Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị a bụ ụmụnna ndị so nwee nnọkọ na Tibilisi n’afọ 1992

JỌJIA | 1991-1997

“Ọ Bụ Chineke Na-eme Ka O Too.”​—⁠1 Kọr. 3:⁠6.

“Ọ Bụ Chineke Na-eme Ka O Too.”​—⁠1 Kọr. 3:⁠6.

Onye a bụ Nwanna Genadi Gudadze. Ọ bụ onye nlekọta sekit n’agbata afọ 1991 na afọ 1994

NDỊ Jọjia bidoro chịwa onwe ha n’afọ 1991 mgbe ọchịchị ndị Sọviet Yuniọn dara. Mgbanwe a na ọgba aghara ndị e nwere n’oge ahụ mere ka ihe sie ike na Jọjia. Nwanna Genadi Gudadze, bụ́ onye nlekọta sekit n’oge ahụ, kwuru na ndị mmadụ na-akwụgide n’ahịrị ebe ha na-eche ka ha nweta bred, chi ejie.

Ụmụnna na-agakarị n’ebe ndị ahụ a na-akwụ n’ahịrị ezi ndị mmadụ ozi ọma. Nwanna Genadi kwuru, sị: “N’oge ahụ, ọ dị ka onye ọ bụla ọ̀ chọrọ ịnụ ozi ọma. Ọtụtụ ndị nyere anyị adres ha sị ka anyị bịa mụwara ha Baịbụl.”

Anyị gbasaa ọmụmụ ihe, ndị okenye na-agụpụta aha na adres ndị ahụ chọrọ ka a mụwara ha Baịbụl. Ụmụnna na-ahọrọ ndị ha ga-achọ ịga mụwara ihe.

Ebe ụmụnna na-ezi ndị kwụ n’ahịrị na-eche ka ha nweta bred ozi ọma n’ihe dị ka afọ 1991

Nwanna Levani Sabashvili bụ okenye n’ọgbakọ dị na Tibilisi n’oge ahụ. O kwuru ihe mere otu di na nwunye chọrọ ka a bịa mụwara ha Baịbụl. Ọ sịrị: “Ụmụnna kwetachara ịga na nke ndị niile chọrọ ka a bịa mụwara ha Baịbụl, ma o nweghị onye kwetara ịga na nke ha. Ihe kpatara ya bụ na ebe ha bi dị ezigbo anya, ọtụtụ ụmụnna nwekwara ọtụtụ ndị ha na-amụrụ ihe.”

Mgbe ọnwa ole na ole gachara, di na nwunye ahụ zitere ozi ọzọ na-arịọ ka a bịa mụwara ha Baịbụl. Ha mechakwara zite ozi nke ugboro atọ. Na nke ugboro atọ a, ha gwara anyị ka anyị mee ka aka anyị dị ọcha n’ebe ọbara mmadụ niile dị. (Ọrụ 20:​26, 27) Nwanna Levani kwuru, sị: “Oge ahụ bụ mbido afọ, anyị anaghịkwanụ achọ ịga na nke ndị mmadụ n’oge ahụ. Ma, anyị kpebiri ịga hụ ha.”

N’otu isi ụtụtụ ezigbo oyi na-atụ, Nwanna Levani na otu nwanna nwoke ọzọ gawara na nke di na nwunye a chọsiri ịmụ Baịbụl ike. Mgbe di na nwunye a aha ha bụ Roini Grigalashvili na Nana nwunye ya hụrụ ụmụnna ndị a, o juru ha anya. E bidoro mụwara ha Baịbụl ozugbo. Roini na Nana na ụmụ ha abụọ bụ ndị ọsụ ụzọ ugbu a.

Mbọ A Gbara Ka E Zie Ndị Chọrọ Ịmụ Baịbụl Ozi Ọma

E nwere ihe ọtụtụ ndị batara n’ọgbakọ n’oge ahụ mere iji gosi na obi dị ha ezigbo ụtọ. Ha ji oge ha, ike ha na ego ha na-aga ezi ndị ọzọ ozi ọma. Nwanna Badri Kopaliani na Marina nwunye ya so na ndị gbara ezigbo mbọ gaa n’ime ime obodo ka ha mụọrọ ndị chọrọ ịmụ Baịbụl ihe n’agbanyeghị ibu ezinụlọ.

Ná ngwụcha izu ọ bụla, Nwanna Badri na nwunye ya na ụmụ ha abụọ bụ́ Gocha na Levani na-aga ezi ozi ọma na Dusheti nke dị n’ebe ugwu Tibilisi. Obodo Dusheti mara ezigbo mma, bụrụkwa ugwu ugwu. Mgbe ụfọdụ, ha na-agba ihe dị ka otu narị kilomita na iri ise n’ụzọ ndị dị rịgọ rịgọ tupu ha eruo ime ime obodo ndị ha na-aga.

