Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

IHE NDỊ E MERE N’AFỌ GARA AGA

“Ahụtụbeghị M Ndị Agbata Obi Dị Ka Unu”

“Ahụtụbeghị M Ndị Agbata Obi Dị Ka Unu”

NA Satọdee abalị asaa n’ọnwa Mee afọ 2016 nakwa na Sọnde ya, ụfọdụ ndị na-eje ozi na Betel nọ n’ebe a na-anabata ndị ọbịa n’isi ụlọ ọrụ anyị dị na 25 Kolọmbịa Haịts, Bruklin, Niu Yọk, na-atụ anya ndị ọbịa. Ọ bụ eziokwu na a naghị anabata ndị mmadụ ịbịa legharịa anya na Satọdee na Sọnde, ma n’ụbọchị ahụ, a nabatara ọtụtụ ndị. Tupu ụbọchị a, e kesara akwụkwọ e ji kpọọ ndị bi gburugburu Betel ka ha bịa ebe anyị dowere ọtụtụ nsụgharị Baịbụl ma lee Baịbụl dị iche iche merela ochie.

Akwụkwọ ahụ e kesara mere ka e zie ọtụtụ ndị bi gburugburu Betel ozi ọma. Ọ gbakwara ụmụnna ndị so kesaa ya ume. Ihe kacha gbaa ha ume bụ okwu ọma ndị biterela aka gburugburu Betel kwuru gbasara Ndịàmà Jehova.

Otu nwoke kwuru, sị: “Kemgbe ihe dị ka afọ 1961, ebiela m n’ụlọ dị iche iche ebe a. E nwetụbeghị ndị agbata obi dị ka unu. Ọ dịcha anyị ka unu ghara ịkwapụ.”

Otu nwaanyị kwukwara, sị: “Ma ọ́ bụghị unu, ebe a agaraghị emepe otú a. Obi dị anyị ezigbo ụtọ na anyị na unu bi ebe a oge a niile.”

Obi tọrọ ọtụtụ ndị ọsụ ụzọ so kesaa akwụkwọ ịkpọ òkù ahụ ụtọ n’ihi otú ndị bi gburugburu Betel si nabata ha nke ọma. Otu nwoke ọnụ na-eru n’okwu n’òtù na-ahụ maka ọdịmma ndị agbata obi ebe ahụ kwuru na otú Ndịàmà Jehova si eme ihe na-amasị ya. Ma, ọ sịrị na ọ na-ewute ya na ya agaghị anọ ya n’oge ahụ anyị kpọrọ ndị mmadụ bịa lee nsụgharị Baịbụl dị iche iche.

Ọtụtụ ndị zara òkù a anyị kpọrọ ha. Ná mkpụrụ ụbọchị abụọ ahụ, mmadụ iri anọ na asatọ na-abụghị Ndịàmà Jehova bịara ebe ahụ a na-ele Baịbụl. Ụfọdụ ndị na-eje ozi na Betel nọ na-anabata ndị ọbịa ma soro ha na-akparịta ụka n’ebe a na-anabata ndị ọbịa.

Dị ka ihe atụ, otu nwa agbọghọ dị ihe dị ka afọ iri abụọ na asaa aha ya bụ Sally so ná ndị bịaranụ. Ọ nọrọ ihe dị ka nkeji iri atọ n’ebe ahụ a na-ele Baịbụl. Mgbe ọ batara n’ebe a na-anabata ndị ọbịa, ndị ọsụ ụzọ kpọrọ ya ka ọ bịa nọ ebe ahụ. Ọ gwara ha na ya amaghịkwa na e nwere Baịbụl ndị a ebe a. Ụmụnna ahụ sịrị ya na obi dị ha ụtọ na o nwere mmasị na Baịbụl n’agbanyeghị na ọ gụrụ oké akwụkwọ. Sally gwara ha, sị: “Baịbụl dị ezigbo mkpa. Ọ gwụla Baịbụl ka anyị ga-esi na ya mata ihe Chineke na-ekwu. Ọ na-agwa anyị otú anyị ga-esi na-ebi ndụ.”

Sally sịrị na otú ya si nwee mmasị na Baịbụl mere ka ya gaa mụọ asụsụ Latịn na Grik, nakwa na ọ ga-amasị ya ịsụgharị Baịbụl. Ọ sịrị na e kwesịrị ịsụgharị Baịbụl nke ọma ka ọ ghara ịbụ uche mmadụ ka e dere na ya. Ụmụnna ndị ahụ gwara ya na anyị nwere akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl a sụgharịrị n’ihe karịrị narị asụsụ asatọ na jw.org. O juru ya anya mgbe ọ nụrụ ihe a, obi atọọkwa ya ezigbo ụtọ. Mgbe ụmụnna ndị ahụ gwara ya otú ndị nsụgharị ụfọdụ sirila wepụ aha Jehova na Baịbụl, akpata oyi wụrụ ya, ya ajụọ, sị: “Gịnị mere ha ji wepụ aha Jehova na Baịbụl?” Mgbe Sally chọwara ịla, ọ sịrị ha, “Kemgbe a mụrụ m, ebe a ka anyị bi. Ahụtụbeghị m ndị agbata obi dị ka unu.”

Na Mọnde ya, otu onye ụkọchukwu gakwuuru otu onye na-eje ozi na Betel aha ya bụ John ebe ọ kwụ n’akụkụ ihe a na-akwagharị akwagharị a na-edosa akwụkwọ anyị. Ọ gwara John na obi di ya ezigbo ụtọ mgbe ha bịara lee Baịbụl ndị ahụ, nakwa na obi dị ya ụtọ na anyị na-eme ihe Baịbụl kwuru. Mgbe ha kwutụrụ okwu obere, o kwuru, sị, “Unu akpasuola m iwe.” Ihe a o kwuru gbagwojuru John anya, ya ajụọ ya ihe mere o ji kwuo ya. Ọ gwara John, sị: “Ọ bụ n’ihi na unu chọrọ ịkwapụ ebe a. NỌRỌNỤ EBE A! Zụọnụ nnukwu ụlọ ma ọ bụ rụọnụ ihe ọ bụla unu chọrọ ịrụ, ma unu akwapụla. Unu mere ka ebe a dị mma obibi. Mkwapụ unu na-akwapụ na-ewe m iwe.”

N’eziokwu, òkù ahụ a kpọrọ ndị bi gburugburu Betel ka ha bịa lee Baịbụl ochie ndị anyị nwere na ọbịbịa ha bịara mere ka anyị zie ọtụtụ ndị bi ebe ahụ ozi ọma. O mekwara ka anyị nwee ike ime ka ha mata aha Chineke karịa mgbe ọ bụla ọzọ.