JỌJIA
Ụfọdụ Ndị Kọd Abata n’Ọgbakọ
OTU Nwanna nwaanyị aha ya bụ Gulizar kwuru, sị: “M na-ekele Jehova mgbe niile maka ime ka e jiri asụsụ anyị kụziere m banyere ya.”
Nwanna Nwaanyị Gulizar gara ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova ruo afọ asatọ, ma o meghị baptizim. Mgbe o meziri baptizim bụ mgbe a malitere inwe ọmụmụ ihe n’asụsụ ya bụ Kọdish. Ọ bụ otu n’ime ọtụtụ ndị Kọd bi na Jọjia batara n’ọgbakọ n’oge na-adịbeghị anya. Ma, ole ndị bụ ndị Kọd?
Ndị Kọd bi n’ala Izrel na mba ndị gbara ya gburugburu kemgbe ọtụtụ narị afọ. Ụfọdụ ndị ọkà mmụta sịrị na ha si n’agbụrụ ndị Midia oge ochie e kwuru gbasara ha na Baịbụl. 2 Eze 18:11; Ọrụ 2:9) Asụsụ ha bụ otu n’ime asụsụ ndị a na-asụ n’Ịran.
(Taa, ọtụtụ nde ndị Kọd bi ná mba dị iche iche, dị ka Aminia, Ịran, Ịrak, Siria na Tọki. E nwere ihe dị ka puku ndị Kọd iri abụọ bi na Jọjia. Ndị Kọd na-atụ egwu Chineke, ha anaghịkwa eji ihe gbasara Chineke egwu egwu.
E nwere narị ndị nkwusa ise bụ́ ndị Kọd na Jọjia ugbu a, nweekwa ọgbakọ atọ na-eji asụsụ Kọd amụ ihe. N’afọ 2014, e nwere mgbakọ ukwu mbụ n’asụsụ Kọd. Ọ bụ na Tibilisi ka a nọ nwee ya. Obi tọrọ ụmụnna niile ụtọ maka mgbakọ a. Ọtụtụ ndị bịara ya si Aminia, Jamanị, Tọki na Yukren.