Otu ụbọchị, otu nwaanyị gwara Nwanna Badri na nwunye ya ka ha bịa zie ya ozi ọma n’ebe ọ na-arụ ọrụ. Nwanna Badri kwuru, sị: “Mgbe anyị ruru, anyị hụrụ ihe dị ka mmadụ iri ise nọ n’otu nnukwu ọnụ ụlọ na-eche anyị. Amaghị m otú m si ebido ebido. Ma, mgbe m kpechara ekpere, m malitere ịkọrọ ha ihe e dere na Matiu isi iri abụọ na anọ, bụ́ ebe kwuru banyere ihe e ji amata oge ikpeazụ. Ihe m na-akụziri ha juru otu n’ime ha anya, ya ajụọ, sị: ‘Gịnị mere ndị ụkọchukwu anyị anaghị akụziri anyị ihe ndị a?’”

Ncheta Ọnwụ Jizọs Mere Ka Ọtụtụ Ndị Nụ Ozi Ọma

Ncheta Ọnwụ Jizọs mere ka ọtụtụ ndị chọrọ ịmụta eziokwu Baịbụl na Jọjia nụ ozi ọma. Dị ka ihe atụ, n’afọ 1990, Ncheta Ọnwụ Jizọs e mere na Tibilisi n’ụlọ Nwanna Nwaanyị Ia Badridze mere ka ọtụtụ ndị agbata obi ya chọọ ka a mụwara ha Baịbụl.

Onye a bụ Nwanna Nwaanyị Ia Badridze. Narị mmadụ abụọ bịara Ncheta Ọnwụ Jizọs e mere n’ụlọ ya

Nwanna Nwaanyị Badridze wepụtara ụlọ ya ka a nọrọ na ya mee Ncheta Ọnwụ Jizọs. Ụmụ ya nyeere ya aka bupụsia ihe ndị dị na palọ ha ka o nwee ike ịba ndị ga-abịa. Ma, olee otú ọ ga-esi nweta oche ga-ezu ndị niile ga-abịanụ? Na Jọjia, e nwee ndị chọrọ ime ememme, ha na-agakarị akwụ ụgwọ tebụl na oche ha ga-emecha bughachi. Ma, Nwanna Nwaanyị Badridze gara kwụọ ụgwọ oche naanị. N’ihi ya, ndị nwe oche ndị ahụ jụrụ ya, sị: “Ị̀ gaghị achọ tebụl? Ùnu ga-adọsa nri n’ala?”

Ụlọ Nwanna Nwaanyị Badridze bara ndị niile bịara Ncheta Ọnwụ Jizọs. Narị mmadụ abụọ bịara Ncheta Ọnwụ Jizọs n’ụlọ ya. Ihe a jụrụ ụmụnna anya. O mere ka ọtụtụ ndị agbata obi ya chọwa ịmata banyere Ndịàmà Jehova.

Ncheta Ọnwụ Jizọs A Na-agaghị Echefu Echefu

N’afọ 1992, ụmụnna gara kwụọ ụgwọ nnukwu ụlọ ezumezu n’ebe dị iche iche na Jọjia ka a nọrọ na ha mee Ncheta Ọnwụ Jizọs. Tupu ha agaa chọta ebe a nọ mee ya na Gori, Nwanna Davit Samkharadze, onye bi n’obodo Gori mgbe ahụ sịrị na onye nlekọta sekit jụrụ ha ebe ha ga-anọ eme Ncheta Ọnwụ Jizọs.

Mgbe ụmụnna gwara ya na ha na-achọ ịnọ n’ụlọ ụmụnna mee ya, ọ jụrụ ha, sị: “Ọ̀ kwa e nwere nnukwu ụlọ ezumezu n’obodo a? Unu gaanụ okwu ya.” Ebe ọ bụ na Ndịàmà Jehova nọ na Gori mgbe ahụ erughị otu narị na iri ise, ụmụnna echeghị na ọ bara uru ịga chọta ụlọ ezumezu ga-aba ihe karịrị otu puku mmadụ maka Ncheta Ọnwụ Jizọs.

Onye nlekọta sekit ahụ gwara ha, sị: “Ọ bụrụ na onye nkwusa ọ bụla enweta mmadụ iri ga-abịanụ, ebe niile ga-eju.” Ọ bụ eziokwu na ụmụnna weere ihe a o kwuru ka ihe na-agaghị eme eme na mbụ, ma, ha gbara mbọ mee ya. N’ụbọchị ahụ e mere Ncheta Ọnwụ Jizọs, ihe dị ka otu puku mmadụ na iri atọ na isii bịara. O juru ụmụnna anya, obi tọkwara ha ezigbo ụtọ. *

Ndị Ọsụ Ụzọ Agaa Kwusaa Ozi Ọma n’Ebe A Na-ekwusabeghị Ya na Jọjia

N’afọ 1992, a ka nwere ebe Ndịàmà Jehova na-ekwusabeghị ozi ọma na Jọjia. Oleekwanụ otú a ga-esi kwusaa ozi ọma n’ebe ndị ahụ n’oge a ihe siri ike na Jọjia?

