Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Kegịstan

IHE NDỊ E MERE N’AFỌ GARA AGA

Alaka Ụlọ Ọrụ Anyị Ndị E Nyefere Jehova

Alaka Ụlọ Ọrụ Anyị Ndị E Nyefere Jehova

MGBE a na-ewusakwu alaka ụlọ ọrụ anyị dị na Bishkek, bụ́ isi obodo Kegịstan, ụmụnna anyị si mba ọzọ na ụmụnna ndị obodo a rụsiri ọrụ ike ruo otu afọ na ọnwa isii tupu ha arụchaa ya. Otu ọnwa a rụchara alaka ụlọ ọrụ a, e nyefere ya Jehova n’abalị iri abụọ na anọ n’ọnwa Ọktoba afọ 2015. Ụmụnna karịrị puku atọ nọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze iri na asatọ, nakwa n’ebe ise ndị ọzọ gere okwu ndị e ji nyefee Jehova alaka ụlọ ọrụ a. Ha gere ya na tiivi. Ọ tọrọ ha ezigbo ụtọ. Ọ bụ Nwanna Stephen Lett, bụ́ onye so n’Òtù Na-achị Isi kwuru okwu na-agba ume e ji nyefee Jehova alaka ụlọ ọrụ a. Isiokwu ya bụ ‘Jiri Obi Gị Dum Na-ejere Jehova Ozi.’ N’echi ya, e kwuru okwu ọzọ mere ka okwukwe ụmụnna sikwuo ike. Ọtụtụ ụmụnna nọ n’ebe dị iche iche n’obodo a gere ya.

Alaka ụlọ ọrụ anyị dị na Kegịstan

Na Satọdee abalị iri na anọ n’ọnwa Mee afọ 2016, e nyefekwara Jehova alaka ụlọ ọrụ anyị dị n’Aminia. Alaka ụlọ ọrụ a dị n’okpukpu nke mbụ ruo na nke isii nke otu ụlọ elu mara mma dị okpukpu iri na asatọ. N’ụbọchị ahụkwa, e nyefere Jehova otu Ụlọ Mgbakọ na ebe a ga-anọ na-enwe Ụlọ Akwụkwọ Maka Ndị Na-ekwusa Ozi Ọma Alaeze. Ụmụnna dị puku isii, narị anọ na iri atọ na ise bịara gee okwu e ji nyefee Jehova ụlọ ndị ahụ. E kwuru okwu ndị gosiri otú Ndịàmà Jehova si malite n’Aminia. Ndị Aminia mbụ ghọrọ Ndịàmà Jehova bụ ndị si Aminia gaa biri n’Amerịka n’ihe dị ka afọ 1914. A malitekwaranụ ikwusa ozi ọma n’Aminia n’ihe dị ka afọ 1975 mgbe obodo a ka so n’obodo ndị dị na Sọviet Yuniọn. N’oge na-adịchabeghị anya, e debanyere aha Ndịàmà Jehova n’akwụkwọ gọọmenti n’Aminia, e nweekwa alaka ụlọ ọrụ anyị ebe ahụ. Ọtụtụ ụmụnna anyị ndị bịara nnọkọ a atụghị anya na e nwere ike inwe ụdị ihe a n’Aminia. Mgbe Nwanna David Splane, onye so Òtù Na-achị Isi jụrụ ndị bịara nnọkọ ahụ ma hà kwetara ka e nyefee Jehova ọmarịcha ụlọ ndị ahụ, ha niile ji obi ha niile kwuo na ha kwetara. Ihe a bụ ihe kacha dee ude ná nnọkọ a.

Aminia

Foto nke elu: Mgbe a na-enyefe Jehova alaka ụlọ ọrụ anyị dị n’Aminia

Foto nke etiti: Ụmụnna anyị ndị bịara nnọkọ pụrụ iche e nwere ná ngwụcha izu

Foto nke ala ala: Ebe ụmụnna na-agba egwú ndị Aminia ná mgbede ụbọchị ahụ