ezigbo iwe were ndị amị ahụ mgbe ha hụrụ akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl anyị bu. Ha akwụwa anyị n’ahịrị ka hà na-achọ ịgbagbu anyị. Anyị kpesiri ekpere ike. Mgbe ihe dị ka awa abụọ gachara, otu n’ime ha gwara anyị, sị, ‘Burunụ akwụkwọ unu gawa. Anyị hụ unu ebe a ọzọ, anyị ga-agba ụgbọala unu ọkụ, gbagbuokwa unu.’”
Ma egwu a e yiri ha emeghị ka ha kwụsị ịna-ebugara ụmụnna ibe ha akwụkwọ ndị a e ji amụ Baịbụl. Nwanna Zaza Jikurashvili so n’otu n’ime ndị gbara mbọ na-ebubata akwụkwọ anyị na Jọjia n’oge ahụ. O kwuru, sị: “Anyị akwụsịghị n’ihi na anyị ma na akwụkwọ anyị dị ụmụnna anyị mkpa. Ndị nwunye anyị kwadokwara anyị.”
Nwanna Aleko kwukwara na “ọtụtụ ụmụnna ndị so na-ebuga akwụkwọ anyị ndị a nwechara ezinụlọ.” Gịnị mere ha ji na-eme ihe a nwere ike ịta isi ha? Nwanna Aleko kwuru, sị: “Ihe mere anyị ji na-eme ya bụ n’ihi na ọ bụ otú anyị si ekele Jehova maka ihe ọma ọ na-emere anyị, nakwa maka na anyị hụrụ ya n’anya. Ihe ọzọkwa bụ na anyị ji ya na-eṅomi Jehova n’otú o si na-enyere ụmụnna anyị aka.”
Otú a ụmụnna ndị a si wepụta onwe ha na-ebuga akwụkwọ anyị mere ka ụmụnna na-enweta akwụkwọ anyị n’oge ahụ niile e nwere ọgba aghara. Ụmụnna mechara chọpụta ụzọ ha ga-esi si na Jamanị na-ebubata akwụkwọ anyị na Jọjia aka aghara ịkpara ha.
Mgbakọ E Nwere Mere Ka Okwukwe Ụmụnna Anyị Sikwuo Ike
Mgbe ọgba aghara ahụ kwụsịlatara n’afọ 1995, ụmụnna haziri ka ha nwee mgbakọ distrikti mbụ na Jọjia. Ha nwere mgbakọ ahụ n’oge ọkọchị afọ 1996. A nọ n’obodo Gori,
Maneuli, na Snori nwee mgbakọ ahụ. Ihe dị ka puku mmadụ isii bịara ya.Ndị gara mgbakọ nke a nọ ebe dị nso na Gori mee anaghị echefu ya echefu. Ha chetara otú ha si chee na ha agaghị eju ụlọ ezumezu e nwere na Gori mgbe ha mere Ncheta Ọnwụ Jizọs n’oge gara aga. Ma ugbu a, ha na-atụ anya ihe karịrị puku mmadụ abụọ ịbịa mgbakọ. Ha gara chọọ ebe ha ga-anọ enwe ya, ma ha achọtaghị ebe ga-aba ndị ga-abịanụ. Ha kpebiziri ịnọ n’èzí mee ya, n’akụkụ ugwu mara mma ndị mmadụ na-abịa ezuru ike. Ebe a dị nso na Gori.
Nwanna Kako Lomidze so na Kọmitii haziri mgbakọ ahụ. O kwuru, sị: “Mgbe e mechiri mgbakọ, ụmụnna nọkọtara ọnụ na-abụ abụ, obi ana-atọkwa ha ụtọ. Ihe a mere ka o doo mmadụ niile anya na Ndịàmà Jehova dị n’otu, nakwa na ha hụrụ ibe ha n’anya n’eziokwu.”—Jọn 13:35.
Ndị Nlekọta Sekit Emee Ka Ọtụtụ Ndị Batakwuo n’Ọgbakọ
Malite n’afọ 1996, a haziri ka ndị nlekọta sekit na-aga eleta ọgbakọ dị iche iche kwa izu. Iji nwee ike iletacha ọgbakọ niile nọ na Jọjia, a họpụtakwuru ndị nlekọta sekit.
O doro anya na “ndọgbu” ndị nlekọta sekit ndị ahụ ‘ji ịhụnanya na-adọgbu onwe ha n’ọrụ’ mere ka ọgbakọ mụbaa, meekwa ka ụmụnna na-eme ihe nzukọ Jehova gwara ha. (1 Tesa. 1:3) Malite n’afọ 1990 ruo n’afọ 1997, otú ọtụtụ ndị si bata n’ọgbakọ abụghị ihe e ji ọnụ ekwu. Dị ka ihe atụ, n’afọ 1990, ndị nkwusa nyere akụkọ ozi ha na Jọjia dị narị itoolu na anọ. Ma mgbe afọ asaa gachara, ndị nkwusa e nwere na Jọjia dịzi puku iri na otu na iri asatọ na abụọ.
Ozi ọma a e ji nwayọọ nwayọọ malite ikwusa na Jọjia kemgbe ihe dị ka afọ 1921 eruola ebe niile na Jọjia, o meekwala ka ọtụtụ ndị bata n’ọgbakọ. Ma, Jehova ka ga-agọzikwu ndị na-efe ya na Jọjia.