Nwanna Tamazi Biblaia, bi n’ebe ọdịda anyanwụ Jọjia n’oge ahụ. O kwuru, sị: “Otu onye nlekọta sekit na ụfọdụ n’ime anyị nwere nnọkọ ka anyị kwurịta otú anyị ga-esi eziga ụmụnna ka ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche n’ebe ndị ahụ. Ma, anyị amachaghị otú e si ahazi ọrụ ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche. Anyị makwanụ na e kwesịrị ikwusa ozi ọma a n’ebe ndị ahụ n’ihi na oge agwụla agwụ.” (2 Tim. 4:⁠2) Anyị họrọziri ndị ọsụ ụzọ iri na isii, ziga ha n’ebe dị iche iche na Jọjia.​—⁠Lee map dị na isiokwu a.

Ebe ndị e zigara ndị ọsụ ụzọ ka ha gaa kwusaa ozi ọma ruo ọnwa ise

N’ọnwa Mee afọ 1992, ndị okenye na ụmụnna ndị e zigara ebe ndị ahụ nwere nnọkọ na Tibilisi. Nnọkọ a were awa atọ. Ndị okenye ji oge ahụ gbaa ha ume maka ozi ọma ha ga-ekwusa ebe ndị ahụ ruo ọnwa ise. N’ọnwa ọ bụla, ndị okenye gara ebe ndị ahụ gbaa ha ume, nyekwa ha ihe ụfọdụ dị ha mkpa.

E zigara Nwanna Nwaanyị Manea Aduashvili na Nwanna Nwaanyị Nazy Zhvania n’obodo Ozugeti. Nwanna Nwaanyị Manea dị afọ iri isii mgbe ahụ. O kwuru, sị: “Anyị ma na e nwere onye bi nso na Ozugeti chọrọ ka a mụwara ya Baịbụl. N’ihi ya, ozugbo anyị ruru Ozugeti, anyị gawara ịhụ ya. Mgbe anyị ruru n’ụlọ ya, ya na ihe dị ka mmadụ iri atọ ọ kpọrọ nọ na-eche anyị. N’ụbọchị ahụ, anyị malitere ịmụrụ ọtụtụ n’ime ha Baịbụl.”

E nwekwara ọtụtụ ndị a mụwaara Baịbul n’ime ọnwa ise ahụ. Ná ngwụcha ọnwa ise ahụ, e nwere mmadụ iri na abụọ ruru eru ka e mee ha baptizim.

A Gọziri Mbọ Ha Gbara

E zigara Nwanna Pavle Abdushelishvili na Nwanna Paata Morbedadze n’obodo Tisageri. N’obodo a, ndị mmadụ ji ma omenala ndị mgbe ochie ma ihe okpukpe Krisendom na-akụzi kpọrọ ihe.

Ihe a bụ otú obodo Tisageri dị

Ka ọnwa ise ha na-agwụ, a kpọrọ Nwanna Paata ka ọ gaa ebe ọzọ nye aka n’ịsụgharị akwụkwọ anyị n’asụsụ ha. Oge oyi na-erukwa nso mgbe ahụ. Ugbu a Nwanna Paata na-ala, gịnị ka Nwanna Pavle ga-eme? O kwuru, sị: “Ama m na oyi ga-atụgbu m atụgbu ma m nọrọ na Tisageri n’oge ahụ. Ma, ebe ọ bụ na ndị anyị na-amụrụ Baịbụl chọrọ ka anyị nyekwuoro ha aka, m kpebiri ịnọrọ.”

Nwanna Pavle kwukwara, sị: “M gara mụ na otu ezinụlọ ebiri. M na-anọkarị n’ozi ọma ruo mgbede. M lọta, mụ esoro ezinụlọ ahụ nyaa ọkụ n’ebe ha na-akwanye ọkụ n’ụlọ elu ha. M chọwa ihi ụra, m na-ekpuru okpu e ji achụ oyi ma were blanket kpuchie onwe m.”

Mgbe ndị okenye mechara gaa leta Nwanna Pavle mgbe oge oyi ahụ gachara, e nweela mmadụ iri na otu ruru eru ịghọ ndị nkwusa a na-emebeghị baptizim. O teghịkwa aka, e mee ha niile baptizim.

^ para. 20 N’afọ 1992, ndị nkwusa e nwere na Jọjia dị otu puku na narị mmadụ asatọ na iri isii na itoolu. Ndị bịara Ncheta Ọnwụ Jizọs n’afọ ahụ dị puku iri na narị mmadụ atọ na iri atọ na abụọ.